Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 3 Novemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 3 Novemba 2027
Wenezdee · Izu nke 31 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Wenezdee nke izu nke 31 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Onye nsọ Matin de Porres, Onye okpukpe · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
8Kwụọnụ ụgwọ niile unu ji. Ka ụgwọ unu ga-ejide ndị mmadụ bụrụ ụgwọ ịhụ ha nʼanya. Nʼihi na mgbe ị na-ahụ ndị mmadụ nʼanya, ị na-emezu ihe niile iwu chọrọ. 9Iwu niile e nyere, “Gị akwala iko,” “Egbula mmadụ,” “Ezula ohi,” “Enwela anya ukwu nʼihe mmadụ ibe gị nwere,” nakwa iwu ndị ọzọ niile e nyere ka a chịkọtara nʼotu nke a sịrị: “Hụ mmadụ ibe gị nʼanya dịka onwe gị.” 10Ịhụnanya adịghị echere onye agbataobi ya echiche ọjọọ, ya mere ịhụnanya bụ idebezu iwu niile.
Abụ Ọma nzaghachi
1Toonu Onyenwe anyị. Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị; onye na-enwe oke mmasị idebe iwu ya niile. 2Ụmụ ya ga-abụ ndị dị ike nʼala ahụ; ọgbọ ndị na-eme ihe ziri ezi ga-abụ ndị a gọziri agọzi. 4Ìhè na-enwuru ndị na-eme ihe ziri ezi, ọ bụladị nʼime ọchịchịrị, nyekwa ndị na-eme amara, ndị obiọma na ndị ezi omume. 5Ihe ọma ga-abịara onye ahụ na-eme ebere na-ejikwa obi ya agbazinye ndị mmadụ ihe, onye na-eji ikpe ziri ezi arụ ọrụ ya niile. 9Ọ gbasapụrụ aka ya nye ndị ogbenye onyinye dị iche iche, ezi omume ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; a ga-ewere nsọpụrụ welie mpi ya elu.
Oziọma
25Ugbu a, oke igwe mmadụ na-eso ya ma ọ tụgharịrị sị ha: 26“Onye ọbụla chọrọ iso m, ma o bụghị ụzọ kpọ nne na nna ya, na nwunye ya, na ụmụ ya, na ụmụnne ya ndị nwoke na ndị nwanyị tinyekwara ndụ nke ya onwe ya asị, apụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m. 27Onye ọbụla na-eburughị obe ya soro m, enweghị ike ịbụ onye na-eso ụzọ m. 28“Ọ dị onye ọbụla nʼime unu chọrọ iwu ụlọ elu, na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala, gbakọọ ihe ọ ga-efu ya, iji chọpụta ma o nwekwara ego ga-ezu iwucha ya? 29Nʼihi na ọ bụrụ na ọ tọọ ntọala ma o nwekwaghị ike wuchaa ya, onye ọbụla hụrụ ya ga-achị ya ọchị, 30na-asị, ‘Nwoke a malitere iwu ụlọ, ma o nweghị ike wuchaa ya.’ 31“Maọbụ olee eze chọrọ ịlụso eze ibe ya ọgụ, ọ gaghị ebu ụzọ nọdụ ala tulee ma puku ndị agha iri ya ọ ga-ezuru ya iji lụso onye ji iri puku ndị agha abụọ abịakwute ya ọgụ? 32Ọ bụrụ na o nweghị ike, ọ ga-ezipụ ozi rịọ ka e kpee udo mgbe onye nke ọzọ ka nọ nʼebe dị anya. 33Nʼụzọ dị otu a, onye ọbụla na-ajụghị ihe niile o nwere, apụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Matin de Porres, Onye okpukpe
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike