Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 6 Septemba

Kalenda Ọtọdọks · 24 Ọgọst (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 6 Septemba 2027

Mọnde · Izu nke 12 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 2

Mmemme na ndị nsọ

Hieromartyr Eutychius, disciple of the Apostle John the Theologian (1st C)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

2Kọ 5:10–15

10Nʼihi na anyị niile ga-eguzo nʼihu oche ikpe Kraịst, mgbe ahụ onye ọbụla nʼime anyị, nʼotu nʼotu, ga-anata ụgwọ ọrụ dịka ihe ọ rụrụ na-anụ ahụ ya mgbe ọ nọ nʼime ụwa si dị, maọbụ ezi ihe maọbụ ihe ọjọọ. 11Ọ bụ nʼihi na anyị maara nnọọ ihe ịtụ egwu Onyenwe anyị pụtara, ka anyị ji na-arụsị ọrụ ike ka ndị mmadụ mata Chineke makwaara ụdị mmadụ anyị bụ. Enwekwara m olileanya na nke a pụtara ihe nye akọnuche unu. 12Anyị adịghị agbalị ịgwa unu na anyị dị mma, kama anyị chọrọ inye unu ihe unu ga-eji nyaa isi mgbe unu na-ekwu ihe banyere anyị, ka unu nwee ike ịmata ihe unu ga-azaghachi ndị ahụ na-anya isi banyere ihe ha ji anya ha hụ, kama ihe dị mmadụ nʼobi. 13Ọ bụrụ na anyị amaghị onwe anyị, ọ bụ nʼihi Chineke, ọ bụrụ na anyị nwere uche zuruoke, ọ bụ nʼihi unu. 14Ọ bụ ịhụnanya Kraịst na-akwagide anyị, nʼihi na anyị kwere na otu onye nwụrụ maka mmadụ niile, nke pụtara na mmadụ niile anwụọla. 15Ọ nwụrụ nʼihi mmadụ niile, ka ndị dị ndụ gharakwa ịdịrị onwe ha ndụ ọzọ, kama maka onye ahụ nwụrụ nʼihi ha ma sikwa nʼọnwụ kulie.

Oziọma

Mak 1:9–15

9Nʼoge ahụ, Jisọs sitere na Nazaret nke Galili bịa nʼosimiri Jọdan, ebe Jọn mere ya baptizim. 10Ma mgbe o si nʼime mmiri ahụ na-apụta, ọ hụrụ ka eluigwe meghere. Hụkwa Mmụọ Nsọ dị ka nduru ka ọ rịdatara bekwasị ya nʼisi ya. 11Otu olu si nʼeluigwe daa, “Ị bụ Ọkpara m hụrụ nʼanya, ihe gị dị m ezi mma.” 12Ngwangwa, Mmụọ Nsọ duuru ya baa nʼime ọzara. 13Ọ nọkwara nʼime ọzara ahụ iri ụbọchị anọ, ebe ekwensu nwara ya ọnwụnwa. Ya na ụmụ anụ ọhịa nọkwa. Ma ndị mmụọ ozi jeere ya ozi. 14Mgbe e tinyesịrị Jọn nʼụlọ mkpọrọ, Jisọs gara na Galili, na-ekwusa oziọma Chineke. 15Ọ sịrị, “Oge ahụ eruola, alaeze Chineke dị nso. Chegharịanụ ma kwerekwanụ nʼoziọma.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 24 Ọgọọst na kalenda nzukọ bụ 6 Septemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike