Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 20 Ọktoba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 20 Ọktoba 2027

Wenezdee · Izu nke 29 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Wenezdee nke izu nke 29 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Rom 6:12–18

12Unu ekwela ka mmehie na-achị eze nʼahụ unu ọzọ, nke ga-eme ka unu na-erubere agụụ nke anụ ahụ isi. 13Unu a nakwala eche akụkụ ahụ unu ọbụla ka ọ bụrụ ngwa ọrụ ajọ omume. Kama cheenụ onwe unu nʼihu Chineke, dịka ndị esi nʼọnwụ kpọpụta nyefee na ndụ. Cheenụ akụkụ ahụ unu niile nʼihu Chineke dịka ngwa ọrụ nke ezi omume. 14Nʼihi na unu ekwesighị ị bụ ohu mmehie, ebe ọ bụ na unu anọkwaghị nʼokpuru iwu ọzọ, kama unu nọ nʼokpuru amara. 15Gịnịkwa? Anyị ga-eme mmehie nʼihi na anyị anọghị nʼokpuru iwu kama nʼokpuru amara? Mba! O kwesighị. 16Ọ bụ na unu amataghị na mgbe unu weere onwe unu nye mmadụ irubere ya isi dịka ohu, unu bụ ohu nye onye ahụ unu na-erubere isi, maọbụ ohu nye mmehie nke na-eduba nʼọnwụ, ma ọ bụkwanụ irube isi nke na-eduba nʼezi omume? 17Ma ekele dịrị Chineke nʼihi na ọ bụ ezie na unu bụrịị ohu nye mmehie, ma ugbu a, unu ejirila obi unu niile kpebie ịnabatara onwe unu ozizi ahụ e nyefere nʼaka unu. 18Ugbu a, e meela ka unu nwere onwe unu site na mmehie, unu abụrụla ndị ohu ezi omume.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 124:1–8

1Abụ nrigo. Nke Devid. A sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị, ka Izrel kwuo, 2a sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị, mgbe ndị mmadụ biliri imegide anyị, 3mgbe iwe ha rere dịka ọkụ megide anyị, ha gaara eloda anyị na ndụ; 4idee mmiri gaara iri anyị, oke mmiri gaara ebufu anyị, 5ebili mmiri niile gaara ebufu anyị. 6Ma otuto dịrị Onyenwe anyị, onye na-ekweghị ka ha jiri eze ha dọrie anyị. 7Anyị agbanarịla ha dịka nwa nnụnụ si gbanarị ọnya osi ọnya chọrọ iji jide ya; ọnya ahụ agbajiela, anyị ewezugakwala onwe anyị, nwere onwe anyị. 8Inyeaka anyị dị nʼaha Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa.

Oziọma

Luk 12:39–48

39Maranụ nke a: ọ bụrụ na onyenwe ụlọ maara oge awa onye ohi ga-eji abịa nʼụlọ ya, ọ gaghị ekwe ka onye ohi ahụ tiwaa ụlọ ya. 40Unu kwesiri ịnọ na njikere nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼoge awa unu na-atụghị anya ya.” 41Pita sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị tụrụ ilu a nʼihi anyị, ka ọ bụ maka onye ọbụla?” 42Ma Onyenwe anyị sịrị, “Onye bụ ohu ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi ma nwekwa uche, nke onyenwe ya mere onyeisi ụmụodibo ya niile, ka ọ na-enye ha nri mgbe o kwesiri? 43Ngọzị na-adịrị ohu ahụ nke onyenwe ya ga-ahụ ka ọ na-arụ ọrụ ahụ mgbe ọ ga-alọghachi. 44Nʼezie asị m unu, ọ ga-eme onye nke ahụ onyeisi nke ihe niile o nwere. 45Ma ọ bụrụ na ohu ahụ asị nʼobi ya, ‘Onyenwe m na-anọ ọdụ ịlọta,’ ọ bụrụkwa na ọ malite itigbu ụmụodibo ndị ọzọ, bụ ndị ikom na ndị inyom na-eje ozi, na iri ihe oriri, na ịṅụkwa ihe ọṅụṅụ na ịṅụbiga mmanya oke. 46Nna ukwu ohu ahụ ga-alọta nʼụbọchị ọ na-atụghị anya, nʼoge awa ọ na-amakwaghị. Ọ ga-egburisikwa ya, nye ya ọnọdụ nʼetiti ndị na-ekweghị ekwe. 47“Ohu ahụ maara ihe nna ya ukwu chọrọ ma hapụ ịnọ na njikere, maọbụ ime ya, ka a ga-apịasi ụtarị ike. 48Ma onye na-amaghị ama ma mee ihe kwesiri ka a pịa ya ụtarị, a ga-apịa ya ụtarị ole na ole. Nʼihi na ọ bụ onye e nyere ihe hiri nne ka a ga-ele anya ịnata ihe hiri nne nʼaka. Onye e nyekwara ihe ukwu nʼaka idebe, nʼaka ya ka a ga-achọ ihe nke kachasịnụ.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike