Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 8 Novemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 8 Novemba 2027
Mọnde · Izu nke 32 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Mọnde nke izu nke 32 nke Oge Nkịtị
Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, ị nyochaala m, ị makwaara m nke ọma 2Ị maara mgbe m na-anọdụ ala na mgbe m na-eguzo ọtọ; site nʼebe dị anya, ị na-aghọta echiche obi m niile. 3Ị na-ahụzu ọpụpụ m na ndina ala m; ị mazukwara ụzọ m niile. 4O Onyenwe anyị, ị maara ihe m gaje ikwu tupu m kwuo ya. 5Ị na-anọ m nʼihu, ma na-esokwa m nʼazụ, ị tụkwasịla m aka gị. 6Ihe ọmụma dị otu a dị oke omimi nye m, ọ dịkwa elu apụghị m iru ya. 7Ebee ka m ga-ezo onwe m si otu a zonarị Mmụọ gị? Ebeekwa ka m pụrụ ịgbaga ka m si nʼihu gị zoo onwe m? 8Ọ bụrụ na m arịgoro nʼeluigwe ị nọ nʼebe ahụ. Ọ bụrụkwa na m arịda zoo onwe m nʼala mmụọ, ị nọkwa nʼebe ahụ. 9Ọ bụrụ na m efepụ nʼisi ụtụtụ dịka nwa nnụnụ, felagaa nʼebe dị nnọọ anya nke oke osimiri, 10ọ bụladị nʼebe ahụ ka aka gị ga na-edu m aka nri gị ga-ejidesi m ike.
Oziọma
1Ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Ihe ndị nke na-eme ka mmadụ jehie aghaghị ịdị, ma ahụhụ ga-adịrị onye ọbụla ọnọdụ ndị a ga-esi nʼaka ya bịa. 2Ọ ga-akara gị mma ka e kenye gị nkume igwe nri nʼolu, tụnye gị nʼime oke osimiri, karịa na ị ga-eduhie otu nʼime ụmụntakịrị ndị a ụzọ. 3Kpachapụrụnụ onwe unu anya! “Ọ bụrụ na nwanna gị e mejọọ gị, baara ya mba. Ọ bụrụ na o chegharịa, gbaghara ya. 4Ọ bụrụkwa na o mejọọ gị ugboro asaa nʼotu ụbọchị, rịọkwa gị ugboro asaa sị, ‘E chegharịala m,’ ị ghaghị ịgbaghara ya.” 5Ndị ozi ya sịrị ya, “Onyenwe anyị, mee ka okwukwe anyị dị ukwuu!” 6Onyenwe anyị zara, “Ọ bụrụ na unu nwere okwukwe nke ha ka mkpụrụ mọstaadị, unu nwere ike ị sị osisi ukwu a, Ka e site na mgbọrọgwụ hopu gị ma kụọkwa gị nʼime oke osimiri, ọ ga-erubere unu isi.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike