Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 5 Ọktoba

Kalenda Ọtọdọks · 22 Septemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 5 Ọktoba 2027

Tiuzdee · Izu nke 16 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 6

Mmemme na ndị nsọ

Prophet Jonah (8th C BC)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Gal 5:11–21

11Ụmụnna m, ọ bụrụ nʼezie na m na-ekwusa mkpa obibi ugwu dị, gịnị mere e ji nọgide na-akpagbu m? Ọ bụrụ na m mee otu ahụ, ewepụla m ihe ọdachi ahụ dị nʼobe. 12Ọ gaara atọ m ụtọ ma ọ bụrụ na ndị ahụ na-esogbu unu ga-eme onwe ha ndị onozi. 13Nʼihi na e meela ka unu nwere onwe unu, ụmụnna m, ma unu ekwela ka mnwere onwe unu bụrụ ohere nye anụ ahụ unu, kama werenụ ịhụnanya na-agbara ibe unu odibo. 14Nʼihi na ọ bụrụ na a chịkọta iwu niile nʼotu, ihe iwu niile na-ekwu bụ nke a, “Na-ahụnụ ndị ọzọ nʼanya dịka unu si hụ onwe unu nʼanya.” 15Ọ bụrụ na unu na-akọcha ibe unu, na-eji ọnụ unu na-ekwutọ ha, kpacharanụ anya ka unu hapụ ịla onwe unu nʼiyi. 16Ana m agwa unu nke a: na-adịnụ ndụ nke Mmụọ Nsọ na-achị, unu anọkwala nʼọchịchọ nke anụ ahụ. 17Nʼihi na ihe anụ ahụ chọrọ dị iche nʼihe Mmụọ Nsọ chọrọ. Ihe Mmụọ Nsọ chọrọ dịkwa iche nʼihe anụ ahụ chọrọ. Ịgba mgba dị nʼetiti ha na-eme ka ị hapụ inwe ike mee ihe ị chọrọ ime. 18Ma ọ bụrụ na Mmụọ Nsọ na-edu unu, unu anọkwaghị nʼokpuru iwu. 19Ugbu a, ọrụ nke anụ ahụ pụtara ihe: ịkwa iko, adịghị ọcha na agụụ ịkwa iko. 20Ikpere arụsị, iri amụsụ, ibu iro nʼobi, na ịlụ ọgụ, ekworo na iwe, ịkpa iche iche, nkewa, ịhọ otu. 21Ịkpọ asị, igbu ọchụ, ịṅụbiga mmanya oke, oke oriri na ihe ndị ọzọ yiri ha. Ana m adọ unu aka na ntị dịka m gwara unu nʼoge gara aga, ndị na-eme ihe dị otu a agaghị abanye nʼalaeze Chineke.

Oziọma

Luk 3:23–4:1

23Jisọs agbaala ihe dị ka iri afọ atọ mgbe o bidoro ọrụ ya. Ọ bụ nwa (dịka ndị mmadụ chere) Josef, onye bụ nwa Heli; 24Heli abụrụ nwa Matat, nwa Livayị, nwa Meliki, nwa Janayi, nwa Josef; 25nwa Matatiyas, nwa Emọs, nwa Nehum, nwa Esili, nwa Nagayị; 26nwa Maat, nwa Matatiyas, nwa Semein, nwa Josek, nwa Joda; 27nwa Joanan, nwa Resa, nwa Zerubabel, nwa Shealtiel, nwa Neri; 28nwa Meliki, nwa Adi, nwa Kosam, nwa Elmadam, nwa Er, 29nwa Joshua, nwa Elieza, nwa Jorim, nwa Matat, nwa Livayị; 30nwa Simiọn, nwa Juda, nwa Josef, nwa Jonam, nwa Eliakịm; 31nwa Melea, nwa Mena, nwa Matata, nwa Netan, nwa Devid; 32nwa Jesi, nwa Obed, nwa Boaz, nwa Salmọn, nwa Nashọn; 33nwa Aminadab, nwa Ram, nwa Hezrọn, nwa Perez, nwa Juda; 34nwa Jekọb, nwa Aịzik, nwa Ebraham, nwa Tera, nwa Nahọ; 35nwa Serug, nwa Reu, nwa Peleg, nwa Eba, nwa Shela; 36nwa Kenan, nwa Aafaksad, nwa Shem, nwa Noa, nwa Lamek; 37nwa Metusela, nwa Enọk, nwa Jared, nwa Mahalalel, nwa Kenan; 38nwa Enọsh, nwa Set, nwa Adam, nwa Chineke. 4:1Jisọs, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ, sitere na Jọdan lọta. Mmụọ nsọ duuru ya baa nʼọzara.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 22 Septemba na kalenda nzukọ bụ 5 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike