Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 4 Septemba
Kalenda Ọtọdọks · 22 Ọgọst (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 4 Septemba 2027
Satọdee · Izu nke 11 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 1
Mmemme na ndị nsọ
Afterfeast of the Dormition
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
3Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu. 4Ana m ekele Chineke ekele nʼihi onyinye amara niile o nyere unu site na Kraịst Jisọs. 5Nʼihi na e emeela ka unu baa ụba nʼụzọ niile, nʼime ya, ma nʼokwu unu ma na nghọta unu. O meekwala ka unu nwee nghọta zuru ezu banyere eziokwu niile. Ọ na-emekwa ka unu nwee ike na-ekwupụta okwu banyere oziọma ya. 6Nʼihi na ịgba akaebe banyere Kraịst pụtara ihe, guzosiekwa ike na ndụ unu. 7Otu ihe si dị, ọ dịghị onyinye mmụọ fọdụrụ unu nke unu na-enweghị, ka unu nọrọ na-eche mgbe Chineke ga-egosipụta Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. 8Ọ ga-eme ka unu dị ike ruo na mgbe ikpeazụ, meekwa ka unu bụrụ ndị na-enweghị ịta ụta nʼụbọchị Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. 9Chineke, onye kpọbatara unu ka unu na Ọkpara ya bụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, na-enwe mmekọrịta kwesiri ntụkwasị obi.
Oziọma
3Ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere ya i nwalee ya, sị, “O ziri ezi nʼiwu na nwoke ga-agbara nwunye ya alụkwaghị m nʼihi ihe ọbụla?” 4Ọ zara ha sị, “Ọ bụ na unu agụtabeghị na akwụkwọ nsọ, na Onye kere ha na mbụ kere ha nwoke na nwanyị. 5Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne ya na nna ya e jikọta ya na nwunye ya. Ha abụọ ga-abụkwa otu anụ ahụ. 6Ya mere, ha abụkwaghị mmadụ abụọ ọzọ, kama otu anụ ahụ. Ya mere, ihe Chineke jikọtara, ka mmadụ ọbụla atọsala ya.” 7Ha jụrụ ya sị, “Gịnị mekwaranụ Mosis ji nye iwu si na nwoke ọbụla nwere ohere ide akwụkwọ alụkwaghị m nye nwunye ya?” 8Ọ zara ha sị ha, “Ọ bụ nʼihi na unu bụ ndị mkpọchi obi, ya mere Mosis jiri hapụ unu ka unu gbaa nwunye unu alụkwaghị m; ma ọ dịghị otu a site na mbụ. 9Ma ana m asị unu, onye ọbụla ga-ahapụ nwunye ya lụrụ onye ọzọ, ma ọ bụghị nʼihi na o jidere nwunye ya na mmehie ịkwa iko, onye ahụ emeela mmehie ịkwa iko ma ọ lụọ nwanyị ọzọ.” 10Ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ ka mma na mmadụ alụghị nwunye ma ọlị.” 11Ma ọ zara sị ha, “Ọ bụghị mmadụ niile ga-anagide okwu a. Naanị ndị e nyere ike ime ya ga-anagide ya. 12Ma ụfọdụ ndị mmadụ ka a mụrụ ka ha bụrụ onozi, ndị ọzọ bụkwa ndị mmadụ ibe ha mere otu a. Ndị ọzọ dịkwa ndị jiri aka ha họrọ ibu onozi nʼihi alaeze eluigwe. Onye pụrụ ịnara nke a, ya nara ya.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 22 Ọgọọst na kalenda nzukọ bụ 4 Septemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike