Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 16 Ọktoba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 16 Ọktoba 2027

Satọdee · Izu nke 28 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Satọdee nke izu nke 28 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Onye nsọ Hedwig, Onye okpukpe · Ncheta a na-ahọrọ

Onye nsọ Magaret Meri Alacoque, Nwaagbọghọ · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Rom 4:13, 16–18

13Nkwa o kwere Ebraham na agbụrụ ya na ha ga-eketa ụwa abụghị site nʼidebe iwu, kama ọ bụ site nʼezi omume nke okwukwe. 16Ya mere, nkwa ahụ na-abịa site nʼokwukwe, ka ọ bụrụ naanị site nʼamara ka e ji mee ka ụmụ ya niile nweta ya, ọ bụghị naanị nye ndị nọ nʼokpuru iwu, kama ọ bụkwa nye ndị nwere ụdị okwukwe Ebraham. Nʼihi na ọ bụ nna anyị niile. 17Dịka e dere ya, “Emeela m gị nna nke ọtụtụ mba.” Ya mere, nʼihu Chineke ahụ bụ onye o kweenyere nʼime ya, bụ onye ahụ na-eme ka ndị nwụrụ anwụ dịkwa ndụ ọzọ, onye na-akpọkwa ihe ndị na-adịbụghị, mee ka ha dịrị. 18Ọ bụladị mgbe olileanya gasịrị, o kwenyere na ya ga-abụ nna nke ọtụtụ mba, dịka ihe a gwara ya si dị, “Otu a ka mkpụrụ gị ga-adị.”

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 105:6–9, 42–43

6unu ụmụ ụmụ Ebraham, bụ ohu ya, unu ụmụ ụmụ Jekọb, ndị ọ họpụtara. 7Ya onwe ya bụ Onyenwe anyị Chineke anyị; ikpe ya dị nʼụwa niile. 8Ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi, bụ nkwa o kwere nye puku ọgbọ, 9ọgbụgba ndụ ahụ nke ya na Ebraham gbara na iyi ọ ṅụrụ nye Aịzik. 42Nʼihi na o chetara nkwa ya dị nsọ, nke o kwere ohu ya Ebraham. 43O ji aṅụrị dupụta ndị ya, jirikwa ọnọdụ iti mkpu ọṅụ dupụta ndị ya ọ họpụtara;

Oziọma

Luk 12:8–12

8“Ma asị m unu, na onye ọbụla kwupụtara m nʼihu ụmụ mmadụ, onye ahụ ka Nwa nke Mmadụ ga-ekwupụta nʼihu ndị mmụọ ozi nke Chineke. 9Onye ọbụla na-agọnarị m nʼihu ndị mmadụ, a ga-agọnarịkwa ya nʼihu ndị mmụọ ozi nke Chineke. 10Onye ọbụla nke ga-ekwu okwu megide Nwa nke Mmadụ, a ga-agbaghara ya, ma onye ọbụla na-ekwulu Mmụọ Nsọ, agaghị agbaghara ya. 11“Mgbe ha ga-akpọbata unu nʼihu ụlọ nzukọ, ndị ọchịchị na ndịisi, unu echegbula onwe unu otu unu ga-esi zaghachi, maọbụ ihe unu ga-aza, maọbụ ihe unu ga-ekwu. 12Nʼihi na Mmụọ Nsọ ga-ezi unu nʼoge awa ahụ, ihe unu kwesiri ikwu.”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike