Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 19 Novemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 19 Novemba 2027
Fraịdee · Izu nke 33 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Fraịdee nke izu nke 33 nke Oge Nkịtị
Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Obubu ọnụ na nchegharị
Ụbọchị nchegharị
Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Abụ Ọma nzaghachi
10Nʼihu ọha Izrel niile, Devid kelere Onyenwe anyị ekele sị, “Otuto dịrị gị Onyenwe anyị Chineke nna anyị Izrel site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. 11Gị onwe gị, Onyenwe anyị nwe ịdị ukwu, na ike, na ịma mma, na ugwu eze, na ebube, nʼihi na ihe niile nʼeluigwe na nʼụwa bụ nke gị. Gị onwe gị, Onyenwe anyị nwe alaeze. Gị kwa ka e buliri elu dịka onye na-achị isi nʼelu ihe niile. 12Akụnụba na nsọpụrụ na-esite nʼebe ị nọ abịa. Gị onwe gị na-achịkwa ihe niile. Ọ bụkwa nʼaka gị ka ume na ike dị ibuli ihe niile elu, na inye ihe niile ike.
Oziọma
45Mgbe ahụ, ọ banyere nʼime ụlọnsọ ukwu bido ịchụpụ ndị nọ ebe ahụ na-ere ahịa. 46Ọ sị ha, “E dere ya nʼakwụkwọ nsọ ‘na a ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere’; ma unu emeela ya ‘ọgba ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike.’ ” 47Ụbọchị niile, ọ na-anọ na-akụzi ihe nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Ma ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu na ndị ndu nʼetiti ndị mmadụ, nọ na-achọ ụzọ ha ga-esi gbuo ya. 48Ma ha achọtaghị ụzọ ọbụla ime ya, nʼihi na mmadụ niile sogidere ya kwenyekwara nʼokwu ya.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike