Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 2 Novemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 2 Novemba 2027

Tiuzdee · Izu nke 31 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Ncheta ndị kwesịrị ntụkwasị obi niile nwụrụ anwụ (Ụbọchị Mkpụrụ obi niile)

Ncheta nkenke · Agba ofufe: odo odo

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Aịz 25:6–9

6Nʼelu ugwu a, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-anọ kwadooro ụwa niile oke oriri. Ọ ga-abụ oke oriri nke ga-adịrị ndị niile. Oke oriri nke ezi anụ na mmanya dị mma ga-adị. 7Nʼelu ugwu a, ka ọ ga-ewepụ ihe ndị ahụ niile na-eweta ihu mgbarụ, nke dị ka akwa e ji kpuchie mmadụ niile, nke kpuchikwara ihu ndị mba niile. 8Ọ ga-elomi ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi. Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-ehicha anya mmiri niile site nʼihu mmadụ niile, ọ ga-ewezuga ihe ịta ụta niile dakwasịrị ndị ya site nʼụwa niile. Onyenwe anyị ekwuola ya. 9Nʼụbọchị ahụ, ndị mmadụ ga-asị, “Nke a bụ Chineke anyị nʼezie, anyị tụkwasịrị ya obi, ọ zọpụtakwara anyị. Nke a bụ Onyenwe anyị ahụ, anyị tụkwasịrị ya obi, ka anyị nwee ọṅụ ma ṅụrịakwa na nzọpụta ya.”

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 23:1–6

1Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị na-azụ m dịka atụrụ, ọ dịghị ihe akọrọ m. 2Ọ na-eme ka m dinaa ala nʼebe ahịhịa ndụ na-eto, ọ na-edugharị m nʼakụkụ mmiri dị jụụ, 3ọ na-atụte mkpụrụobi m. Ọ na-edu m nʼụzọ niile nke ezi omume nʼihi aha ya. 4A sịkwarị na m na-aga ije, na ndagwurugwu nke ọchịchịrị ọnwụ, agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla; nʼihi na ị nọnyeere m, mkpọrọ gị na mkpanaka gị na-akasị m obi. 5Ị na-akwado tebul nʼihu m, nʼanya ndị iro m. I tere isi m mmanụ iko m na-ejubiga oke. 6Nʼezie, ịdị mma na ebere ga-agbaso m ogologo ụbọchị niile nke ndụ m, m ga-ebikwa nʼụlọ Onyenwe anyị mgbe niile ebighị ebi.

Ihe ọgụgụ nke abụọ

1Kọ 15:12–26

12Ma ọ bụrụ na a na-ekwusa na Kraịst si nʼọnwụ bilie, gịnị mere ụfọdụ unu ji na-ekwu na ndị nwụrụ anwụ apụghị isi nʼọnwụ bilie ọzọ. 13Ọ bụrụ na ndị nwụrụ anwụ a pụghị i si nʼọnwụ bilie, nke a pụtara na e meghị ka Kraịst site nʼọnwụ bilie. 14Ọ bụrụkwa na e meghị ka Kraịst si nʼọnwụ bilie, ihe anyị na-ezisa bụ ihe efu, okwukwe unu nwere bụkwa ihe efu. 15Ma karịa nke a, a na-ahụta anyị ka ndị ama ụgha nke Chineke, nʼihi na anyị gbara ama banyere Chineke, na-asị na o mere ka Kraịst si nʼọnwụ bilie, bụ onye ọ na-emeghị ka o si nʼọnwụ bilie ma ọ bụrụ na-emeghị ka ndị nwụrụ anwụ dị ndụ ọzọ. 16Nʼihi na, ọ bụrụ na a pụghị ime ka ndị nwụrụ anwụ bilie dị ndụ ọzọ, emekwaghị ka Kraịst si nʼọnwụ bilie. 17Ma ọ bụrụ na-emeghị ka Kraịst si nʼọnwụ bilie, okwukwe unu bụ ihe efu, unu ka ga-anwụ na mmehie unu. 18Mgbe ahụ ndị nwụrụ anwụ nʼime Kraịst lara nʼiyi. 19Ọ bụrụkwa na olileanya anyị nʼime Kraịst gwụrụ naanị na ndụ anyị nʼime ụwa a, anyị bụ ndị e kwesiri ka e mere ebere. 20Ma e mere ka Kraịst si nʼọnwụ bilie nʼezie, onye mbụ nʼetiti ndị niile nwụrụ anwụ. 21Nʼihi na dịka ọnwụ si site nʼaka otu nwoke bịa, otu a kwa ka mbilite nʼọnwụ si site nʼaka otu nwoke bịa. 22Dịka mmadụ niile si anwụ site nʼaka Adam, otu a kwa ka mmadụ niile ga-esi dịkwa ndụ nʼime Kraịst. 23Onye ọbụla ga-ebili nʼusoro nke ya, Kraịst mkpụrụ mbụ si nʼọnwụ bilie. Mgbe ọ lọghachiri, ndị niile bụ ndị nke Kraịst ga-esote. 24Mgbe nke a gasịrị, ọgwụgwụ ihe niile ga-abịa, mgbe ọ ga-enyefe alaeze nʼaka Chineke bụ Nna, nʼihi na o meriela ịchị isi niile, na ikike niile na ike niile. 25Nʼihi na ọ ga-abụ eze tutu ruo mgbe ọ lụgburu ndị iro ya niile, doo ha nʼokpuru ụkwụ ya. 26Onye iro ikpeazụ a ga-emeri bụ ọnwụ.

Oziọma

Mak 8:27–35

ma ọ bụ: Jọn 1:1–5, 9–14

27Mgbe ahụ Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya gara nʼobodo nta ndị ọzọ dị gburugburu Sizaria Filipai. Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Onye ka ndị mmadụ na-asị na m bụ?” 28Ha zara ya sị, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ndị ọzọkwa sị na ị bụ Ịlaịja maọbụ otu nʼime ndị amụma.” 29Ma ọ jụrụ ha sị, “Ma unu onwe unu, ọ bụ onye ka unu na-asị na m bụ?” Pita zara sị, “Ị bụ Kraịst ahụ.” 30Ọ dọrọ ha aka na ntị sị ha agwakwala onye ọbụla ihe banyere ya. 31Emesịa, o bidoro izi ha ihe na Nwa nke Mmadụ aghaghị ịhụ ọtụtụ ahụhụ dị iche iche, ndị okenye, na ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu ga-ajụ ya, na aghaghị igbu ya, ma ọ ga-ebili nʼọnwụ mgbe ụbọchị nke atọ gasịrị. 32Ọ gwaghere ha ihe ndị a ọnụ. Ma Pita kpọọrọ ya pụọ nʼotu akụkụ, bido ịbara ya mba. 33Ma ọ tụgharịrị lee ndị na-eso ụzọ ya anya, baara Pita mba sị ya, “Si nʼebe m nọ pụọ ekwensu! Ihe ị na-eche echiche ya abụghị uche Chineke, ha bụ echiche mmadụ.” 34Mgbe ahụ, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya na igwe mmadụ ahụ. Ọ gwara ha sị, “Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ iso m, ya gụọ ndụ ya dị ka ihe furu efu. Mgbe ahụ, ya buru obe ya soro m nʼazụ. 35Nʼihi na onye na-azọ ndụ ya ka ọ ga-efunarị, ma onye ọbụla gụrụ ndụ ya dị ka ihe furu efu nʼihi m, na nʼihi oziọma m, ga-azọpụta ya.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike