Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 18 Septemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 18 Septemba 2027
Satọdee · Izu nke 24 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee nke izu nke 24 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ncheta Satọdee nke Nwaagbọghọ Meri Agọziri Agọzi · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
13Nʼihu Chineke, onye na-enye ihe niile ndụ, na nʼihu Kraịst Jisọs onye gbara ama nkwupụta ọma nʼihu Pọntiọs Pailet. Ana m enye gị iwu 14ka i debezuo ihe niile e nyere nʼiwu na-enweghị ntụpọ ọbụla maọbụ ịta ụta ruo mgbe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-apụta ihe. 15Nke a ga-emezu mgbe oge zuru site nʼike ya, Chineke, onye dị ngọzị na onye naanị ya na-achị, Eze kachasị eze niile, na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ niile. 16Onye naanị ya na-adịghị anwụ anwụ. Onye na-ebikwa nʼime ìhè nke mmadụ ọbụla na-apụghị ịbịaru nso. Onye mmadụ ọbụla na-ahụbeghị anya mgbe ọbụla, onye a na-apụghịkwa ịhụ anya. Ọ bụ ya ka nsọpụrụ na ike dịrị ruo mgbe ebighị ebi. Amen.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma maka ikele ekele afọ ojuju. Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile. 2Jiri obi ụtọ fee Onyenwe anyị ofufe; jirinụ ịbụ abụ ọṅụ bịa nʼihu ya 3Matanụ na Onyenwe anyị bụ Chineke. Ọ bụ ya onwe ya kere anyị, ọ bụkwa ya nwe anyị, anyị bụ ndị ya, igwe atụrụ nke ọ na-azụ. 4Jirinụ ekele banye nʼọnụ ụzọ ama ya jiri otuto baa nʼogige ya; keleenụ ya, tookwa aha ya. 5Nʼihi na Onyenwe anyị dị mma, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ruo ọgbọ niile ka ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgidekwa.
Oziọma
4Mgbe oke igwe mmadụ gbakọrọ ha na ndị mmadụ si nʼobodo dị iche iche bịakwute ya. Ọ tụụrụ ha ilu a sị, 5“Ọgha mkpụrụ pụrụ ịkụ mkpụrụ ya, mgbe ọ nọ na-agha mkpụrụ ndị a, ụfọdụ nʼime mkpụrụ ahụ dara nʼakụkụ ụzọ ebe ndị mmadụ zọrọ ha ụkwụ, ụmụ nnụnụ bịakwara tụrịa ha loo. 6Ụfọdụ nʼime ha dakwasịrị nʼelu nkume. Mgbe ha puputara chọọ ito, ha kpọnwụrụ nʼihi na mgbọrọgwụ ha enweghị ike ịmịta mmiri mkpụrụ ahụ ga-eji dị ndụ. 7Ụfọdụ dara nʼetiti ogwu, ogwu ndị a sooro ha puo ma kpagbuo ha. 8Ụfọdụ nʼime mkpụrụ dara nʼezi ala. Ha puputara, too, mịa mkpụrụ dị otu narị nʼọnụọgụgụ.” Mgbe o kwusiri nke a, ọ sịrị ha, “Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.” 9Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya ihe ilu a pụtara. 10Ọ sịrị, “Ọ bụ unu ka e nyere ịmata ihe omimi niile nke alaeze Chineke, ma ndị ọzọ ga-anụ ya naanị nʼilu. Site nʼụzọ dị otu a, “ ‘ha ga na-ele anya, ma ha agaghị ahụ ihe ọbụla. Ha ga na-anụ ntị ma ha agaghị aghọta ihe ọbụla.’ 11“Nke a bụ nkọwa ilu ahụ. Mkpụrụ ahụ bụ okwu Chineke. 12Mkpụrụ dara nʼakụkụ ụzọ nọchiri anya ndị nụrụ okwu Chineke, ma ekwensu bịara napụ ha okwu ahụ nʼobi ha, ka ha ghara ikwere ma nwetakwa nzọpụta. 13Mkpụrụ ndị ahụ dara nʼelu nkume nọchiri anya ndị nụrụ okwu Chineke jiri ọṅụ nabata ya, ma ha enweghị mgbọrọgwụ nʼime ha. Ha na-ekwere naanị nwa oge nta, ma mgbe ọnwụnwa bịara ha na-adachapụ. 14Mkpụrụ nke dara nʼetiti ogwu nọchiri anya ndị nụrụ okwu Chineke, ma mgbe ha na-aga nʼụzọ ha, echiche banyere akụ na ihe ụtọ nke ụwa na-akpagbu okwu ahụ, mee ka ha ghara ịmị mkpụrụ. 15Ma mkpụrụ ndị ahụ dara nʼezi ala nọchiri anya ndị jiri obi ghere oghe na mmụọ ziri ezi nabata okwu ahụ ma werekwa ndidi mịpụta mkpụrụ.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike