Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 3 Septemba
Kalenda Ọtọdọks · 21 Ọgọst (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 3 Septemba 2027
Fraịdee · Izu nke 11 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 1
Mmemme na ndị nsọ
Afterfeast of the Dormition
Ụbọchị obubu ọnụ
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
13Ebe ọ bụ na anyị nwere otu mmụọ nke okwukwe ahụ, dịka e si dee nʼakwụkwọ nsọ, “Ekweere m, ya mere m ji kwuo.” Anyị onwe anyị kwekwara, nʼihi nke a mere anyị ji na-ekwu, 14ma anyị maara na onye mere ka Onyenwe anyị Jisọs si nʼọnwụ bilie, ga-emekwa ka anyị soro Jisọs si nʼọnwụ bilie, ma kpọbatakwa anyị na unu nʼihu ya. 15Ihe ndị a niile bụ maka nʼihi unu, ka ọ ga-abụ amara na-abawanye irute ọtụtụ mmadụ aka, ka o nwee ike na-abawanye inye ekele maka otuto nke Chineke. 16Ọ bụ nke a mere ike adịghị agwụ anyị nʼobi. Ọ bụ ezie na anụ ahụ anyị na-anwụ anwụ, ma a na-agba mmụọ anyị ume kwa ụbọchị. 17Nwantịntị ahụhụ nke anyị na-ata ugbu a, nke na-adị nwa oge, na-akwadoro anyị otuto ebighị ebi dị ukwuu. 18Nʼihi na anyị adịghị ele ihe anya nwere ike ịhụ, kama anyị na-ele anya nʼihe ahụ anya na-adịghị ahụ. Nʼihi na ihe ahụ anya na-ahụ na-adị naanị nwa oge, ma ihe ahụ anya na-adịghị ahụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi.
Oziọma
27Nʼihi na ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị ka amụma na-egbu nʼọwụwa anyanwụ nke a na-ahụ anya nʼọdịda anyanwụ. 28Matakwanụ na ebe ọbụla ozu dị, nʼebe ahụ ka udele na-ezukọta. 29“Ngwangwa mgbe mkpagbu nke ụbọchị ndị ahụ niile gabigasịrị, “ ‘anyanwụ ga-agba ọchịchịrị. Ọnwa agaghị enyekwa ìhè, kpakpando ga-esi na mbara eluigwe daa, ike niile nke eluigwe ga-ama jijiji.’ 30“Nʼoge ahụ akara ngosi nke Nwa nke Mmadụ ga-apụta ihe na mbara eluigwe. Agbụrụ niile nke ụwa ga-anọkwa na-eru ụjụ. Ha ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼigwe ojii, nʼike nakwa oke ebube. 31Ọ ga-ewerekwa olu opi ike zipụ ndị mmụọ ozi ka ha gaa kpọkọtaa ndị niile a họpụtara site nʼakụkụ anọ niile nke eluigwe na ụwa. 32“Ugbu a mụtanụ ihe site nʼosisi fiig. Mgbe ọbụla alaka ya malitere iwepụta ome dị nro, na-epupụtakwa akwụkwọ ndụ maranụ na ọkọchị na-abịa nso. 33Otu a kwa, mgbe unu na-ahụ ihe ndị a niile ka ha na-eme marakwanụ na ọ nọ nso, ọ bụladị nʼọnụ ụzọ unu. 42“Nʼihi nke a, na-echenụ nche, nʼihi na unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa. 43Ma ghọtanụ nke a: Ọ bụrụ na nna nwe ụlọ mara oge onye ohi ga-abịa nʼụlọ ya nʼabalị, ọ ga-anọ na nche nʼoge ahụ. Ọ gaghị ekwe ka onye ohi kụwaa ụlọ ya. 44Otu a ka unu onwe unu pụrụ isi nọgide na nche oge niile, nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼoge awa unu na-atụghị anya ya. 45“Onye bụ ohu ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi ma nwekwa uche, nke onyenwe ya mere onyeisi ndị ohu nọ nʼezinaụlọ ya, ka ọ na-enye ha nri nʼoge ya? 46Ngọzị na-adịrị ohu ahụ, onye, mgbe onyenwe ya ga-alọghachi hụ na ọ na-eme otu a. 47Nʼezie asị m unu, ọ ga-eme ya onyeisi nke ihe niile o nwere. 48Ma ọ bụrụ na ohu ahụ bụ onye ajọọ omume na-asị onwe ya, ‘Nna m ukwu anọọla ogologo oge,’ 49ọ bụrụkwa na o bido iti ndị ohu ibe ya ihe, sorokwa ndị ọṅụ oke mmanya na-eri, na-aṅụ. 50Nna ukwu ohu ahụ ga-alọta nʼụbọchị ọ na-atụghị anya, nʼoge awa ọ na-amakwaghị. 51Ọ ga-egburisikwa ya, nye ya ọnọdụ nʼetiti ebe ndị ihu abụọ nọ. Ebe e nwere ịkwa akwa na ịta ikikere eze.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 21 Ọgọọst na kalenda nzukọ bụ 3 Septemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike