Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 12 Ọktoba
Kalenda Ọtọdọks · 29 Septemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 12 Ọktoba 2027
Tiuzdee · Izu nke 17 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 7
Mmemme na ndị nsọ
Venerable Kyriakos the Hermit of Palestine († 556)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
19Matakwanụ ugbu a na unu abụkwaghị ndị mba ọzọ na ndị ọbịa. Unu esorola ndị nsọ bụrụ diala na ndị so nʼezinaụlọ Chineke, 20nke a rụkwasara nʼelu ntọala nke ndị ozi na ndị amụma, nke Kraịst Jisọs nʼonwe ya bụ nkume isi ntọala ya. 21Ọ bụkwa nʼime ya ka a na-ejikọta ụlọ ahụ niile nke ọma, na-aba ụba, too bụrụ ụlọnsọ, nʼime Onyenwe anyị. 22Onye a na-ewukọkwa unu onwe unu nʼotu nʼime ya, ka unu niile bụrụ ebe obibi Chineke nʼime Mmụọ. 3:1Ọ bụ nʼihi nke a ka mụ onwe m bụ Pọl bụ onye mkpọrọ nke Jisọs Kraịst maka unu ndị mba ọzọ. 2Nʼihi nʼezie, unu anụla banyere nlekọta nke amara Chineke ahụ nke e nyere m maka ọdịmma unu. 3Otu e si kpughee nzube nzuzo ya niile nye m, dị ka m gwara unu ihe banyere ya nʼokwu dị nta nʼakwụkwọ ozi ahụ m detara unu. 4Ọ bụrụkwa na unu agụọ akwụkwọ ahụ m deere, unu ga-aghọta ihe m maara banyere ihe omimi Kraịst. 5Nke a e meghị ka ụmụ mmadụ mara nʼọgbọ gara aga dị ka Mmụọ Nsọ siri kpugheere ya ndị ozi na ndị amụma ya dị nsọ ugbu a. 6Otu a ka ndị mba ọzọ si soro bụrụ ndị nketa, ndị ga-abụ otu anụ ahụ na ndị ga-eketa nkwa ahụ nʼime Jisọs Kraịst site nʼoziọma. 7E mere m ka m bụrụ onyeozi nke oziọma a, dịka onyinye amara nke Chineke si dị, bụ nke e nyere m site nʼịrụ ọrụ nke ike ya.
Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Sirịakọs Onye bi naanị ya)
22Ma mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ bụ, ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachiobi, na obiọma, na ịdị mma, na ikwesi ntụkwasị obi, 23ịdị nwayọọ, na ijide onwe. Ọ dịkwaghị iwu na-emegide ihe ndị a. 24Ma ndị niile bụ ndị Kraịst Jisọs akpọgidela anụ ahụ ha, ya na ọchịchọ ha nʼelu obe. 25Ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ mmụọ, ka nzọ ụkwụ anyị bụrụ nke mmụọ na-eduzi. 26Ka anyị ghara ịbụ ndị mpako si otu a na-akpali iwe na ekworo nʼetiti anyị. 6:1Ụmụnna m, ọ bụrụ na-anwude onye ọbụla dabara na mmehie, unu onwe unu bụ ndị Mmụọ na-achị kwesiri iji mmụọ nke ịdị nwayọọ na obi dị umeala nyere onye ahụ aka, ime ka ọ gazie nʼezi ụzọ. Ma lezienụ onwe unu anya, onye ọbụla nʼime unu, nʼihi na a pụrụ ịnwakwa unu. 2Na-eburịtanụ nsogbu dịrị ibe unu, ma site nʼotu a ka unu nwee ike debezuo iwu Kraịst.
Oziọma
12Mgbe Jisọs nọ nʼotu obodo, otu nwoke onye ekpenta juru ahụ, bịara daa, kpudo ihu ya nʼala mgbe ọ hụrụ ya, rịọ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” 13Jisọs setịpụrụ aka ya metụ ya sị, “Achọrọ m, bụrụ onye dị ọcha!” Ngwangwa ekpenta ahụ hapụrụ ya. 14O nyere ya iwu, “A gwakwala onye ọbụla, kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị, chụọkwa aja dị ka Mosis nyere nʼiwu maka ime ka ị dị ọcha, ka ọ bụrụ ihe ama nye ha.” 15Ma akụkọ banyere ya gbasara karịa, nke mere na igwe mmadụ bịara ịnụrụ ihe ọ na-ekwu, na ka a gwọọkwa ha nrịa nrịa. 16Ma site nʼoge ruo nʼoge, Jisọs na-ewezuga onwe ya gaa nʼebe ọ ga-anọ naanị ya ikpe ekpere.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 29 Septemba na kalenda nzukọ bụ 12 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike