Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 15 Ọktoba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 15 Ọktoba 2027

Fraịdee · Izu nke 28 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Fraịdee nke izu nke 28 nke Oge Nkịtị

Ncheta · Agba ofufe: ọcha

Onye nsọ Teresa nke Jisọs, Nwaagbọghọ na Onye nkuzi nke Chọọchị · Ncheta

Obubu ọnụ na nchegharị

Ụbọchị nchegharị

Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Rom 4:1–8

1Gịnị ka anyị nwere ikwu banyere Ebraham, nna nna anyị na o nwetara ihe niile site nʼanụ ahụ? 2A sị na a gụrụ Ebraham dịka onye ezi omume site nʼọrụ aka ya, ọ gaara enwe ihe ọ ga-eji anya isi, ma na ọ bụghị nʼihu Chineke. 3Ma gịnị ka akwụkwọ nsọ kwuru? “Ebraham kweere na Chineke, a gụrụ nke a nye ya dị ka ezi omume.” 4Mgbe mmadụ rụrụ ọrụ, ụgwọ ọrụ a kwụrụ ya abụghị onyinye, kama ọ bụ ihe ruru ya nʼihi ọrụ ọ rụrụ. 5Ma nye onye na-enweghị ọrụ ma tinye okwukwe ya na onye ahụ na-agụnye ndị ajọọ omume dịka ndị ezi omume, a ga-eji okwukwe ya gụnyere ya dịka ezi omume. 6Devid nʼonwe ya kwukwara banyere ọṅụ dịịrị onye ọbụla Chineke gụrụ nʼonye ezi omume nʼagbanyeghị ọrụ ya. 7“Ngọzị na-adịrị ndị a gbaghaara ajọ omume ha niile, ndị ekpuchikwara mmehie ha niile. 8Ngọzị na-adịrị nwoke ahụ, onye Onyenwe anyị na-adịghị agụnyere mmehie ya.”

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 32:1–2, 5, 11

1Abụ Ọma Devid. Abụ Maskil. Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ, onye a gbaghaara ajọ omume ya niile, onye e kpuchikwaara mmehie ya niile. 2Ngọzị na-adịrị nwoke ahụ, onye Onyenwe anyị na-adịghị agụnyere mmehie ya, onye ahụ nke aghụghọ ọbụla na-adịghịkwa nʼime mmụọ ya. 5Mgbe ahụ, ekwupụtara m mmehie m niile nʼihu gị, kwụsịkwa izo ha ezo. Agwara m onwe m okwu sị, “Aga m ekwupụta mmehie m niile nʼihu Onyenwe anyị.” Ị gbaghakwaara m ikpe ọmụma nke mmehie m niile. Sela 11Ṅụrianụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, nweekwanụ obi ụtọ, unu ndị ezi omume; bụọ abụ, unu ndị obi ha ziri ezi.

Oziọma

Luk 12:1–7

1Nʼoge ahụ, mgbe ọtụtụ puku ndị mmadụ gbakọtara, nke mere ka ha na-azọ ibe ha ụkwụ. O buuru ụzọ bido ịgwa ndị na-eso ụzọ ya sị, “Kpacharanụ anya unu banyere ihe na-eko achịcha ndị Farisii, nke bụ ihu abụọ ha. 2Nʼihi na ọ dịghị ihe ọbụla zoro ezo nke na-agaghị apụta ìhè, ọ dịkwaghị ihe e kpuchiri ekpuchi nke a na-agaghị ekpughe. 3Ihe ọbụla unu kwuru nʼọchịchịrị, a ga-anụ ya nʼihe, ihe ọbụla unu gbara nʼizu nʼime ụlọ ka a ga-ekwusa nʼelu ụlọ. 4“Ana m agwa unu, ndị enyi m, unu atụla egwu maka ndị na-egbu anụ ahụ ma e mesịa, ha apụghị ime ihe ọzọ. 5Ma aga m ezi unu onye unu ga-atụ egwu. Tụọnụ egwu Onye ahụ nwere ikike igbu anụ ahụ ma tụbakwa ya nʼọkụ ala mmụọ. E, asị m unu tụọnụ ya egwu. 6Ọ bụghị mkpụrụ ego abụọ ka a na-ere ụmụ nza ise? Ma o nweghị nke ọbụla nʼime ha Chineke chefuru. 7Nʼezie a gụrụ ọ bụladị agịrị isi dị nʼisi unu ọnụ. Unu atụla egwu, nʼihi na unu dị oke ọnụ karịa ọtụtụ ụmụ nza.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike