Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 11 Novemba
Kalenda Ọtọdọks · 29 Ọktoba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 11 Novemba 2027
Tọọzdee · Izu nke 21 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 3
Mmemme na ndị nsọ
Martyr Anastasia the Roman (3rd C)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
24Ugbu a, ana m aṅụrị ọṅụ nʼihi ahụhụ ndị a nke m na-ahụ nʼihi unu, ana m emezu ihe fọdụrụ nʼahụhụ ahụ Kraịst tara nʼihi anụ ahụ ya bụ chọọchị. 25Emeela ka m bụrụ onyeozi chọọchị ya site nʼikike Chineke nyere m, ikwusara unu okwu Chineke nʼozuzu oke ya. 26Nke bụ ihe omimi ahụ, nke e zoro ezo site nʼoge ahụ nakwa ọgbọ niile ndị a gara aga, ma ugbu a e mekwara ka ọ pụta ìhè nye ndị nsọ Chineke. 27Ọ bụ ha ka Chineke họpụtara ime ka amata akụ nke ebube nke ihe omimi a nʼetiti ndị mba ọzọ, nke bụ Kraịst nʼime unu, onye bụ olileanya nke ebube ahụ. 28Ọ bụ ya ka anyị na-ekwusa, na-adụ onye ọbụla ọdụ, na-akụzikwara onye ọbụla ihe site nʼamamihe niile. Nʼihi na anyị chọrọ iche mmadụ niile ọbụla nʼihu ya dị ka ndị zuruoke nʼime Kraịst. 29Nʼihi nke a ka m na-adọgbu onwe m nʼọrụ, dị ka ike ya dị ukwuu nke na-arụ ọrụ si dị m nʼime.
Oziọma
14Otu mgbe, ọ na-achụpụ mmụọ ọjọọ nke dara ogbi, mgbe mmụọ ọjọọ ahụ pụrụ, onye ogbi ahụ kwuru okwu. Nke a juru igwe mmadụ ahụ anya. 15Ma ụfọdụ nʼime ha sịrị, “Ọ bụ site nʼike Belzebub eze ndị mmụọ ọjọọ ka o ji achụpụ mmụọ ọjọọ.” 16Ndị ọzọ, iji nwalee ya, sị ya gosi ha ihe ịrịbama nke si nʼeluigwe. 17Ma ebe ọ bụ na ọ maara ihe ha na-eche, ọ sịrị ha, “Alaeze ọbụla kewaranụ megide ibe ya, ga-atọgbọrọ nʼefu, ezinaụlọ ọbụla nke kewakwara megide ibe ya ga-adakpọ. 18Ọ bụrụ na ekwensu ekewa megide onwe ya, alaeze ya ọ ga-esi aṅaa guzosie ike? Unu na-asị na m na-achụpụ mmụọ ọjọọ site nʼike Belzebub. 19Ugbu a, ọ bụrụ na m sitere nʼike Belzebub na-achụpụ mmụọ ọjọọ, ọ bụ site nʼike onye ka ụmụ unu ji na-achụpụ ha? Ya mere, ha ga-abụ ndị ikpe unu. 20Ma ọ bụrụ na m ji ike mkpịsịaka Chineke na-achụpụ mmụọ ọjọọ, mgbe ahụ alaeze Chineke abịarutela nʼebe unu nọ. 21“Mgbe nwoke siri ike ji ngwa agha chekwa obi ya, ihe o nwere ga-adịgidere ya nʼudo. 22Ma ọ bụrụ na onye ọzọ ka ya ike alụso ya ọgụ merie ya, ọ ga-anara ya ngwa agha niile bụ ihe ntụkwasị obi ya, kesakwaa ihe ọ kwatara nʼụlọ dike ahụ. 23“Onye ọbụla na-adịnyeghịrị m na-emegide m. Onye ọ bụlakwa na-adịghị eso m ekpokọta, na-ekposa ekposa.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 29 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 11 Novemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike