Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 1 Septemba
Kalenda Ọtọdọks · 19 Ọgọst (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 1 Septemba 2027
Wenezdee · Izu nke 11 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 1
Mmemme na ndị nsọ
Afterfeast of the Dormition
Ụbọchị obubu ọnụ
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
4Nke a bụ ntụkwasị obi anyị nwere site na Kraịst nʼebe Chineke nọ. 5Ọ dịkwaghị mgbe anyị ji chee nʼime onwe anyị, na anyị nwere ike ime ihe ọbụla bara uru site nʼike aka anyị, kama ihe ọbụla anyị nwere, ihe ọbụla anyị rụpụtara, sitere nʼaka Chineke. 6Onye mere ka anyị zuo oke ịbụ ndị ozi ya nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, nke edeghị nʼakwụkwọ iwu kama nʼime Mmụọ. Ihe e dere nʼakwụkwọ iwu na-eweta ọnwụ, ma Mmụọ na-enye ha ndụ. 7Ma ọ bụrụ nʼije ozi ahụ nke na-eweta ọnwụ bụ nke e gbunyere nʼelu nkume ji ebube dị ukwuu bịa, nke mere na ụmụ Izrel apụghị ilegide Mosis anya nʼihu mgbe o si nʼelu ugwu Saịnaị rịdata nʼihi ebube nke ihu ya, bụ ebube nke na-agabiga agabiga, 8ọ bụ nʼije ozi nke Mmụọ nsọ agaghị adị ebube karịa? 9Ọ bụrụ na-enwere ebube nʼime ije ozi nke amamikpe, ije ozi nke ezi omume ga-adị ebube karịa ya. 10Nʼezie, ihe jupụtara nʼebube mgbe ochie enwekwaghị ebube ọbụla ugbu a, nʼihi na ebube nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ekpuchiela ya. 11Ọ bụrụ na ihe na-agafe agafe nwere ebube dị otu a, ihe ga-anọgide mgbe niile ga-enwe ebube karịa ya.
Oziọma
29“E, ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-ewu ili ndị amụma na-ewerekwa ihe ịchọ mma na-edozi nkume ncheta ndị ezi omume. 30Unu na-asịkwa, ọ bụrụ na anyị nọ nʼoge nna anyị ha, anyị agaraghị eso ha wufuo ọbara ndị amụma. 31Site nʼụzọ dị otu a, unu na-agba akaebe megide onwe unu na unu bụ ụmụ ndị gburu ndị amụma. 32Gaanụ sorokwa nzọ ụkwụ nna unu ha, ka unu rụzuo ọrụ ahụ ha malitere. 33“Ụmụ agwọ! Ụmụ ajụala! Unu si aṅaa chee na unu ga-agbanarị ikpe nke ịba nʼọkụ ala mmụọ? 34Ya mere, aga m ezitere unu ndị amụma, ndị amamihe na ndị nkuzi. Ụfọdụ nʼime ha ka unu ga-egbu, ụfọdụ ka unu ga-akpọgide nʼobe, ndị ọzọkwa ka unu ga-apịa ihe nʼụlọ nzukọ unu. Unu ga-achụkwa ha ọsọ site nʼotu obodo gaa nʼobodo ọzọ. 35Ka ọgbọ a bụrụ ndị ikpe mara nʼihi ọbara nke ndị ezi omume niile e gburu nʼụwa, site nʼọbara Ebel ruo na nke Zekaraya nwa Berekaya, onye unu gburu nʼetiti ụlọnsọ nʼebe ịchụ aja unu. 36Nʼezie agwa m unu, ihe ndị a niile, ga-abịakwasị ọgbọ a. 37“O Jerusalem, Jerusalem! Gị obodo na-egbu ndị amụma, na nke na-atụ ndị niile e ziteere gị nkume. Ugboro ole ka m chọrọ ịchịkọta ụmụ gị dị ka nne ọkụkụ si achịkọta ụmụ ya nʼokpuru nku ya ichebe ha? Ma ị chọghị ka m mee otu a! 38Lee, a hapụrụla unu ụlọ unu ka ọ tọgbọrọ nʼefu. 39Nʼihi na asị m unu, unu agaghị ahụ m anya ọzọ tutu ruo mgbe unu ga-asị, Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị. ”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 19 Ọgọọst na kalenda nzukọ bụ 1 Septemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike