Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 7 Novemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 7 Novemba 2027
Sọnde · Izu nke 32 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 32 nke Oge Nkịtị
Sọnde · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
10Ịlaịja biliri jee Zarefat. Mgbe o ruru ọnụ ụzọ ama e si abanye obodo ahụ, ọ hụrụ otu nwanyị di ya nwụrụ ka ọ nọ na-achịkọta nkụ. Ịlaịja kpọrọ ya oku sị ya, “Biko, kutere m ntakịrị mmiri nʼiko ka m ṅụọ.” 11Mgbe nwanyị ahụ na-aga ikute mmiri ahụ, Ịlaịja kpọrọ ya oku ọzọ sị ya, “Biko, wetara m otu iberibe achịcha ka m taa.” 12Ma nwanyị ahụ zara sị ya, “Dịka Onyenwe anyị Chineke na-adị ndụ, enweghị m achịcha ọbụla nʼụlọ m. Naanị ihe m nwere bụ otu njuaka ụtụ ọka dị nʼite, na mmanụ ntakịrị dị na karama. Ugbu a, ana m achịkọta nkụ ka m baa ga siere onwe m siekwara nwa m nri, ka anyị rie, chere ọnwụ ga-abịa egburu anyị.” 13Ịlaịja sịrị ya, “Atụla egwu! Gaa mee dịka i kwuru. Ma naanị buru ụzọ meere m ogbe achịcha ntakịrị site nʼihe i nwere, wetara m ya. Emesịa, mee nke gị na nwa gị ga-eri. 14Nʼihi na nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Ụtụ ọka dị nʼite ahụ agaghị agwụ, mmanụ ahụ dị nʼite ahụ agakwaghị akọ tutu ruo ụbọchị ahụ Onyenwe anyị ga-ezite mmiri ozuzo nʼala a.’ ” 15Nwanyị ahụ mere dịka Ịlaịja kwuru. Sitekwa nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ihe oriri akọkwaghị Ịlaịja na nwanyị ahụ, na ezinaụlọ ya. 16Nʼihi na ụtụ ọka ahụ agwụghị, mmanụ akọkwaghị nwanyị ahụ, dịka okwu Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ Ịlaịja, onye amụma.
Abụ Ọma nzaghachi
7Ọ na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-akpagbu na-enyekwa ndị agụụ na-agụ nri. Onyenwe anyị na-eme ka ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ nwere onwe ha, 8Onyenwe anyị na-emeghe anya ndị kpuru ìsì, Onyenwe anyị na-akwagide ndị niile dara mba, Onyenwe anyị hụrụ ndị ezi omume niile nʼanya. 9Onyenwe anyị na-echebe ndị ọbịa, na-elekọtakwa ndị na-enweghị nna na ndị di ha nwụrụ anwụ, ma ọ na-eme ka ihe ghara ịgara ndị ajọ omume nke ọma. 10Onyenwe anyị na-achị ruo ebighị ebi, Chineke gị, o Zayọn, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Toonu Onyenwe anyị.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
24Nʼihi na ọ bụghị nʼebe nsọ nke mmadụ jiri aka wuo, nke yiri nke dị nʼeluigwe, ka Kraịst banyere, kama ọ banyere nʼime eluigwe nʼonwe ya, bụ ebe ọ na-anọchite anya anyị ugbu a nʼihu Chineke. 25Ọ banyeghị na ya ka o were onwe ya chụọ aja ọtụtụ ugboro, dị ka onyeisi nchụaja na-eji ọbara na-abụghị nke ya na-abanye nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ kwa afọ. 26Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ gaara abụ onye na-ahụ ahụhụ mgbe kemgbe e kere ụwa. Ma, dị ka o si dị, ọ bịara naanị otu ugboro nʼọgwụgwụ oge ndị a, iwezuga mmehie site nʼiji onwe ya chụọ aja. 27Dị ka ọ bụ ihe a kwadooro mmadụ ọbụla ịnwụ naanị otu ugboro, ma e mesịa ikpe esochie, 28otu a ka e si chụọ Kraịst dị ka aja naanị otu ugboro iwepụ mmehie ọtụtụ mmadụ. Ọ ga-abịaghachi nke ugboro abụọ, ma ọ bụghị nʼihi ibu mmehie, kama ọ bụ nʼihi iweta nzọpụta nye ndị ahụ niile na-eche ọbịbịa ya.
Oziọma
38Dịka ọ na-ezi ihe, ọ siri, “Lezienụ anya nʼebe ndị ozizi iwu nọ. Ndị iyi uwe mwụda na-ejegharị ebe niile na-amasị, na ịnara ekele pụrụ iche bụ nke a na-ekele ha nʼọma ahịa. 39Ndị ọ na-amasịkwa ịnọkwasị nʼoche kachasị elu nʼụlọ ekpere nakwa nʼoche pụrụ iche na mmemme oriri ọbụla. 40Ha na-eripịa ihe niile dị nʼụlọ ndị inyom ndị di ha nwụrụ anwụ, nʼekpe ogologo ekpere ka a hụta ha. Ndị dị otu a ka a ga-ata ahụhụ dị ukwuu.” 41Ọ nọdụrụ ala na ncherita ihu ebe igbe onyinye dị, sị ebe ahụ na-ahụ otu igwe mmadụ ahụ si etinye ego ha nʼime igbe onyinye. Ọtụtụ ndị ọgaranya tụnyere ego buru ibu. 42Otu nwanyị bụ ogbenye, nke di ya nwụrụ anwụ, bịara tinye mkpụrụ ego ọla abụọ nke pụtara otu peni. 43Ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Nʼezie agwa m unu, nwanyị a di ya nwụrụ anwụ, bụkwa ogbenye, etinyela ego nʼime igbe onyinye a karịa ndị ọzọ. 44Nʼihi na ndị ọzọ sitere nʼịba ụba nke ego ha nwere tinye, ma nwanyị a sitere nʼogbenye ya tinye ihe niile o nwere, ọ bụladị ihe niile o ji biri.”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike