Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 5 Novemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 5 Novemba 2027

Fraịdee · Izu nke 31 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Fraịdee nke izu nke 31 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Obubu ọnụ na nchegharị

Ụbọchị nchegharị

Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Rom 15:14–21

14Ụmụnna m, o doro m anya na unu onwe unu jupụtara nʼịdị mma, bụrụkwa ndị tozuru etozu nʼihe ọmụma ruo na unu nwere ike izirịta onwe unu ihe. 15Ma otu ọ dị, edepụtala m ụfọdụ isi okwu nʼebe o doro anya nye unu, iji chetara unu ha ọzọ, nʼihi amara Chineke nyere m, 16abụ m onyeozi Kraịst Jisọs, ana m arụkwa ọrụ onye nchụaja nʼizisa oziọma Chineke, ka ofufe ndị mba ọzọ bụrụ aja Chineke ga-anara nke ọma, nke Mmụọ Nsọ dokwara nsọ. 17Nʼihi ya, ana m anya isi nʼime Kraịst Jisọs banyere ọrụ m na-arụrụ Chineke. 18Agaghị m anwa anwa kwuo okwu banyere ihe ọzọ karịakwa ihe ndị ahụ Kraịst rụpụtara site nʼaka m, bụ idubata ndị mba ọzọ, ime ka ha rube isi nye Chineke, site nʼokwu ọnụ m na ihe m rụrụ, 19nke pụtara ihe nʼọrụ ebube na ihe ịrịbama site nʼike nke Mmụọ nke Chineke. Ya mere, site na Jerusalem ruo Ilirikom, ekwusaala m nʼụzọ zuru ezu, oziọma Kraịst. 20Ọchịchọ obi m mgbe niile bụ ikwusa oziọma ahụ nʼebe ọbụla ndị mmadụ na-anụtụbeghị ihe banyere Kraịst, ka m ghara ịbụ onye na-ewukwasị ihe nʼelu ntọala nke onye ọzọ tọrọ, 21ma dịka e dere ya, “Ndị a na-agwaghị ihe banyere ya ga-ahụ, ndị a ka anụbeghị, ga-aghọtakwa.”

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 98:1–4

1Abụ Ọma. Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ, nʼihi na ọ rụọla ọtụtụ ọrụ dị ebube; aka nri ya na aka nsọ ya arụpụtarala ya nzọpụta. 2Onyenwe anyị emeela ka a mata nzọpụta ya o kpugheela ezi omume ya nye mba niile. 3O chetala ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya nʼebe ụlọ Izrel dị; nsọtụ nke ụwa niile ahụla nzọpụta Chineke anyị. 4Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile jirinụ iti egwu tiwaa mkpu abụ ọṅụ;

Oziọma

Luk 16:1–8

1Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Otu ọgaranya nwere otu onyeisi ọrụ nke e boro ebubo na ọ na-ala akụ ya nʼiyi. 2Ya mere ọ kpọrọ ya sị ya, ‘Gịnị bụ ihe a m na-anụ banyere gị? Gbakọọrọ m otu i si na-elekọta akụ m, nʼihi na achọkwaghị m ka ị bụrụ onyeisi ọrụ ọzọ.’ 3“Onyeisi ọrụ ahụ sịrị onwe ya, ‘Gịnị ka m ga-eme ugbu a nna m ukwu na-achọ ịkwụsị m ọrụ? Ike igwu ala adịghị m, ihere agakwaghị ekwe m ịrịọ arịrịọ. 4Amatala m ihe m ga-eme, nke a ga-enyere m aka ma ọ bụrụ na a chụpụ m nʼọrụ nʼebe a, aga m enweta ndị ga-anabata m nʼụlọ ha.’ 5“Ya mere ọ kpọrọ ndị niile ji nna ya ukwu ụgwọ nʼotu nʼotu. Ọ jụrụ onye nke mbụ sị, ‘Ego ole bụ ụgwọ i ji nna m ukwu?’ 6“Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụ puku karama mmanụ oliv ka m ji ụgwọ ya.’ “Onyeisi ọrụ ahụ gwara ya sị, ‘Ngwangwa, were akwụkwọ degharịa ya narị karama ise.’ 7“Mgbe ahụ, ọ jụrụ onye nke abụọ sị, ‘Ego ole bụ ụgwọ i ji?’ “Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụ narị akpa ọka wiiti.’ “Ọ sịrị ya, ‘Ngwangwa degharịa ya iri akpa ọka wiiti asatọ.’ 8“Nna ya ukwu toro onyeisi ọrụ ahụ na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼihi na ọ kpara agwa dị ka onye nwere uche. Nʼihi na ụmụ, nke ọgbọ a, ji akọnuche na-eso ndị ọgbọ ha karịa ụmụ nke ìhè.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike