Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 15 Septemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 15 Septemba 2027

Wenezdee · Izu nke 24 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Wenezdee nke izu nke 24 nke Oge Nkịtị

Ncheta · Agba ofufe: ọcha

Nne anyị nke Mwute · Ncheta

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

1Tm 3:14–16

14Enwere m olileanya na m ga-abịa ileta gị na mgbe na-adịghị anya, ma ana m edere gị ihe ndị a. 15Asị na m enweghị ike bịa ọsịịsọ, ị ga-amata otu ndị mmadụ kwesiri isi bie obi nʼezinaụlọ Chineke, nke bụ nzukọ nke Chineke dị ndụ, ogidi na ntọala nke eziokwu ahụ. 16Karịchasịa nke a, ọ bụ ihe omimi dị ukwuu, bụ ntọala ebe ezi ịdị nsọ si walite: Ọ pụtara ihe nʼụdịdị mmadụ, Mmụọ Nsọ gosiri na ọ bụ onye ezi omume, ndị mmụọ ozi hụrụ ya, e kwusara ihe banyere ya nye mba niile, ụwa niile kwenyeere na ya, a nabatakwara ya nʼebube nke eluigwe.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 111:1–6

1Toonu Onyenwe anyị! Aga m eji obi m niile jaa Onyenwe anyị mma nʼime nzukọ ndị ụzọ ha ziri ezi na nʼime ọgbakọ ukwuu. 2Ọrụ niile Onyenwe anyị na-arụ dị ukwuu; ndị niile na-enwe mmasị na ha na-atụgharị uche nʼime ha. 3Ọrụ ya jupụtara nʼebube na ịma mma, ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. 4O meela ka e cheta ọrụ ebube ya niile; Onyenwe anyị bụ onye amara na onye ọmịiko. 5Ọ na-egboro ndị na-atụ egwu ya mkpa ihe oriri; ọ na-echetakwa ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi. 6O gosila ndị ya ike nke ọrụ ya niile, site nʼinye ha ala niile nke ndị mba ọzọ.

Oziọma

Jọn 19:25–27

ma ọ bụ: Luk 2:33–35

25Nne ya, nwanne ya nwanyị, bụ Meri nwunye Klopas, na Meri Magdalin guzo nso nʼakụkụ obe Jisọs. 26Mgbe Jisọs hụrụ nne ya na onye na-eso ụzọ ya ọ hụrụ nʼanya ka o guzo nʼakụkụ ya, ọ sịrị nne ya, “Nwanyị lee nwa gị nwoke.” 27Ọ sịrị onye ahụ nke na-eso ụzọ ya, “Lee nne gị.” Site nʼoge ahụ, onye ahụ na-eso ụzọ ya kpọọrọ ya laa nʼụlọ nke ya.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike