Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 29 Ọktoba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 29 Ọktoba 2027
Fraịdee · Izu nke 30 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Fraịdee nke izu nke 30 nke Oge Nkịtị
Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Obubu ọnụ na nchegharị
Ụbọchị nchegharị
Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Ana m ekwu eziokwu nʼime Kraịst. Anaghị m ekwu okwu ụgha. Akọnuche m nke Mmụọ Nsọ na-achị na-agbakwara m ama. 2A nọ m nʼọnọdụ oke ihe mwute na ihe mgbu dị ukwuu nʼobi m. 3A sị na ọ bụ ihe ga-ekwe mee, ejikeere m ịbụ onye a bụrụ ọnụ na onye e wepụrụ site nʼebe Kraịst nọ nʼihi ụmụnna m na ndị ikwu m, 4bụ ndị Izrel. Ndị Chineke họọrọ ka ha bụrụ ụmụ ya, ndị o nyere ebube ya na ọgbụgba ndụ ya. O nyekwara ha iwu na ife ofufe nʼụlọnsọ ukwu ahụ na ọtụtụ nkwa dị iche iche. 5Ha si nʼagbụrụ nna nna anyị ochie ha. Kraịst nʼonwe ya, nʼụdịdị mmadụ, sikwa nʼagbụrụ ha pụta, onye bụ Chineke nke ihe niile, onye a na-eto ruo ebighị ebi. Amen.
Abụ Ọma nzaghachi
12O Jerusalem, jaa Onyenwe anyị mma; o Zayọn, too Chineke gị. 13Nʼihi na o wusiela mkpọrọ ọnụ ụzọ ama gị niile ike, na-agọzikwa ndị niile bi nʼime gị. 14Ọ na-eme ka oke ala gị nwee udo, jirikwa ọka wiiti kachasị mma nyejuo gị afọ. 15Ọ na-ezipụ iwu ya nʼelu ụwa niile; okwu ya na-agbasa ngwangwa. 19O kpugheela okwu ya nye Jekọb, iwu ya na ụkpụrụ ya niile nye Izrel. 20O mesobeghị mba ọzọ ụdị mmeso dị otu a. Ha amakwaghị iwu ya niile. Toonu Onyenwe anyị!
Oziọma
1Otu ụbọchị izuike, mgbe ọ gara iri ihe nʼụlọ otu onyendu ndị Farisii, ha nọ na-ele ya anya nke ọma. 2Ma lee, otu nwoke ahụ ya zara aza nọkwa nʼihu ya ebe ahụ. 3Jisọs jụrụ ndị Farisii na ndị ozizi iwu sị, “O ziri ezi nʼiwu ịgwọ ọrịa nʼụbọchị izuike ka ọ bụ na o zighị?” 4Ma ha e kwughị okwu ọbụla. Ya mere ọ kpọrọ ya, gwọọ ya ma sị ya laa. 5Ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na otu nʼime unu nwere nwa nwoke maọbụ oke ehi nke dabara nʼime olulu mmiri nʼụbọchị izuike, ọ bụ na ọ gaghị eme ngwangwa dọpụta ya?” 6Ma ha enweghị ike ịza ajụjụ a.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike