Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 7 Septemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 7 Septemba 2027
Tiuzdee · Izu nke 23 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Tiuzdee nke izu nke 23 nke Oge Nkịtị
Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
6Ya mere, dị ka unu si nabata Kraịst Jisọs Onyenwe anyị, na-ebinụ ndụ unu nʼime ya. 7Bụrụnụ ndị mgbọrọgwụ ha mibanyere nʼime ya, ndị a na-ewuli elu nʼime ya, ndị dị ike nʼime okwukwe, dị ka e si kuziere unu, ndị jupụtara na-inye ekele. 8Lezienụ anya ka onye ọbụla ghara iji ozizi na amamihe efu niile nke na-achị ụwa, na aghụghọ duhie unu nʼokwukwe. Okwu amamihe ahụ nke ihe ozizi ya na ọsịsa ya niile dabeere na mmụọ nke ụwa na ntụpụta mmadụ kama ịdabere nʼihe Kraịst kwuru. 9Nʼihi na nʼime Kraịst ka izuoke niile nke Chineke bi nʼụdịdị mmadụ. 10Ya mere, unu nwere ihe niile nʼime ya, onye bụ isi ndị niile na-achị achị, onye bụkwa isi nʼebe ike na ịchị isi niile dị. 11Nʼime ya, e biri unu ugwu nke ejighị aka bie, site nʼiwepụ ọdịdị anụ ahụ nʼobibi ugwu nke Kraịst biri. 12Mgbe e likọtara unu na ya na baptizim, e sitere nʼọnwụ kpọlite unu na ya site nʼokwukwe ahụ dị nʼike Chineke onye sitere nʼọnwụ kpọlite ya. 13Mgbe unu bụ ndị nwụrụ anwụ nʼime mmehie unu, na nʼime ebighị ugwu nke anụ ahụ mmehie unu, Chineke mere ka unu soro Kraịst dịrị ndụ ọzọ. Ọ gbaghara anyị mmehie anyị niile, 14kagbuo iwu niile e dere ede, ya na usoro ya niile nke guzoro imegide anyị. O wezugara ha, kpọgide ha nʼobe. 15Mgbe ọ napụrụ ike niile, na ịchị isi niile, ngwa agha ha niile, ọ gbara ha ọtọ nʼihu ọha, igosi mmeri o meriri ha nʼobe.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma otuto, nke Devid. Aga m ebuli gị elu, Chineke m onye bụ eze; aga m eto aha gị, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. 2Ụbọchị niile ka m ga-eto gị jaakwa aha gị mma site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. 8Onyenwe anyị na-eme amara nweekwa obi ọmịiko, ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ, ọ bara ụba nʼịhụnanya. 9Onyenwe anyị dị mma nʼebe mmadụ niile dị; o nwere ọmịiko nʼebe ihe niile o kere eke dị. 10O Onyenwe anyị, ihe niile i kere eke ga-eto gị; ndị nsọ gị na-aja gị mma. 11Ha ga-ekwupụta banyere ebube nke alaeze gị. Kwupụtakwa maka ịdị ike gị,
Oziọma
12Nʼụbọchị ndị ahụ, ọ gara rigoro nʼelu ugwu ikpe ekpere. Ọ nọrọ abalị ahụ niile na-ekpe ekpere nye Chineke. 13Mgbe chi bọrọ, ọ kpọrọ ndị niile na-eso ụzọ ya, site nʼime ha họrọ mmadụ iri na abụọ ndị ọ kpọrọ ndị ozi ya. 14Saimọn (onye ọ kpọrọ Pita) na Andru nwanne ya, Jemis Jọn, Filip Batalomi. 15Matiu Tọmọs, Jemis nwa Alfiọs, Saimọn onye a na-akpọ Zilọt. 16Judas nwa Jemis na Judas Iskarịọt onye raara ya nye. 17Ya na ha rịdatara ga nʼebe ala dị larịị. Igwe ndị na-eso ụzọ ya na oke igwe mmadụ sitere na Judịa, na Jerusalem nakwa obodo dị na nsọtụ mmiri nke Taịa na Saịdọn. 18Ndị bịara ịnụrụ okwu ya na ka a gwọọ ha ọrịa ha. A gwọkwara ọtụtụ ndị mmụọ na-adịghị ọcha na-esogbu. 19Igwe mmadụ ahụ gbalịrị ịmetụ ya aka, nʼihi na ike dị ukwuu si ya nʼahụ na-apụ na-agwọ ha niile.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike