Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 6 Novemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 6 Novemba 2027

Satọdee · Izu nke 31 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Satọdee nke izu nke 31 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ncheta Satọdee nke Nwaagbọghọ Meri Agọziri Agọzi · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Rom 16:3–9, 16, 22–27

3Keleerenụ m Prisila na Akwila ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ Kraịst Jisọs. 4Ndị a atụghị egwu ọnwụ nʼihi ndụ m. Ọ bụghị naanị mụ onwe m na ekele ha, kama nzukọ Kraịst ndị dị na mba ọzọ niile na-ekelekwa ha. 5Biko kelekwaaranụ m ndị niile na-ezukọ nʼụlọ ha. Keleerenụ m ezi enyi m Epinetus. Nwoke a bụ onye buru ụzọ nabata Kraịst nʼobi ya, nʼakụkụ Eshịa niile. 6Keleerenụ m Meri, onye rụsịrị ọrụ ike nʼetiti unu. 7Ana m ekelekwa Andronaikọs na Juniya, ndị ikwu m, ndị e tinyekọtara mụ na ha nʼụlọ mkpọrọ. Ndị ozi niile na-asọpụrụ ha. Ha bukwa m ụzọ kwere na Kraịst. 8Kelekwaaranụ m Ampliatọs onye m hụrụ nʼanya nʼime Onyenwe anyị. 9Keleenụ Ọbanọs, onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ Kraịst, na Stakis ezi enyi m. 16Werenụ isurita ọnụ dị nsọ, kelerịta onwe unu. Nzukọ Kraịst niile nọ nʼebe a na-ekelekwa unu. 22Mụ onwe m bụ Tatiọs, onye dere akwụkwọ a, na-ekelekwa unu nʼaha Onyenwe anyị. 23Gaiọs, onye na-ele mụ na nzukọ niile ọbịa nʼebe a, na-ekelekwa unu. Otu a kwa, ndị niile na-ezukọ nʼụlọ ya na-ekelekwa unu. Erastọs, onye na-elekọta ihe ndị obodo a na nwanna anyị nwoke Kwatọs, na-ekelekwa unu. 24Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyeere unu niile. Amen. 25Ana m enyefe unu nʼaka onye ahụ pụrụ ime ka unu guzosie ike site nʼoziọma m kwusaara unu, nakwa nkwupụta nke Jisọs Kraịst, dịka mkpughe nke ihe omimi ahụ e zoro ezo kemgbe ọtụtụ ọgbọ ndị gara aga siri dị. 26Ma ugbu a, e kpugheela ya, mee ka ọ pụta ìhè site nʼihe ndị amụma dere nʼakwụkwọ nsọ, ka ndị mba ọzọ niile maara ya dịka ihe Chineke ebighị ebi nyere nʼiwu ya si dị, ka ha mụta irube isi nke na-esite nʼokwukwe. 27Ka otuto na nsọpụrụ dịrị Chineke, onye naanị ya bụ onye amamihe, ruo mgbe ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst. Amen.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 145:2–5, 10–11

2Ụbọchị niile ka m ga-eto gị jaakwa aha gị mma site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. 3Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto; ịdị ukwuu ya karịrị ihe onye ọbụla pụrụ ịghọta. 4Otu ọgbọ ga-eto ọrụ gị niile nʼihu ọgbọ ọzọ; ha ga-ekwupụta maka ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche. 5Ha ga-ekwupụta ihe banyere ịdị ebube nke ịma mma gị, aga m atụgharịkwa uche nʼọrụ ebube gị niile. 10O Onyenwe anyị, ihe niile i kere eke ga-eto gị; ndị nsọ gị na-aja gị mma. 11Ha ga-ekwupụta banyere ebube nke alaeze gị. Kwupụtakwa maka ịdị ike gị,

Oziọma

Luk 16:9–15

9Agwa m unu, jirinụ akụnụba nke ajọ omume metara onwe unu ndị enyi, ka ọ ga-abụ na mgbe ọ na-adịghịkwa akụ unu nwere, ha ga-anabata unu nʼụlọ obibi ha ebighị ebi. 10“Onye ọbụla kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị, ga-ekwesikwa ntụkwasị obi nʼihe dị ukwuu. Onye na-ekwesikwaghị ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị, agaghịkwa ekwesi ntụkwasị obi nʼihe dị ukwuu. 11Ọ bụrụ na unu abụghị ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼakụ mmehie nke ụwa, onye ga-enyekwa ezi akụ nʼaka unu na ntụkwasị obi idebe? 12Ọ bụrụkwa na unu abụghị ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼakụ onye ọzọ, onye ga-enye unu ihe nke bụ nke unu? 13“Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ife nna ukwu abụọ, nʼihi na ọ ga-achọ ịhụ otu nʼime ha nʼanya, kpọkwa nke ọzọ asị, maọbụ, sọpụrụ otu ma lelịa nke ọzọ anya. Otu a kwa i nweghị ike ife Chineke na akụ otu mgbe ahụ.” 14Mgbe ndị Farisii, bụ ndị hụrụ ego nʼanya nụrụ ihe ndị a, ha jiri ya mee ihe ọchị. 15Ọ sịrị ha, “Unu na-egosi onwe unu dị ka ndị ezi omume nʼihu ndị mmadụ ma Chineke maara obi unu. Nʼihi na ihe ndị mmadụ na-akpọ ihe dị oke mkpa bụ ihe rụrụ arụ nʼanya Chineke.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike