Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 15 Ọktoba

Kalenda Ọtọdọks · 2 Ọktoba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 15 Ọktoba 2027

Fraịdee · Izu nke 17 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 7

Mmemme na ndị nsọ

Hieromartyr Cyprian and Virginmartyr Justina of Nicomedia († 304)

Ụbọchị obubu ọnụ

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Efe 4:17–25

17Ya mere, ana m ekwu nke a, ma na-eguzokwa na ya nʼime Onyenwe, ka unu hapụ ibi ndụ dị ka ndị mba ọzọ si ebi, na echiche ha na-abaghị uru. 18Ndị ọchịchịrị gbachiri nghọta ha. Ndị dị otu a enweghị oke na ndụ ahụ Chineke na-enye, nʼihi na obi ha mechiri emechi, ha adịghị aghọtakwa. 19Ha abụrụla ndị obi ha kpọrọ nkụ, ndị were onwe ha nyefee ime ihe niile masịrị ọchịchọ ha, ka ha si otu a na-ebi ndụ adịghị ọcha niile, ha bụ ndị jupụtara nʼanya ukwu. 20Ma nke a abụghị otu unu siri mụta Kraịst, 21ma ọ bụrụ na unu anụla ihe banyere ya, ọ bụrụkwa na unu amụtala ihe site nʼaka ya banyere eziokwu ahụ dị nʼime Jisọs. 22Yipụnụ mmadụ ochie unu, nke mere ka unu na-ebi ndụ ọjọọ na mbụ, bụ mmadụ ochie ahụ nke jupụtara nʼagụụ ime ihe ọjọọ niile, 23ka eme ka mmụọ nke uche unu dị ọhụrụ. 24Ma yikwasịnụ onwe unu mmadụ ọhụrụ, nke e kere nʼụdịdị Chineke nʼezi omume nʼezie nakwa nʼịdị nsọ. 25Ya mere, wezuganụ ịgha ụgha, ka anyị niile kwuo eziokwu nye ndị agbataobi anyị, nʼihi na anyị niile bụ ndị e jikọtara nʼotu anụ ahụ.

Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Siprian)

1Tm 1:12–17

12Ana m ekele Kraịst Jisọs Onyenwe anyị ekele, onye na-enye m ike, nʼihi na ọ gụrụ m dị ka onye e kwesiri ịtụkwasị obi mgbe ọ họpụtara m ijere ya ozi. 13Ọ bụ ezie na nʼoge gara aga, abụ m onye na-ekwujọ Chineke na onye na-akpagbu ndị ya, bụrụkwa onye na-emegide emegide. Ma Chineke meere m ebere nʼihi na m mere ihe ndị ahụ nʼọnọdụ amaghị ihe, na enweghị okwukwe. 14Ma Onyenwe anyị wụkwasịrị m amara ya, nke babigara ụba oke, ya na okwukwe na ịhụnanya nʼime Kraịst Jisọs. 15Okwu a kwesiri ntụkwasị obi, kwesikwa ka anabata ya nke ọma: Kraịst Jisọs bịara nʼụwa ịzọpụta ndị mmehie, nke mụ onwe m bụ onyeisi ha. 16Ọ bụ nʼihi nke a ka e ji gosi m ebere, ka Kraịst Jisọs site nʼime m, bụ onye kachasị dị njọ, gosi enweghị ọgwụgwụ nke ntachiobi ya, ka m bụrụ ihe nlere anya nye ndị ahụ niile ga-ekwere na ya, ma nata ndụ ebighị ebi. 17Ugbu a, ka enye Eze ahụ na-adị ruo mgbe niile, Onye na-adịghị anwụ anwụ, Onye a na-adịghị ahụ anya, Onye naanị ya bụ Chineke, nsọpụrụ na otuto ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.

Oziọma

Luk 6:17–23

17Ya na ha rịdatara ga nʼebe ala dị larịị. Igwe ndị na-eso ụzọ ya na oke igwe mmadụ sitere na Judịa, na Jerusalem nakwa obodo dị na nsọtụ mmiri nke Taịa na Saịdọn. 18Ndị bịara ịnụrụ okwu ya na ka a gwọọ ha ọrịa ha. A gwọkwara ọtụtụ ndị mmụọ na-adịghị ọcha na-esogbu. 19Igwe mmadụ ahụ gbalịrị ịmetụ ya aka, nʼihi na ike dị ukwuu si ya nʼahụ na-apụ na-agwọ ha niile. 20O weliri anya lee ndị na-eso ụzọ ya, sị ha, “Ngọzị na-adịrị unu bụ ndị ogbenye, nʼihi na alaeze Chineke bụ nke unu. 21Ngọzị na-adịrị unu ndị agụụ na-agụ ugbu a, nʼihi na afọ ga-eju unu. Ngọzị na-adịrị unu ndị na-ebe akwa ugbu a, nʼihi na unu ga-achị ọchị. 22Ngọzị na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akpọ unu asị, mgbe ha na-achụpụ unu, na-akparị unu, na-ajụ aha unu, nʼihi Nwa nke Mmadụ. 23“Ṅụrịanụ ọṅụ ma wuliekwanụ elu nʼihi ọṅụ nʼụbọchị ahụ, nʼihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu nʼeluigwe. Nʼihi na otu a ka ndị nna nna ha mesoro ndị amụma.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 2 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 15 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike