Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 7 Ọktoba

Kalenda Ọtọdọks · 24 Septemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 7 Ọktoba 2027

Tọọzdee · Izu nke 16 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 6

Mmemme na ndị nsọ

Protomartyr and Equal-to-the-Apostles Thekla (1st C)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Efe 1:1–9

1Akwụkwọ ozi a sitere nʼaka mụ onwe m bụ Pọl, onye Chineke họpụtara ịbụ onyeozi Jisọs Kraịst. Ọ bụ unu ndị nsọ bi nʼEfesọs, unu bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼime Kraịst Jisọs, ka m na-edere ya: 2Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu. 3Ka otuto dịrị Chineke, na Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụ onye gọziri anyị site nʼinye anyị ngọzị niile nke ime mmụọ nke si nʼebe niile nke eluigwe nʼime Kraịst. 4Dịka o si họpụta anyị nʼime Kraịst tupu a tọọ ntọala ụwa, ka anyị bụrụ ndị dị nsọ na ndị na-enweghị ịta ụta nʼihu ya nʼịhụnanya. 5O kpebiri ime anyị ụmụ ya site nʼihi Kraịst Jisọs. Ma o mekwara ihe ndị a niile nʼihi na ọ tọrọ ya ụtọ nʼobi, bụrụkwa ihe o zubere ime. 6Ka e si otu a too ịdị ebube nke amara ya, nke o ji obi ya niile nye anyị nʼime Onye ahụ ọ hụrụ nʼanya. 7Nʼime ya, anyị nwere mgbapụta site nʼọbara ya, bụ mgbaghara nke njehie niile anyị; dị ka ịba ụba nke amara ya si dị, 8nke o mere ka ọ babigara anyị ụba oke site nʼamamihe na nghọta niile. 9O meela ka anyị mata ihe omimi nzube ya, dị ka o si tọọ ya ụtọ, bụ ihe omimi o zubere ime nʼime Kraịst.

Akwụkwọ ozi (maka Fraịdee)

Efe 1:7–17

7Nʼime ya, anyị nwere mgbapụta site nʼọbara ya, bụ mgbaghara nke njehie niile anyị; dị ka ịba ụba nke amara ya si dị, 8nke o mere ka ọ babigara anyị ụba oke site nʼamamihe na nghọta niile. 9O meela ka anyị mata ihe omimi nzube ya, dị ka o si tọọ ya ụtọ, bụ ihe omimi o zubere ime nʼime Kraịst. 10Nke ọ ga-eme ka o mezuo mgbe oge ya niile zuru, nke bụ ịchịkọta ihe niile nʼime ya, bụ ihe ndị dị nʼeluigwe na nʼụwa nʼokpuru Kraịst. 11Nʼime Kraịst ka e mere anyị ndị nketa, ndị e bururị ụzọ họpụta na mbụ, dị ka atụmatụ onye ahụ na-arụpụta ihe niile nʼizuoke nke nzube na ebumnuche ya. 12Nke mere na anyị, ndị buuru ụzọ nwee olileanya na Kraịst, ga-ebi ndụ nʼotuto nke ebube ya. 13Unu bụkwa ndị a gụnyere nʼime Kraịst mgbe unu nụrụ ozi nke eziokwu ahụ bụ oziọma nke nzọpụta. Mgbe unu kwenyere, a kara unu akara nʼime ya bụ akara nke nkwa ahụ bụ Mmụọ Nsọ. 14Nke a bụ ihe nketa anyị tutu ruo mgbe a rụzuru ọrụ mgbapụta nke ndị ahụ niile bụ ihe nweta Chineke. Ka e si otu a too ebube ya. 15Nʼihi nke a, ebe m nụrụ akụkọ banyere okwukwe unu nʼime Onyenwe anyị Jisọs, nụkwa maka ịhụnanya unu nwere nʼebe ndị nsọ niile nọ, 16esepụghị m aka ikele ekele nʼihi unu, mgbe niile m na-echeta unu nʼekpere m niile. 17Ana m arịọ Chineke nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst bụ Nna Onyenwe ebube niile, ka o nye unu Mmụọ amamihe na ezi nghọta ka unu nwee ike matazie nke ọma onye ọ bụ,

Oziọma

Luk 4:16–22

16Mgbe o rutere Nazaret ebe ọ nọrọ too, nʼụbọchị izuike, ọ gara nʼụlọ ekpere dị ka ọ dị mbụ eme. O guzoro ọtọ ịgụ akwụkwọ nsọ. 17E nyere ya akwụkwọ nke onye amụma Aịzaya dere. O meghere ya chọta ebe e dere sị, 18“Mmụọ nke Onyenwe anyị dị nʼahụ m, nʼihi na o teela m mmanụ ka m kwusaa oziọma nye ndị ogbenye. O zitela m ikwupụta inwere onwe nye ndị mkpọrọ, ya na ịhụ ụzọ nye ndị kpuru ìsì, ime ka ndị a na-emegbu emegbu nwere onwe ha. 19Ikwupụta afọ Onyenwe anyị ga-eme amara.” 20O mechiri akwụkwọ ahụ nyeghachi ya onye ahụ na-eje ozi, nọdụ ala. Ndị mmadụ niile nọ nʼụlọ nzukọ ahụ legidere ya nnọọ anya. 21Ma o bidoro ịgwa ha sị, “Taa ka ihe ndị a e dere nʼakwụkwọ nsọ a mezuru na ntị unu.” 22Mmadụ niile kwuru okwu ọma banyere ya nʼihi okwu amara niile si ya nʼọnụ pụta nke mere na ha jụrịtara onwe ha sị, “Onye a, ọ bụghị nwa nwoke Josef?”

Oziọma (maka Fraịdee)

Luk 4:22–30

22Mmadụ niile kwuru okwu ọma banyere ya nʼihi okwu amara niile si ya nʼọnụ pụta nke mere na ha jụrịtara onwe ha sị, “Onye a, ọ bụghị nwa nwoke Josef?” 23Ọ sịrị ha, “Nʼezie, amaara m na unu ga-atụrụ m ilu a: ‘Dibịa, gwọọ onwe gị!’ Sikwa m, ‘Ihe ndị ahụ niile anyị nụrụ ị na-eme na Kapanọm mee ha nʼebe a bụ obodo gị.’ ” 24Ọ gara nʼihu sị, “Ma ị gwa unu eziokwu, o nweghị onye amụma ọbụla a na-anabata nke ọma nʼobodo a mụrụ ya. 25Nʼezie, chetakwanụ na e nwere ọtụtụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ nʼoge Ịlaịja onye amụma. Nʼoge oke ụnwụ dara nʼala ahụ dum, mgbe e mechiri eluigwe na mmiri ezoghị nʼala Izrel afọ atọ na ọnwa isii. 26Ma e zigaghị Ịlaịja ka o jekwuru onye ọbụla nʼime ha karịakwa nwanyị di ya nwụrụ anwụ nʼobodo Zarefat nʼakụkụ Saịdọn. 27Nʼoge Ịlaisha onye amụma, e nwere ọtụtụ ndị ekpenta nʼala Izrel, ma o nweghị onye e mere ka ọ dị ọcha nʼetiti ha karịakwa Neeman onye Siria.” 28Mgbe ndị nọ nʼụlọ ekpere ahụ nụrụ nke a, iwe were ha nke ukwuu. 29Ha biliri, kwapụ ya site nʼobodo ahụ, dọkpụrụ ya gaa nʼelu ugwu nke e wukwasịrị obodo ahụ ka ha nwee ike tụpụ ya site nʼugwu ahụ. 30Ma o sitere nʼetiti igwe mmadụ ahụ pụọ, gawara onwe ya.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 24 Septemba na kalenda nzukọ bụ 7 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike