Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 7 Septemba
Kalenda Ọtọdọks · 25 Ọgọst (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 7 Septemba 2027
Tiuzdee · Izu nke 12 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 2
Mmemme na ndị nsọ
Return of the relics of the Apostle Bartholomew from Anastasiopolis to Lipari (6th C)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
15Ọ nwụrụ nʼihi mmadụ niile, ka ndị dị ndụ gharakwa ịdịrị onwe ha ndụ ọzọ, kama maka onye ahụ nwụrụ nʼihi ha ma sikwa nʼọnwụ kulie. 16Bido ugbu a gawa, anyị adịghị elekwa onye ọbụla anya dịka mmadụ nkịtị. Nʼihi na anyị sitere nʼụzọ dị otu a lee Kraịst anya, chee na ọ bụ mmadụ efu. Ma ugbu a, anyị amakwaghị ya nʼụzọ dị otu a. 17Ya mere, ọ bụrụ na onye ọbụla amalite ịdị ndụ nʼime Kraịst, ọ ghọọla onye e kere ọhụrụ, ihe ochie agaala, nke ọhụrụ anọchie. 18Ma ọ bụ Chineke bụ onye na-eme ihe ndị a. Ọ bụ ya onwe ya sitere nʼaka Kraịst mee ka anyị na ya dịrị nʼudo. Ma ugbu a, o nyela anyị ọrụ ije ozi, ịkpọ ndị ọzọ ka ha bịa ka ya na ha dịrịkwa nʼudo. 19Ihe nke a pụtara bụ na Chineke sitere na Kraịst na-eme ka ya na ụwa dị na mma. Ọ dịghị agụkọrọ ụmụ mmadụ mmehie niile, kama o tinyela nʼaka anyị ozi banyere ụzọ o si eme ka ya na ụmụ mmadụ dịkwa na mma ọzọ. 20Ya mere, anyị bụ ndị na-anọchi anya Kraịst ijere ya ozi nʼụwa. Chineke ji anyị na-agwa unu okwu. Anyị na-arịọ unu dịka ọ bụ Kraịst nʼonwe ya na-arịọ unu. Biko, bịanụ ka unu na Chineke dịrị nʼudo. 21Nʼihi na o mere ka onye ahụ na-amaghị mmehie bụrụ mmehie nʼọnọdụ anyị, ka esi otu a mee ka anyị nwee oke nʼime ezi omume Chineke site na ya.
Oziọma
16Mgbe Jisọs na-aga nʼakụkụ osimiri Galili, ọ hụrụ Saimọn na Andru nwanne ya, ka ha na-awụnye ụgbụ ha nʼime mmiri nʼihi na ha bụ ndị ọkụ azụ. 17Jisọs siri ha, “Bịanụ soro m, m ga-emekwa unu ndị ọkụ na-akụta mmadụ.” 18Ngwangwa ha hapụrụ ụgbụ azụ ha ma soro ya. 19Mgbe ọ gatụrụ nʼihu nke nta, ọ hụrụ Jemis nwa Zebedi na nwanne ya bụ Jọn ndị nọ nʼime ụgbọ mmiri, na-ekezi ụgbụ azụ ha. 20Ngwangwa, ọ kpọrọ ha, ha hapụrụ nna ha Zebedi na ndị o goro ọrụ nʼime ụgbọ soro ya. 21Ha gara Kapanọm, mgbe ụbọchị izuike ruru, ọ bara nʼime ụlọ ekpere ma malite izi ha ihe. 22Ozizi ya juru ha anya nke ukwuu, nʼihi na o ziri ha ihe dịka onye nwere ikike, ọ bụghị dị ka nke ndị ozizi iwu.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 25 Ọgọọst na kalenda nzukọ bụ 7 Septemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike