Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 5 Septemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 5 Septemba 2027
Sọnde · Izu nke 23 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 23 nke Oge Nkịtị
Sọnde · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
4Gwanụ ndị ahụ na-atụ egwu sị ha, “Dịrịnụ ike, unu atụla egwu, nʼihi na Chineke unu na-abịa. Ọ ga-abịa ịbọtara unu ọbọ, ịkwụghachi ndị iro unu ihe ruuru ha. Ọ ga-abịa ịzọpụta unu.” 5Mgbe ọ bịara, ọ ga-emeghe anya ndị kpuru ìsì, meekwa ka ndị ntị chiri nụ ihe. 6Ọ ga-eme ka onye ngwụrọ wulie elu dịka ele, meekwa ka ndị na-adịghị ekwu okwu tie mkpu ọṅụ. Mmiri ga-agbawapụta sọọ nʼọzara, mmiri iyi ga-ejupụtakwa nʼala kpọrọ nkụ. 7Elu ala ahụ na-ere ọkụ nʼụkwụ ga-aghọ ọdọ mmiri. Ala ahụ nke mmiri kọrọ ga-aghọ isi iyi nke mmiri ga-ejupụta. Ebe ahụ nkịta ọhịa naara ebi ga-aghọ ala mmiri mmiri; ahịhịa, na ahịhịa riidi, na ahịhịa papịrọs, ga-epupụta nʼime ya.
Abụ Ọma nzaghachi
7Ọ na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-akpagbu na-enyekwa ndị agụụ na-agụ nri. Onyenwe anyị na-eme ka ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ nwere onwe ha, 8Onyenwe anyị na-emeghe anya ndị kpuru ìsì, Onyenwe anyị na-akwagide ndị niile dara mba, Onyenwe anyị hụrụ ndị ezi omume niile nʼanya. 9Onyenwe anyị na-echebe ndị ọbịa, na-elekọtakwa ndị na-enweghị nna na ndị di ha nwụrụ anwụ, ma ọ na-eme ka ihe ghara ịgara ndị ajọ omume nke ọma. 10Onyenwe anyị na-achị ruo ebighị ebi, Chineke gị, o Zayọn, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Toonu Onyenwe anyị.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
1Ụmụnna m, dịka ndị kweere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye dị ebube, ka unu hapụ ile mmadụ anya nʼihu. 2Ọ bụrụ na onye ọgaranya yi uwe mara mma, yikwara mgbaaka ọlaedo na mkpịsịaka ya, abata nʼụlọ nzukọ unu, ọ bụrụkwa na nwa ogbenye abata nke yi uwe na-adịghị ọcha, 3ọ bụrụ na unu elee onye ọgaranya ahụ yi uwe mara mma anya sị ya, “Bịa nọdụ nʼotu oche a e debere iche nʼihi gị,” ma unu asị onye ogbenye ahụ, “Di anyị, guzo nʼebe ahụ,” maọbụ “Bịa nọdụ ala nʼakụkụ ebe a ụkwụ m dị,” 4ọ bụ na unu akpabeghị oke nʼetiti onwe unu, bụrụkwa ndị ji ile anya nʼihu na obi ọjọọ na-ekpe ikpe? 5Geenụ ntị ka m gwa unu ụmụnna m, ọ bụ na unu amataghị na Chineke ahọpụtala ndị ahụ ụwa gụrụ dịka ndị ogbenye, mee ka ha bụrụ ọgaranya site nʼokwukwe ha, ka ha ketakwa alaeze ahụ o kwere nkwa inye ndị hụrụ ya nʼanya?
Oziọma
31Emesịa, ọ hapụrụ akụkụ Taịa gabiga Saịdọn bịaruo nʼosimiri Galili ruo nʼobodo ndị dị na Dekapọlịs. 32Ha duteere ya otu nwoke ntị chịrị, nke na-asụkwa oke nsụ. Ha rịọrọ ya ka o bikwasị ya aka. 33O duuru ya pụọ nʼebe igwe mmadụ ahụ nọ, rụnye ya mkpịsịaka nʼime ntị ya abụọ. Mgbe ahụ ọ gbụpụkwara ọnụ mmiri metụkwa ya aka nʼire. 34O leliri anya nʼeluigwe sụọ ude sị ya, “Ef fata,” nke pụtara “Meghee!” 35Ngwangwa, ntị ya meghere, a tọpụkwara ire ya, ọ malite ikwu okwu nke ọma. 36Jisọs nyere ha iwu ka ha ghara ịgwa onye ọbụla, ma mgbe ọ na-eme nke a ha gara nʼihu na-akọsa ya ebe niile. 37Ọ tụrụ ha nʼanya nke ukwuu, ha kwuo sị, “O meela ihe niile nke ọma. Ọ na-eme ka ọ bụladị ndị ntị chiri nụ ihe, ma mee ka ndị ogbi kwuo okwu.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Teresa nke Calcutta, Nwaagbọghọ
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike