Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 6 Septemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 6 Septemba 2027
Mọnde · Izu nke 23 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Mọnde nke izu nke 23 nke Oge Nkịtị
Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
24Ugbu a, ana m aṅụrị ọṅụ nʼihi ahụhụ ndị a nke m na-ahụ nʼihi unu, ana m emezu ihe fọdụrụ nʼahụhụ ahụ Kraịst tara nʼihi anụ ahụ ya bụ chọọchị. 25Emeela ka m bụrụ onyeozi chọọchị ya site nʼikike Chineke nyere m, ikwusara unu okwu Chineke nʼozuzu oke ya. 26Nke bụ ihe omimi ahụ, nke e zoro ezo site nʼoge ahụ nakwa ọgbọ niile ndị a gara aga, ma ugbu a e mekwara ka ọ pụta ìhè nye ndị nsọ Chineke. 27Ọ bụ ha ka Chineke họpụtara ime ka amata akụ nke ebube nke ihe omimi a nʼetiti ndị mba ọzọ, nke bụ Kraịst nʼime unu, onye bụ olileanya nke ebube ahụ. 28Ọ bụ ya ka anyị na-ekwusa, na-adụ onye ọbụla ọdụ, na-akụzikwara onye ọbụla ihe site nʼamamihe niile. Nʼihi na anyị chọrọ iche mmadụ niile ọbụla nʼihu ya dị ka ndị zuruoke nʼime Kraịst. 29Nʼihi nke a ka m na-adọgbu onwe m nʼọrụ, dị ka ike ya dị ukwuu nke na-arụ ọrụ si dị m nʼime. 2:1Ọ bụ ọchịchọ m ka unu ghọta otu m si na-agbasi mgba ike nke ukwuu nʼihi unu, na nʼihi ndị nọ nʼobodo Laodisia, na ndị niile na-enwebeghị ike ịhụ m ihu na ihu. 2Ebumnobi m bụ ka a gbaa ha ume, jikọọkwa ha nʼotu nʼịhụnanya, ka ha nweta ụba niile nke nghọta zuruoke na amamihe nke ihe omimi Chineke ahụ bụ Kraịst nʼonwe ya. 3Ọ bụkwa nʼime ya ka ụlọakụ ihe zoro ezo niile nke amamihe na ihe ọmụma dị.
Abụ Ọma nzaghachi
5O mkpụrụobi m, chọta ezumike naanị nʼime Chineke; olileanya m na-esite na ya na-abịa. 6Naanị ya bụ oke nkume m, na onye nzọpụta m. Naanị ya kwa bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m. 8Tụkwasịnụ ya obi mgbe niile, unu ndị mmadụ; kwupụtaranụ ya obi unu, nʼihi na Chineke bụ ebe mgbaba anyị. Sela
Oziọma
6Nʼụbọchị izuike ọzọ, ọ banyere nʼụlọ ekpere na-ezi ihe. Otu nwoke nọkwa nʼebe ahụ onye aka nri ya kpọnwụrụ akpọnwụ. 7Ndị Farisii na ndị ode akwụkwọ na-achọ ụzọ ha ga-esi boo ya ebubo, ya mere ha lekwasịrị ya anya ịhụ ma ọ ga-agwọ ọrịa nʼụbọchị izuike. 8Ma ebe ọ maara ihe ha na-ezube nʼobi ha, ọ kpọrọ nwoke ahụ nke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ sị ya, “Bilie bịa guzoro nʼetiti ebe a.” Nwoke ahụ pụtara bịa guzoro ebe ahụ. 9Mgbe ahụ Jisọs sịrị ha, “Ka m jụọ unu, gịnị ziri ezi nʼiwu ime nʼụbọchị izuike; ọ bụ ime ihe ọma ka ọ bụ ime ihe ọjọọ; ịzọpụta ndụ ka ọ bụ ịla ndụ nʼiyi?” 10Mgbe o lesiri ha niile anya gburugburu, ọ sịrị ya, “Setịpụ aka gị.” O mere nke a, aka ya dịkwara mma ọzọ. 11Ha were iwe nke ukwuu ma malite na-ekwurịtara nʼetiti onwe ha ihe ha nwere ike ime Jisọs.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike