Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 13 Novemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 13 Novemba 2027

Satọdee · Izu nke 32 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Satọdee nke izu nke 32 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ncheta Satọdee nke Nwaagbọghọ Meri Agọziri Agọzi · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọ dịghị na nsụgharị a

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 105:2–3, 36–37, 42–43

2Bụkuo ya abụ, bụkuo ya abụ otuto; kwupụtanụ ọrụ ihe ịrịbama ya niile. 3Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya; ka obi ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ṅụrịa. 36Mgbe ahụ, o gburu ndị niile e buru ụzọ mụọ nʼala ahụ, mkpụrụ mbụ nke ndị ikom ha. 37Ọ kpọpụtara ụmụ Izrel, ndị chịịrị ọlaọcha na ọlaedo, ọ dịghị otu onye nʼime ebo ya niile nke ahụ na-esighị ike. 42Nʼihi na o chetara nkwa ya dị nsọ, nke o kwere ohu ya Ebraham. 43O ji aṅụrị dupụta ndị ya, jirikwa ọnọdụ iti mkpu ọṅụ dupụta ndị ya ọ họpụtara;

Oziọma

Luk 18:1–8

1Mgbe ahụ ọ tụụrụ ha ilu a iji gosi ha mkpa ọ dị ikpe ekpere na-esepụghị aka, 2ọ sịrị, “O nwere otu ọkaikpe bi nʼotu obodo ma ọ naghị atụ egwu Chineke. Ọ naghị asọpụkwara mmadụ. 3Nʼobodo ahụkwa, e nwere otu nwanyị di ya nwụrụ anwụ nke na-abịakwute ya, na-asị ya, ‘Kpepụta m nʼaka ndị na-emegide m.’ 4“Na mmalite, ọ chọghị, ma nʼikpeazụ, ọ gwara onwe ya sị, ‘Ọ bụ eziokwu na anaghị m atụ egwu Chineke maọbụ sọpụrụ mmadụ. 5Ma nʼihi na nwanyị a di ya nwụrụ anwụ nọgidere na-enye m nsogbu, aga m ahụ na o nwetara ikpe ziri ezi, ka ọ kwụsị inye m nsogbu site na ọbịbịa ọ na-abịa.’ ” 6Ya mere Onyenwe anyị sịrị, “Gerenụ ihe ọkaikpe nke na-eme ajọ omume na-ekwu. 7Ọ bụ na Chineke agaghị ekpepụta ndị ahụ ọ họpụtara, bụ ndị na-akpọku ya ehihie na abalị? Ọ ga-anọ tee anya nʼinyere ha aka? 8Asị m unu, ọ ga-eme ngwangwa hụ na ha nwetara ikpe ziri ezi. Ma otu ọ dị, mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa, ọ ga-ahụkwa ndị nwere okwukwe nʼime ụwa?”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike