Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 4 Septemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 4 Septemba 2027
Satọdee · Izu nke 22 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee nke izu nke 22 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ncheta Satọdee nke Nwaagbọghọ Meri Agọziri Agọzi · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
21Unu onwe unu bụ ndị e mere ndị mba ọzọ site nʼebe Chineke nọ, na ndị iro nʼuche unu nʼihi ajọ omume niile unu. 22Ma ugbu a, o kpezierela unu site na-anụ ahụ Kraịst, sitekwa nʼọnwụ ya, iji chee unu nʼihu ya dịka ndị dị nsọ, na ndị na-enweghị ịta ụta, na ihe ebubo ọbụla megide ha. 23Ma ọ bụrụ na unu anọgide nʼokwukwe unu, bụrụ ndị gbara mgbọrọgwụ, ndị guzosiri ike, ndị na-ewezugaghị onwe ha site nʼolileanya ahụ dịrị unu nʼoziọma ahụ. Nke a bụ oziọma ahụ unu nụrụ, nke ekwusakwara nye ihe niile e kere eke nʼokpuru eluigwe, nke e mere mụ onwe m bụ Pọl, onyeozi ya.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma Devid. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ maskil Devid. Mgbe ndị Zif gara sị Sọl, “Devid ọ dịghị ezo nʼetiti anyị?” O Chineke, jiri aha gị zọpụta m; jirikwa ike gị kpepụta m. 2O Chineke, nụrụ ekpere m; gee ntị nʼokwu ọnụ m. 4Nʼezie, Chineke bụ onye inyeaka m; onyenwe m bụ onye na-agba m ume. 6Aga m eji onyinye afọ ofufu chụọrọ gị aja; O Onyenwe anyị, aga m eto aha gị, nʼihi na ọ dị mma.
Oziọma
1Nʼotu ụbọchị izuike, mgbe Jisọs na-agafe nʼubi a kụrụ ọka. Ndị na-eso ụzọ ya malitere ịghọrọ ụfọdụ nʼime ogbe ọka ndị ahụ, na-amazu ha nʼaka, ma na-ata ha. 2Ụfọdụ ndị Farisii sịrị, “Gịnị mere unu ji na-eme ihe megidere iwu nʼụbọchị izuike?” 3Jisọs zara ha sị, “Ọ bụ na unu agụtaghị ihe Devid mere mgbe agụụ gụrụ ya na ndị so ya? 4Otu o si banye nʼụlọ Chineke, were achịcha a na-eche nʼihu ya, nyetụkwa ndị ya na ha so, achịcha nke onye ọbụla na-ekwesighị ịta ma ọ bụghị naanị ndị nchụaja.” 5Mgbe ahụ ọ gwara ha sị, “Nwa nke Mmadụ bụ Onyenwe Ụbọchị Izuike.”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike