Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 4 Novemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 4 Novemba 2027

Tọọzdee · Izu nke 31 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tọọzdee nke izu nke 31 nke Oge Nkịtị

Ncheta · Agba ofufe: ọcha

Onye nsọ Chalz Borromeo, Bishọp · Ncheta

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Rom 14:7–12

7Nʼihi na o nweghị onye nʼime anyị na-adịrị naanị onwe ya ndụ, o nwekwaghị onye nʼime anyị na-anwụrụ naanị onwe ya ọnwụ. 8Ọ bụrụ na anyị adịrị ndụ, anyị dị ndụ nye Onyenwe anyị; ọ bụrụkwa na anyị anwụọ, anyị nwụrụ nye Onyenwe anyị; ya mere ma anyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ, anyị bụ nke Onyenwe anyị. 9Ọ bụ nʼihi nke a ka Kraịst ji nwụọ, ma biliekwa, ka ọ bụrụ Onyenwe nke ndị dị ndụ na nke ndị nwụrụ anwụ. 10Ma gị onwe gị, gịnị mere i ji ekpe nwanna gị ikpe? Gịnị mekwara i ji eleda ya anya? Nʼihi na anyị niile ga-eguzo nʼotu nʼotu nʼihu oche ikpe Chineke. 11E dere ya, “ ‘Nʼezie, dịka m na-adị ndụ,’ ka Onyenwe anyị kwuru, ‘ikpere niile ga-egbu nʼihu m; ire niile ga-ekwupụtakwa Chineke.’ ” 12E, anyị niile nʼotu nʼotu ga-aza ajụjụ banyere ndụ anyị nʼihu Chineke.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 27:1, 4, 13–14

1Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị bụ ìhè m na nzọpụta m, onye ka m ga-atụ egwu ya? Onyenwe anyị bụ ebe siri ike nke ndụ m, ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu? 4Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka Onyenwe anyị, nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike; ka m biri nʼụlọ Onyenwe anyị ụbọchị niile nke ndụ m, na ka m lekwasị ịma mma Onyenwe anyị, na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya. 13Olileanya m bụ nke a: Aga m ahụ ịdị mma Onyenwe anyị nʼala ndị dị ndụ. 14Chere Onyenwe anyị; dịrị ike, nwekwaa ume, ma chere Onyenwe anyị.

Oziọma

Luk 15:1–10

1Ugbu a, ndị ọna ụtụ na ndị mmehie na-abịa ya nso ịnụta ihe ọ na-ekwu. 2Ndị Farisii na ndị ozizi iwu tamuru ntamu na-asị, “Nwoke a na-anabata ndị mmehie sorokwa ha na-eri nri.” 3Ya mere, ọ tụrụ ha ilu a sị, 4“Ọ bụrụ na otu onye nʼime unu enwee narị atụrụ ma otu nʼime ha akpafuo. Ọ bụ na ọ gaghị ahapụ iri atụrụ itoolu na itoolu ahụ fọdụrụ nʼọzara, pụọ ịchọgharị otu ahụ kpafuru ruo mgbe ọ chọtara ya? 5Mgbe ọ chọtara ya, ọ ga-eji ọṅụ tụkwasị ya nʼubu ya. 6Mgbe ọ lọtara nʼụlọ ya, ọ ga-akpọkọta ndị enyi ya na ndị agbataobi ya sị ha, ‘Soronụ m ṅụrịa ọṅụ nʼihi na achọtala m atụrụ m furu efu.’ 7Asị m unu, nʼụzọ dị otu a, ọṅụ dị ukwu ga-adị nʼeluigwe nʼihi otu onye mmehie nke chegharịrị, karịa iri itoolu na itoolu ndị ezi omume bụ ndị nchegharị na-adịghị mkpa. 8“Maọbụ olee nwanyị nke nwere mkpụrụ ọlaọcha iri, ọ bụrụ nʼotu nʼime ha adafuo. Ọ gaghị amụnye oriọna, zaa ime ụlọ ya ịchọ otu mkpụrụ ego ahụ tutu ọ chọta ya? 9Mgbe ọ chọtara otu mkpụrụ ego ahụ, ọ ga-akpọ ndị enyi ya na ndị agbataobi ya sị ha, ‘Soronụ m ṅụrịa ọṅụ nʼihi na achọtala m ego m furu efu.’ 10Nʼụzọ dị otu a, asị m unu, ọṅụ ga-adị nʼihu ndị mmụọ ozi Chineke nʼihi otu onye mmehie nke chegharịrị.”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike