Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 30 Ọktoba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 30 Ọktoba 2027

Satọdee · Izu nke 30 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Satọdee nke izu nke 30 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ncheta Satọdee nke Nwaagbọghọ Meri Agọziri Agọzi · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Rom 11:1–2, 11–12, 25–29

1Mgbe ahụ a na m ajụ, ọ ga-abụ na Chineke ajụla ndị ya? Mba, nke a apụghị ime, nʼihi na mụ onwe m bụkwa onye Izrel. Abụ m nwa nwa Ebraham, onye si nʼagbụrụ Benjamin pụta. 2Chineke ajụbeghị ndị ya bụ ndị ọ họpụtara site na mmalite ihe niile. Ọ bụ na unu amaghị ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu banyere Ịlaịja, otu o siri rịọ Chineke arịrịọ megide ụmụ Izrel? 11Ajụjụ ọzọ m na-ajụ bụ nke a: Ọ ga-abụ na ha sụrụ ngọngọ ka ha daa ma ghara ibilite ọzọ? Ọ bụghị otu a! Kama nʼihi mmehie ha, nzọpụta rutere ndị mba ọzọ ka e sitekwa na nke a kpalie ekworo nʼime ụmụ Izrel. 12Ma ọ bụrụ na mmehie ha wetara akụnụba nye ụwa, ọ bụrụkwa na ịbụ ogbenye ha wetara ngọzị nye ndị mba ọzọ, ọ bụ na ngọzị babigara ụba oke agaghị adị mgbe a ga-agụkọta ọnụọgụgụ ha niile? 25Ụmụnna m, achọrọ m ka unu mata ihe omimi a, ka unu ghara ịnya isi. Nnupu isi ụfọdụ ụmụ Izrel agaghị adịgide kama ọ ga-adị ruo nʼoge ọnụọgụgụ ndị mba ọzọ a ga-anabata zuru. 26Mgbe ahụ, a ga-azọpụta Izrel niile. Dịka e dere ya, “Onye nzọpụta ga-esite na Zayọn bịa. Ọ ga-eme ka Jekọb site na ndụ asọpụrụghị Chineke chigharịa. 27Nke a bụ ọgbụgba ndụ m nke dị nʼetiti mụ na ha, mgbe m wepụrụ mmehie ha niile.” 28Nʼihe banyere oziọma, ha bụ ndị iro nke Chineke nʼihi unu. Ma a bịa nʼihe gbasara nhọpụta, ha bụ ndị nke a hụrụ nʼanya nʼihi ndị nna nna ha. 29Nʼihi na enye anarakwa adịghị nʼonyinye nakwa ọkpụkpọ Chineke.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 94:12–15, 17–18

12Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ, onye ị na-adọ aka na ntị, O Onyenwe anyị, onye ahụ ị na-akụziri ihe site nʼiwu gị; 13ị na-enye ya izuike site nʼụbọchị nsogbu; tutu ruo mgbe a ga-egwuru ndị ajọ omume olulu. 14Nʼihi na Onyenwe anyị agaghị ajụ ndị ya; ọ gaghị agbakụta ihe nketa ya azụ. 15Ezi omume ga-abụ ntọala ikpe ikpe niile; ndị niile ndị ziri ezi nʼobi ga-agbasokwa ya. 17A sị na Onyenwe anyị abịaghị nyere m aka, agaara m rịị abụ onye nwụrụ anwụ. 18Mgbe m kwuru sị, “Ụkwụ m na-agbuchapụ,” ọ bụ ịhụnanya gị, O Onyenwe anyị, kwagidere m.

Oziọma

Luk 14:1, 7–11

1Otu ụbọchị izuike, mgbe ọ gara iri ihe nʼụlọ otu onyendu ndị Farisii, ha nọ na-ele ya anya nke ọma. 7Mgbe ọ hụrụ otu ndị a kpọrọ oriri si họrọ naanị oche ndị a na-asọpụrụ, oche ndị a na-asọpụrụ, ọ tụrụ ha ilu sị, 8“Mgbe mmadụ ọbụla kpọrọ gị oriri nʼọlụlụ di na nwunye, abatala nọdụ nʼoche ndị a na-asọpụrụ, nʼihi na eleghị anya, onye kpọrọ gị oriri kpọkwara onye ka gị nwe nsọpụrụ. 9Nʼihi na onye ahụ kpọrọ unu oriri nwere ike bịakwute gị sị gị, nye nwoke a ọnọdụ gị. Mgbe ahụ, ị ga-ebili nʼanya ihere gaa nọdụ nʼoche dịkarịsịrị ala. 10Ma mgbe a kpọrọ gị, nọdụ nʼoche dị ala, ka ọ ga-abụ na onye kpọrọ gị oriri bịa, ọ ga-asị gị ‘Enyi m, rigota nʼebe a ka elu.’ Mgbe ahụ, ị ga-enwekwa ugwu nʼanya ndị niile a kpọrọ gị na ha oriri. 11Nʼihi na onye ọbụla ga-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda nʼala, ma onye ọbụla na-eweda onwe ya ala ka a ga-ebuli elu.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike