Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 9 Novemba

Kalenda Ọtọdọks · 27 Ọktoba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 9 Novemba 2027

Tiuzdee · Izu nke 21 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 3

Mmemme na ndị nsọ

Martyr Nestor of Thessalonica († c. 306)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Kọl 1:1–2, 7–11

1Pọl, onye e mere onyeozi Kraịst Jisọs, site nʼọchịchọ Chineke, ya na nwanna anyị Timoti, 2Na-edegara ndị Kraịst nọ na Kọlọsị, bụ ụmụnna ndị dị nsọ na ndị kwesiri ntụkwasị obi. Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị dịrị unu. 7Dị ka unu siri mụta nʼaka Epafras, onye anyị hụrụ nʼanya na onye anyị na ya na-ejekọ ozi. Ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi nʼijere Kraịst ozi nʼaha unu. 8O meela ka anyị mara ụdị ịhụnanya unu nwere nʼime Mmụọ. 9Nʼihi nke a, site nʼụbọchị anyị nụrụ ihe banyere ya, anyị esepụghị aka ikpere unu ekpere. Anyị na-arịọ ka unu jupụta nʼamamihe nke uche ya, nʼime nghọta ma amamihe nke mmụọ niile. 10Ka unu si otu a bie ndụ dị ka Onyenwe anyị chọrọ. Ka unu bụrụkwa ndị na-eme ihe ọma mgbe niile, ndị na-eme ihe na-atọ ya ụtọ nʼụzọ ọbụla, na ndị na-eto eto nʼihe banyere ịma Chineke mgbe niile. 11Ebe a na-eme ka unu dị ike nʼime ike niile, dị ka ike nke ebube ya si dị. Ka unu nwee ndidi na ogologo ntachiobi,

Oziọma

Luk 11:1–10

1Ọ nọ nʼotu ebe na-ekpe ekpere, mgbe o kpesịrị ekpere, otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onyenwe anyị, kuziere anyị ikpe ekpere, dị ka Jọn kuziri ndị na-eso ụzọ ya.” 2Ọ sịrị ha, “Mgbe unu na-ekpe ekpere, sịnụ: “ ‘Nna, ka e doo aha gị nsọ ka alaeze gị bịa. 3Nye anyị taa nri nke ụbọchị anyị. 4Gbaghara anyị mmehie anyị, nʼihi na anyị na-agbaghara onye ọbụla mehiere megide anyị. Ekwela ka anyị daba nʼime ọnwụnwa.’ ” 5Ọ sịrị ha, “Onye nʼime unu nwere enyi, ga-agakwuru ya nʼetiti abalị sị ya, ‘Enyi m, biko gbazinye m ogbe achịcha atọ, 6nʼihi na otu enyi m bịara nʼụlọ m, ma enweghị m nri ọbụla nʼụlọ m nke m ga-enye ya.’ 7Ma ọ ga-esi nʼime ụlọ zaghachi sị, ‘Enyela m nsogbu, emechiela m ụzọ, mụ na ụmụ m alakpuola, enweghị m ike ibili ugbu a inye gị ihe ọbụla.’ 8Agwa m unu, ọ bụ ezie na ọ gaghị ebili nye ya ihe ọbụla nʼihi na ọ bụ enyi ya, kama nʼihi nsogbu ya, ọ ga-ebili nye ya ihe ọbụla dị ya mkpa. 9“Ya mere, agwa m unu, rịọọnụ, unu ga-arịọta, chọọnụ, unu ga-achọta, kụọkwanụ aka, a ga-emeghekwara unu ụzọ. 10Nʼihi na onye na-arịọ na-arịọta, onye na-achọ na-achọta, onye na-akụ aka nʼụzọ ka a ga-emeghekwara ụzọ.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 27 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 9 Novemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike