Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 2 Novemba
Kalenda Ọtọdọks · 20 Ọktoba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 2 Novemba 2027
Tiuzdee · Izu nke 20 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 2
Mmemme na ndị nsọ
Great Martyr Artemius of Antioch († 362)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
16Na-echekwanụ nʼihu ha okwu ahụ na-enye ndụ. Ka ọ bụrụ na mgbe Kraịst bịara ọzọ, aga m aṅụrị ọṅụ, nʼihi na ọrụ m rụrụ nʼetiti unu abụghị ihe efu. 17Nʼezie, ọ bụrụ na-awụpụ m dị ka aja ihe ọṅụṅụ nʼelu aja nʼife ofufe nke sitere na Chineke nʼihi okwukwe unu. E, a si na e gbuo m nʼihi unu, aga m aṅụrị ọṅụ na-esorokwa unu niile nwe obi ụtọ 18otu aka ahụ, unu onwe unu kwesiri inwe obi ụtọ ma sorokwa m ṅụrịa ọṅụ. 19Enwere m olileanya nʼime Onyenwe anyị Jisọs na m ga-ezitere unu Timoti nʼoge na-adịghị anya site ugbu a, ka m site nʼozi ọ ga-anata banyere unu nwee obi ụtọ. 20Enweghị m onye ọzọ dị ka ya, onye ga-eche ezi echiche maka ọdịmma unu. 21Nʼihi na ndị ọzọ na-echegbu onwe ha maka ọdịmma nke ha, ma ọ bụghị maka ọdịmma Jisọs Kraịst. 22Ma unu niile maara otu Timoti si dị oke mkpa. Ọ dị nnọọ dị ka nwa m, site nʼinyeaka ọ na-enyere m nʼọrụ izisa oziọma. 23Enwere m olileanya nʼezie izitere unu ya. M ga-emekwa nke a ma ọ bụrụ na m chọpụta ihe ọnọdụ m nʼebe a ga-abụ.
Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Atemiọs)
1Ya mere, nwa m, bụrụ onye dị ike site nʼamara ahụ Kraịst Jisọs na-enye. 2Ihe niile nke ị nụrụ nʼọnụ m nʼihu ọtụtụ ndị ama ka ị ga-enyefe nʼaka ndị kwesiri ntụkwasị obi, bụ ndị nwekwara ike izi ndị ọzọ ihe ndị a. 3Soro m kere oke nʼahụhụ dị ka ezi onye agha Jisọs Kraịst. 4Ọ dịghị onye agha ọbụla na-ekekọta onwe ya nʼihe nke ụwa a, kama ọ na-achọ ime ihe ga-atọ onye họpụtara ya dị ka onye agha ụtọ. 5Otu aka ahụ, onye na-agba ọsọ agaghị enweta okpu mmeri, ma ọ bụrụ na ọ gbaghị ọsọ ya dịka usoro iwu ịgba ọsọ si dị. 6Onye ọrụ ubi na-adọgbu onwe ya nʼọrụ kwesiri ịbụ onye ga-ebu ụzọ rie mkpụrụ sitere nʼubi ya. 7Na-atụgharị uche nʼihe m kwuru, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enye gị nghọta nʼime ha niile. 8Echefula Jisọs Kraịst, onye a kpọlitere site nʼọnwụ, onye sikwa nʼagbụrụ Devid, nke a bụ oziọma m. 9Ọ bụ nʼihi na m na-ekwu eziokwu ndị a ka m ji nọọ na-ahụ ahụhụ dị otu a dị ka onye ọjọọ, ma otu ọ dị, ekeghị okwu Chineke agbụ. 10Ya mere, ana m anagide ihe niile nʼihi ndị a họpụtara, ka ha bụrụkwa ndị ga-anata nzọpụta dị nʼime Kraịst Jisọs, na ebube ebighị ebi.
Oziọma
23Mgbe ahụ ọ sịkwara ha, “Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ iso m nʼazụ, ọ ghaghị ịjụ onwe ya ma buru obe ya kwa ụbọchị na-eso m. 24Nʼihi na onye ọbụla chọrọ ịzọpụta ndụ ya ga-atụfu ya. Ma onye ọbụla nke tufuru ndụ ya nʼihi m, ga-azọpụta ya. 25Uru gịnị ka mmadụ nwere ma ọ bụrụ na o ritechaa ụwa niile nʼuru ma tufuo ndụ ya, maọbụ bụrụ onye a napụrụ ndụ ya? 26Onye ọbụla ihere m na ihere okwu m na-eme, ka ihere ya ga-emekwa Nwa nke Mmadụ mgbe ọ ga-abịa nʼebube ya, na nʼebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi dị nsọ. 27“Nʼezie asị m unu, ụfọdụ nʼime ndị guzo nʼebe a agaghị edetụ ọnwụ ire tupu ha ahụ alaeze Chineke.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 20 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 2 Novemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike