Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 8 Septemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 8 Septemba 2027

Wenezdee · Izu nke 23 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Ọmụmụ Nwaagbọghọ Meri Agọziri Agọzi

Mmemme · Agba ofufe: ọcha

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Mai 5:2–5

ma ọ bụ: Rom 8:28–30

2“Ma gị onwe gị, Betlehem Efrata, ọ bụ ezie na ị bụ obodo dị nta nʼetiti ndị ikwu Juda niile, ma onye ahụ ga-achị Izrel ga-esi na gị pụta, bụ onye ahụ mmalite ya sitere na mgbe ochie, sitekwa na mgbe ebighị ebi gara aga.” 3Ya mere, a ga-arara ha nye tutu ruo mgbe onye ahụ ime na-eme mụpụtara nwa ya. Mgbe ahụ, ụmụnna ya niile ahụ fọdụrụ ga-alọghachikwuru ndị Izrel. 4Ọ ga-eguzo zụọ igwe ewu na atụrụ ya, site nʼike nke Onyenwe anyị, na site nʼịdị ukwuu nke aha Onyenwe anyị Chineke ya. Ndị ya ga-anọkwa na-enweghị nsogbu, nʼihi na ịdị ukwuu ya ga-eru na nsọtụ niile nke ụwa. 5Ọ ga-abụkwa udo anyị. Mgbe ndị Asịrịa ga-abata nʼala anyị nʼike, sikwa nʼebe niile e wusiri ike nke anyị na-agafe, anyị ga-ahọpụta ndị ọzụzụ atụrụ asaa, ọ bụladị ndịisi asatọ.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 13:5–6

5Ma atụkwasịrị m obi nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ; mkpụrụobi m na-aṅụrị ọṅụ na nzọpụta gị. 6Aga m abụku Onyenwe anyị abụ, nʼihi na o mesoro m mmeso ọma.

Oziọma

Mat 1:1–16, 18–23

1Nke a bụ ndekọ usoro ọmụmụ Jisọs onye bụ Kraịst, nwa Devid, nwa Ebraham. 2Ebraham mụrụ Aịzik, Aịzik amụọ Jekọb, Jekọb amụọ Juda na ụmụnne ya. 3Juda mụtara Perez na Zera site na Tama, Perez mụrụ Hezrọn, Hezrọn amụọ Aram. 4Aram mụrụ Aminadab, Aminadab mụrụ Nashọn, Nashọn amụọ Salmọn. 5Salmọn bụ nna Boaz, site na nwunye ya Rehab, Boaz mụrụ Obed, site na nwunye ya Rut, Obed amụọ Jesi. 6Jesi amụọ Devid, bụ eze. Devid mụrụ Solomọn site na nwunye ya Ụraya. 7Solomọn mụrụ Rehoboam, Rehoboam amụọ Abija, Abija amụọ Esa. 8Esa mụrụ Jehoshafat, Jehoshafat amụọ Joram, Joram amụọ Ụzaịa. 9Ụzaịa mụrụ Jotam, Jọtam amụọ Ehaz, Ehaz amụọ Hezekaya. 10Hezekaya mụrụ Manase, Manase amụọ Emọn, Emọn amụọ Josaya. 11Mgbe e mere ka ha gaa biri nʼala Babilọn ka Josaya mụrụ Jekonaya na ụmụnne ya. 12Mgbe ha si Babilọn lọta Jekonaya mụrụ Shealtiel, Shealtiel amụọ Zerubabel. 13Zerubabel mụrụ Abiud, Abiud amụọ Eliakịm, Eliakịm amụọ Azoa. 14Azoa mụrụ Zadọk, Zadọk amụọ Akịm, Akịm amụọ Eliud. 15Eliud mụrụ Elieza, Elieza amụọ Matan, Matan amụọ Jekọb. 16Jekọb mụrụ Josef onye bụ di Meri nne Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst. 18Otu a ka ọmụmụ Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst siri dị: Nne ya Meri bụ onye e kwenyere na ọ ga-alụ Josef, ma tupu ha ebikọọ ọnụ a chọpụtara na Meri di ime site na Mmụọ Nsọ. 19Ma Josef di ya bụ onye ezi omume, ọ chọghị imenye ya ihere, nʼihi ya, o zubere ịchụ ya na nzuzo. 20Mgbe Josef nwechara mkpebi a, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere ya na nrọ sị ya, “Josef nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye gị, nʼihi na nwa ahụ ọ dị ime ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ. 21Ọ ga-amụkwa nwa nwoke, onye ị ga-akpọ aha ya Jisọs, nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nke ya site na mmehie ha.” 22Ihe ndị a mere iji mezuo ihe ahụ Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onye amụma ya sị, 23“Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ha ga-akpọ aha ya Ịmanụel” (nke bụ ma asụgharịa ya, “Chineke nọnyeere anyị”).

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike