Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 20 Novemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 20 Novemba 2027

Satọdee · Izu nke 33 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Satọdee nke izu nke 33 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ncheta Satọdee nke Nwaagbọghọ Meri Agọziri Agọzi · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọ dịghị na nsụgharị a

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 9:1–3, 5, 15, 18

1Abụ Ọma. Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro olu abụ “Ọnwụ nke Ọkpara.” Abụ ọma Devid. O Onyenwe anyị, aga m esite nʼala ala obi m too gị, aga m agwakwa onye ọbụla ihe ọma niile ị na-eme. 2Obi ga-atọ m ụtọ; obi m ga-ejupụta nʼọṅụ nʼihi gị, aga m abụrụ gị abụ otuto, gị Onye kachasị ihe niile elu. 3Ndị iro m na-alaghachi azụ, ha na-asọ ngọngọ na-alakwa nʼiyi nʼihu gị. 5I baarala mba niile mba ma laa ndị ajọ omume nʼiyi, hichapụkwa aha ha ruo mgbe ebighị ebi. 15Ndị mba niile adabala nʼime olulu ahụ ha gwuru; ọnya ahụ ha siri, zoo, amaala ha. 18Ma ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka a ga-echefu ndị nọ na mkpa; olileanya ndị a na-akpagbu agaghị abụkwa nke efu.

Oziọma

Luk 20:27–40

27Ụfọdụ ndị Sadusii, ndị sị na mbilite nʼọnwụ adịghị, bịakwutere ya 28ma jụọ ya sị, “Onye ozizi, Mosis deere anyị na ọ bụrụ na nwanne nwoke mmadụ anwụọ hapụ nwunye ya na-amụtaghị nwa, na nwoke dị otu a ga-alụrụ nwunye nwanne ya nwoke ahụ, sị otu a, mụtara nwanne ya ụmụ. 29Ugbu a, e nwere ụmụnne nwoke asaa, onye nke mbụ lụrụ nwanyị, nwụọ na-amụtaghị nwa. 30Nke abụọ kwa 31na onye nke atọ lụrụkwara ya. Nʼotu aka ahụ ha asaa lụchara ya ma nwụọ na-amụtaghị nwa. 32Nʼikpeazụ nwanyị ahụ nʼonwe ya nwụkwara. 33Ya mere, nʼoge mbilite nʼọnwụ nwunye onye ka ọ ga-abụ? Nʼihi na ha asaa lụchara ya?” 34Jisọs gwara ha, “Ndị nke ọgbọ a na-alụ nwunye, ma na-enyekwa ụmụ ha ka a lụrụ ha. 35Ma ndị ahụ a gụrụ dị ka ndị kwesiri isoro keta oke nʼọgbọ ahụ, nakwa na mbilite nʼọnwụ agaghị alụ di na nwunye. 36Nʼezie, ha apụghịkwa ịnwụ ọzọ, nʼihi na ha dị ka ndị mmụọ ozi. Ha bụ ụmụ Chineke, nʼihi na ha bụ ụmụ nke mbilite nʼọnwụ. 37Ọ bụladị Mosis nʼonwe ya zipụtara na mbilite nʼọnwụ dị, nʼakụkọ banyere ọhịa ahụ na-ere ọkụ, mgbe ọ na-akpọ Onyenwe anyị ‘Chineke nke Ebraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb.’ 38Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama ọ bụ nke ndị dị ndụ, nʼihi nʼebe ọ nọ mmadụ niile dị ndụ.” 39Ụfọdụ ndị ozizi iwu zara ya sị, “Onye ozizi, ị kwuru nke ọma.” 40O nwekwaghị onye ọbụla jụrụ ya ajụjụ ọzọ.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike