Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 27 Novemba
Kalenda Ọtọdọks · 14 Novemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 27 Novemba 2027
Satọdee · Izu nke 23 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 5
Mmemme na ndị nsọ
Holy and All-praised Apostle Philip (1st C)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
1Pita, onyeozi Jisọs Kraịst, Na-edegara unu ndị niile ndị a họpụtara, ndị gbara ọsọ ndụ gaa biri na Pọntọs, na Galeshịa, na Kapadosia, Eshịa na Bitinia, akwụkwọ a. 2Unu ndị Chineke bụ Nna họpụtara dị ka o bururị ụzọ mata na ọ ga-eme, jirikwa Mmụọ Nsọ ya doo unu nsọ, ka unu na-erubere Jisọs Kraịst isi, ka ewerekwa ọbara ya sachaa unu: Ka amara na udo baara unu ụba. 3Otuto dịrị Chineke Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst! Site nʼịba ụba nke ebere ya, o nyela anyị ndụ ọhụrụ baa nʼolileanya dị ndụ site na mbilite nʼọnwụ Jisọs Kraịst. 4Anyị nwekwara ihe nketa nke na-apụghị imebi emebi, nke na-agaghị ere ure, maọbụ gbanwee ụdịdị ya, nke e debeere anyị nʼeluigwe. 5Anyị bụ ndị e sitere nʼokwukwe na-echekwa nʼike Chineke, tutu ruo ọbịbịa nzọpụta ahụ, nke a na-ejikere ime ka ọ pụta ìhè nʼọgwụgwụ oge. 6Nʼime ihe ndị a ka unu na-aṅụrị oke ọṅụ, ọ bụ ezie na nʼoge ndị a dị nta, unu agabigala ọtụtụ ihe mgbu nʼihi ụdị ọnwụnwa dị iche iche bịakwasịrị unu. 7Ọnwụnwa ndị a na-abịa ime ka okwukwe unu, nke dị oke ọnụahịa karịa ọlaedo na-ala nʼiyi nʼagbanyeghị na e ji ọkụ nụchaa ya; bụrụ nke ga-eweta otuto, na ebube, na nsọpụrụ, mgbe e mere ka Jisọs Kraịst pụta ìhè. 8Ọ bụ ezie na unu ejibeghị anya unu hụ ya mgbe ọbụla, ma unu hụrụ ya nʼanya, ọ bụkwa ezie na unu adịghị ahụ ya anya ugbu a, ma unu kwere na ya. Unu jupụtakwara nʼọṅụ ahụ dị ebube nke ọnụ na-apụghị ịkọwa. 9Ụgwọ ọrụ ọzọ unu ga-enweta nʼihi okwukwe unu nʼime ya ga-abụ nzọpụta a ga-azọpụta mkpụrụobi unu. 10Banyere nzọpụta a, ndị amụma ahụ kwuru ihe banyere amara ahụ gaje ịbịara unu jiri nnọọ nwayọọ nyochasịa 11ma gbalịsie ike ịchọpụta oge na ọnọdụ ahụ bụ nke Mmụọ Kraịst dị nʼime ha kwuru banyere ya, mgbe ọ gbara ama maka ahụhụ Kraịst na ebube nke ga-eso ya. 12E mere ka ha mata na ọrụ ha na-arụ abụghị maka ọdịmma nke ha onwe ha, kama ọ bụ nʼihi ọdịmma nke unu, mgbe ha kwuru okwu banyere ihe ndị a ahụ bụ ndị a gwarala unu ugbu a site nʼọnụ ndị ziri unu oziọma nʼike Mmụọ Nsọ nke e si nʼeluigwe zite. Ọ bụladị ndị mmụọ ozi ka ọ gụrụ agụụ ịmata ihe ndị a. 13Nʼihi ya, werenụ uche unu niile jikere ịrụ ọrụ, anya dokwaa unu. Nweenụ olileanya zuruoke nʼamara nke a ga-ewetara unu mgbe a ga-ekpughe Jisọs Kraịst. 14Dị ka ụmụ na-erube isi, unu ekwela ka ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ unu agụụ mgbe unu nọ nʼọchịchịrị, na-achị ndụ unu. 15Kama bụrụnụ ndị dị nsọ nʼihe niile unu na-eme, dịka onye kpọrọ unu si dị nsọ. 16Nʼihi na e dere ya ede, “Dịnụ nsọ, nʼihi na adị m nsọ.” 17Ebe unu na-akpọku Nna ahụ na-ekpe onye ọbụla ikpe dị ka ọrụ ya sịrị dị na-eleghị mmadụ anya nʼihu, bienụ ndụ unu nʼịtụ egwu Chineke, dịka ndị mbịarambịa nʼụwa a. 18Nʼihi na unu matara na-ejighị ihe pụrụ imebi emebi, dịka ọlaọcha na ọlaedo gbapụta unu site nʼibi ndụ ọjọọ ahụ nna nna unu ha nyefere unu nʼaka 19kama ọ bụ ọbara dị oke ọnụahịa nke Kraịst bụ nwa atụrụ na-enweghị ntụpọ ọbụla maọbụ ọrụsị. 20A họpụtara ya tupu e kee ụwa. Kama, ọ bụ nʼọgwụgwụ oge ndị a ka e mere ka ọ pụta ìhè nʼihi unu. 21Ọ bụkwa site nʼaka ya ka unu ji bụrụ ndị kwere na Chineke, onye mere ka o si nʼọnwụ bilie, na onye nyekwara ya ebube. Ya mere, okwukwe unu na olileanya unu dị na Chineke. 22Ugbu a, ebe unu sitere nʼirubere eziokwu ahụ isi mee ka obi unu dị ọcha, nke mere na unu nwere ịhụnanya nke ihu abụọ nʼadịghị nʼebe ụmụnna unu nọ, sitenụ nʼobi unu na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya nʼebe ọ dị ukwuu. 23Nʼihi na amụọla unu ọzọ ugbu a, ọ bụghị site na mkpụrụ nke na-emebi emebi, kama site na nke na-apụghị imebi emebi, site nʼokwu Chineke nke dị ndụ ma na-adịgidekwa. 24Nʼihi na, “Mmadụ niile dị ka ahịhịa, ma ebube ha niile dị ka okoko osisi nke ọhịa, ahịhịa na-akpọnwụ, okoko osisi na-achanwụ, 25ma okwu Onyenwe anyị na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” Okwu ahụ bụkwa oziọma ahụ e zisaara unu. 2:1Ya mere, wezuganụ nʼibu iro nʼobi na aghụghọ niile unu, kwụsịnụ ịgha ụgha, ịbụ ndị ihu abụọ, ndị na-ekwo ekworo, na ndị na-ekwutọ mmadụ ibe ha. 2Dịka ụmụ a mụrụ ọhụrụ, bụrụnụ ndị agụụ ịṅụ mmiri ara nke Mmụọ Nsọ a na-agwaghị ihe ọbụla na-agụ, ka unu nwee ike site na ya na-eto eto nʼime nzọpụta unu. 3Ugbu a, unu detụrụla ya ire matakwa na Onyenwe anyị dị mma. 4Bịakwutenụ ya, Nkume ahụ dị ndụ, onye ụmụ mmadụ jụrụ, maọbụ onye Chineke họpụtara, onye dị oke ọnụahịa nye ya. 5Unu onwe unu kwa dị ka nkume dị ndụ ka a na-ewu ime ka unu ghọọ ụlọ ime mmụọ, ka unu bụrụkwa ndị nchụaja dị nsọ, ndị na-achụ aja ime mmụọ nke Chineke na-anabata site na Jisọs Kraịst. 6Nʼihi nʼakwụkwọ nsọ kwuru, “Lee, ana m atọgbọ na Zayọn otu nkume, nke a họpụtara, bụkwa nkume isi ntọala dị oke ọnụahịa. Onye ọbụla kweere na ya, agaghị eme ka ihere mee ya.”
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
21Ọ bụ nʼihi ihe dị otu a, ka e jiri kpọọ unu, nʼihi na Kraịst hụrụ ahụhụ nʼihi unu. Ọ bụkwa ihe ịmaatụ nye unu. Na-esonụ nzọ ụkwụ ya. 22“O nweghị mgbe ọbụla o mehiere, o nwekwaghị mgbe onye ọbụla nụrụ okwu aghụghọ nʼọnụ ya.” 23O kwutọghị onye ọbụla mgbe ha na-ekwutọ ya. Ọ baghị mba ọbụla mgbe ha na-ata ya ahụhụ, kama o were ya nyefee nʼaka onye ahụ na-ekpe ikpe ziri ezi. 24Nʼelu obe ahụ, o buuru mmehie anyị niile bokwasị onwe ya mgbe ọ nwụrụ, ime ka anyị nwee ike ịbụ ndị nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị; ma dịrị ndụ nʼebe ezi omume dị. Ọ bụkwa site nʼapa ọnya dị ya nʼahụ ka o ji gwọọ unu. 25Na mbụ, unu dị ka ụmụ atụrụ na-awagharị na-achọ ụzọ, ma ugbu a, e meela ka unu laghachikwute Onye ahụ na-azụ unu dị ka atụrụ, na Onye na-elekọtakwa mkpụrụobi unu anya. 3:1Unu ndị bụ nwunye na-eruberenụ di unu isi, ka ụfọdụ nʼime ha na-ekweghị nʼokwu Chineke, nwee ike isi nʼezi ndụ unu na-ebi chegharịa nʼekwughị okwu ọbụla, 2mgbe ha na-ahụ ibi ndụ unu nke dị ọcha na nke inwe nsọpụrụ. 3Ịchọ mma unu agaghị abụ ịchọ mma nke anụ ahụ, nke bụ ịkpa isi, na iyikwasị ihe ọlaedo, maọbụ iyikwasị uwe mara mma. 4Kama, ka ịchọ mma unu bụrụ mmadụ nke ime mmụọ, nke mma ya na-adịghị aṅacha, nke bụ mmụọ ịdị nwayọọ na ịdị juu. Nke dị oke ọnụahịa nʼihu Chineke. 5Nke a bụ ụzọ ndị inyom mgbe ochie, bụ ndị dị nsọ, ndị olileanya ha dị nʼime Chineke siri chọọ onwe ha mma. Ha debekwara onwe ha nʼokpuru di nke aka ha. 6Dịka Sera rubeere Ebraham isi, na-akpọkwa ya onyenwe m. Unu bụ ụmụ Sera ma ọ bụrụ na unu e mee ihe ziri ezi, na-ekweghị ka egwu tụọ unu. 7Nʼotu aka ahụ, ndị bụ di na-echenụ echiche dị mma banyere nwunye unu, ma nyenụ ha ugwu ruuru ha dịka ndị na-adịghị ike na dịka ndị unu na ha ga-eso keta onyinye amara nke ndụ ahụ. Nke a ga-eme ka ihe ọbụla hapụ igbochi ekpere unu. 8Nʼikpeazụ, nweenụ otu mmụọ, ka ihe na-ewute ibe unu na-ewute unu, na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya, nwekwanụ obi ọmịiko na obi dị umeala. 9Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi ụgwọ ihe ọjọọ e mere unu, maọbụ nkwutọ nʼọnọdụ nkwutọ. Kama gọzienụ ha, nʼihi na ọ bụ ngọzị ka e kwere unu na nkwa iketa, mgbe a kpọrọ unu.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
1Ya mere, ebe ọ bụ na Kraịst hụrụ ahụhụ nʼanụ ahụ, unu onwe unu kwesiri inwe ụdị obi ahụ o nwere. Nʼihi na onye tara ahụhụ nʼanụ ahụ akwụsịla ime mmehie. 2Nʼihi nke a, onye dị otu ahụ anaghị ebi ndụ fọdụrụ ya nʼụwa nʼihi agụụ ọjọọ nke ọchịchọ mmadụ, kama ọ na-ebi ya nʼihi imezu ọchịchọ Chineke. 3Nʼoge gara aga unu tufuru ọtụtụ oge ime ihe ndị ahụ na-atọ ndị mba ọzọ ụtọ. Ndụ unu jupụtara nʼagụụ ịkwa iko, na agụụ ime ihe ọjọọ, na ịṅụbiga mmanya oke, na ịkpọ oriri, na ikpere arụsị niile, bụ ihe jọgburu onwe ya na njọ. 4Ma ndụ unu na-ebi ugbu a na-eju ha anya ebe ọ bụ na unu anaghị esokwa ha ebi ndụ ọjọọ ndị ahụ ọzọ, nʼihi nke a ha na-ekwutọkwa unu. 5Ma ha ga-eji ọnụ ha kwupụta ihe ha mere nʼihu onye ahụ ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe. 6Ọ bụ nke a mere e ji kwusaa oziọma ọ bụladị nye ndị ahụ nwụrụ anwụ bụ ndị e kperela ikpe mgbe ha dị ndụ, dịka e si ekpe mmadụ niile ikpe, ka ha site na nke a bie ndụ dị ka Chineke si chọọ site na mmụọ ahụ. 7Ọgwụgwụ ihe niile adịla nso. Bụrụnụ ndị nwere akọnuche zuruoke, ndị anya doro, ka unu nwee ike na-ekpekwa ekpere. 8Nke kachasị nke, na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya nke ukwuu nʼihi na ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie. 9Jirinụ obiọma na-elerịta ibe unu ọbịa na-enweghị ntamu ọbụla. 10Onye ọbụla nʼime unu dịka ndị ozi natara onyinye amara nke Chineke, jirinụ onyinye ọbụla unu natara na-ejeritara onwe unu ozi. 11Onye na-ekwu okwu ya kwuo ya dị ka ọ bụ nnọọ okwu Chineke ka ọ na-ekwu. Onye na-eje ozi ya jee ya site nʼike ahụ Chineke na-enye. Nʼime ihe niile ka otuto dịrị Chineke site na Jisọs Kraịst. Ọ bụ ya ka otuto niile na ike niile dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
Ofufe ụtụtụ: Oziọma
15Mgbe ha risiri nri ụtụtụ, Jisọs sịrị Saimọn Pita, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya karịa ndị a niile?” Ọ sịrị ya, “E, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị nʼanya.” Jisọs sịrị ya, “Na-azụ ụmụ atụrụ m.” 16Jisọs sịrị ya nke ugboro abụọ, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya?” Ọ sịrị, “E, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị nʼanya.” Ọ sịrị ya, “Na-elekọta atụrụ m.” 17Ọ sịrị ya nke ugboro atọ, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya?” O wutere Pita na ọ sịrị ya nke ugboro atọ, “ị hụrụ m nʼanya?” Ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị mazuru ihe niile, ị makwaara na m hụrụ gị nʼanya.” Jisọs sịrị ya, “Na-azụ atụrụ m. 18Nʼezie, nʼezie asị m gị, mgbe ị bụ okorobịa ị na-eke ajị nʼukwu, gaa ebe ị chọrọ ịga. Ma mgbe ị ghọrọ agadi, ị ga-esetipụ aka gị, onye ọzọ ga-ekee gị ihe okike nʼukwu ma duru gị gaa ebe ị na-achọghị ịga.” 19O kwuru nke a iji gosi ụdị ọnwụ ọ ga-anwụ iji nye Chineke otuto. Mgbe nke a mesịrị, ọ sịrị ya, “Soro m.” 20Pita chigharịrị hụ onye ahụ na-eso ụzọ ya nke Jisọs hụrụ nʼanya ka ọ na-esokwa ha nʼazụ. (Ọ bụ onyeozi ahụ dabeere ya nʼobi na nri anyasị, nke sịrị, “Onyenwe anyị, onye ga-arara gị nye?”) 21Mgbe Pita hụrụ ya, ọ sịrị Jisọs, “Onyenwe anyị kedụ maka onye a?” 22Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na m achọọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-alọghachi gịnị ka nke a bụ nye gị? Soro m.” 23Ya mere, akụkọ a gbasara nʼetiti ụmụnna na onye a na-eso ụzọ ya agaghị anwụ. Ma Jisọs asịghị ya na ọ gaghị anwụ anwụ, kama, “Ọ bụrụ na m chọrọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-abịa, ọ gbasara gị?” 24Nke a bụ onye ahụ na-eso ụzọ ya onye na-agba ama ihe ndị a niile, ma deekwa ha nʼakwụkwọ. Anyị makwaara na ama ya bụ eziokwu. 25Ma ọ dị ọtụtụ ihe ndị ọzọ Jisọs mere. Ọ bụrụ na e dee ha niile nʼakwụkwọ, ọ dịghị m ka ụwa niile ọ ga-aba akwụkwọ a ga-ede banyere ha.
Akwụkwọ ozi
1Anyị chọrọ ime ka unu mara, ụmụnna m, ihe banyere ihe nke amara Chineke rụrụ na nzukọ niile dị na Masidonia. 2Nʼime ọnọdụ oke mkpagbu na ihe mwute, ha nwere ọṅụ dị nnọọ ukwuu ruo na ha gbasara aka ha nye ndị ọzọ ihe, wezugakwa na ọ bụ ezie na ha bụ ndị ogbenye ọnụ ntụ. 3Ana m agba ama na ha nyere dịka ike ha, ha nyekwara ọ bụladị karịa otu a tụrụ anya. Onyinye ha si nʼobi ha pụta. 4Nʼezie, ha rịọsiri anyị arịrịọ ike ka anyị nara onyinye amara ha nyere nʼihi iso keta oke inyere ndị nsọ ndị ọzọ nọ na mkpa aka. 5Nke ka nke, ha nyere karịa ihe anyị lere anya na ha ga-enye. Nʼihi na ha buru ụzọ were onwe ha nye Onyenwe anyị. Ha sitekwara nʼọchịchọ Chineke nyekwa anyị onwe ha.
Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Filip)
9Ọ na-adị m nnọọ ka Chineke o weere anyị bụ ndị ozi mee anyị ndị dịkarịsịrị ala, ndị a na-echeta naanị mgbe ihe niile na-agwụsị agwụsị, dịka ndị a mara ikpe ọnwụ. Nʼihi na-akpọpụtara anyị nʼihu ọha mmadụ mee anyị ihe nlere anya nye ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi. 10Anyị aghọọla ndị nzuzu nʼihi Kraịst, ma unu onwe unu bụ ndị maara ihe nʼime Kraịst. Anyị bụ ndị na-adịghị ike ma unu dị ike. Anyị bụ ndị a jụrụ ajụ na ndị a na-eleda anya, ma unu bụ ndị a na-asọpụrụ. 11Tutu ruo ugbu a, anyị na-ebu ọnụ nọrọkwa nʼakpịrị ịkpọ nkụ. Anyị enweghị ezigbo uwe anyị ji achụ oyi. Ndị mmadụ na-emeso anyị mmeso ọjọọ, ma anyị enweghị ebe obibi nke aka anyị. 12Aka anyị ka anyị ji arụpụtara onwe anyị ihe anyị na-eri. Mgbe ndị mmadụ na-abụ anyị ọnụ, anyị na-agọzi ha. Mgbe ha na-ata anyị ahụhụ, anyị nọ na-enwe ndidi. 13Anyị na-eji okwu dị nro na-azaghachi ndị na-ekwujọ anyị. Tutu ruo ugbu a, a na-emeso anyị mmeso dịka anyị bụ unyi ndị ụwa na-azachapụ, dịka ihe a jụrụ ajụ nʼanya ndị ụwa. 14Anaghị m edere unu ihe ndị a ka ihere mee unu, kama ana m ede ya ịdụ unu ọdụ, na ịdọ unu aka na ntị, dịka ụmụ m hụrụ nʼanya. 15Ọ bụ ezie na unu nwere ọtụtụ ndị nche, ma unu enweghị karịa otu nna. Nʼihi na ọ bụ m bụ nna unu nʼime Kraịst Jisọs, site nʼoziọma ahụ m wetaara unu. 16Ya mere, ana arịọ m unu, ka unu na-eṅomi ndụ m.
Oziọma
37Nʼechi ya, mgbe ha si nʼugwu ahụ rịdata, oke igwe mmadụ bịara zute ya. 38Otu nwoke si nʼetiti igwe mmadụ ahụ jiri oke olu tie mkpu sị, “Onye ozizi, arịọ m gị ka i lee nwa m nwoke anya, nʼihi na naanị ya bụ nwa m nwere. 39Mmụọ ọjọọ na-ejide ya mee ka ọ na-eti mkpu. Ọ na-atụda ya nʼala, na-ese ya ese, na-adọkwa ya adọ mee ka ọ na-agbọ ụfụfụ nʼọnụ. Ọ dịghị mgbe ọ na-ahapụ ya kama ọ na-echihịasị ya ahụ. 40Arịọrọ m ndị na-eso ụzọ gị ka ha chụpụ ya, ma ha enweghị ike.” 41Jisọs zara sị, “Leenụ ọgbọ rụrụ arụ, nke na-enweghị okwukwe! Ruo olee mgbe ka mụ na unu ga-anọ, ruokwa olee mgbe ka m ga-anagide ekweghị ekwe unu? Kpọtara m nwa gị nwoke ahụ nʼebe a!” 42Mgbe ọ na-abịa, mmụọ ọjọọ ahụ kwadara ya nʼala sesie ya ike, ma Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba. Ọ gwọrọ nwata ahụ kpọnyekwa ya nna ya. 43Ebube ukwu nke Chineke tụrụ ha nʼanya. Ma mgbe onye ọbụla nọ na mgbagwoju anya nʼihi ọrụ ọ rụrụ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya,
Oziọma (maka Onye nsọ Filip)
43Nʼechi ya, o kpebiri ịga Galili. Mgbe ọ hụrụ Filip, ọ sịrị ya, “Soro m.” 44Filip bụ onye obodo Betsaida dị ka Andru na Pita. 45Filip chọtara Nataniel sị ya, “Anyị achọtala onye ahụ Mosis dere banyere ya nʼiwu, onye ndị amụma dekwara banyere ya, Jisọs onye Nazaret, nwa Josef.” 46Nataniel sịrị ya, “Ihe ọma ọbụla ọ pụrụ i si na Nazaret pụta?” Ma Filip sịrị ya, “Bịa ka ị hụrụ.” 47Mgbe Jisọs hụrụ ka Nataniel na-abịaru ya nso, o kwuru sị, “Leenụ ezi nwa afọ Izrel onye aghụghọ na-adịghị nʼime ya.” 48Nataniel sịrị ya, “Olee otu i si mata onye m bụ?” Jisọs sịrị ya, “Tupu Filip akpọ gị, ahụlarị m gị ka ị nọ nʼokpuru osisi fiig.” 49Mgbe ahụ, Nataniel zaghachiri, “Onye ozizi, ị bụ Ọkpara Chineke; ị bụ eze Izrel.” 50Jisọs zara sị ya, “I kwere nʼihi na agwara m gị na ahụrụ m gị nʼokpuru osisi fiig? Ị ga-ahụ ihe dị ukwuu karịa nke a.” 51Ọ sịkwara ya, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, unu ga-ahụ eluigwe ka o meghere hụkwa ndị mmụọ ozi Chineke ka ha na-arịgokwuru, ma na-arịdakwuru Nwa nke Mmadụ.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 14 Novemba na kalenda nzukọ bụ 27 Novemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike