Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 30 Julaị
Kalenda Ọtọdọks · 17 Julaị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 30 Julaị 2027
Fraịdee · Izu nke 6 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 4
Mmemme na ndị nsọ
Great Martyr Marina (Margaret) of Antioch in Pisidia (4th C)
Ụbọchị obubu ọnụ
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
5Ya mere, unu ekpela ikpe tupu oge ya eruo, cherenụ ruo mgbe Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-abịa. Ọ ga-eme ka ihe niile zoro ezo nʼọchịchịrị pụta ìhè. Ọ ga-agbakwa ọchịchọ nzuzo niile nke dị nʼobi nʼanwụ. Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼotu nʼotu ga-anatakwa otuto ruuru ya site nʼaka Chineke. 6Ugbu a ụmụnna m ejiri m onwe m na Apọlọs mara unu atụ maka ọdịmma nke unu, ka unu nwee ike isite nʼaka anyị mụta ihe site nʼihe ahụ e dere bụ nke na-asị, “Unu agafekwala ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ.” Ka onye ọbụla nʼime unu hapụ iji otu onye nyaa isi ma leda ndị ọzọ anya. 7Onye gwara gị na ị pụrụ iche nʼetiti mmadụ ndị ọzọ? Ọ dị ihe ọbụla i nwere nke abụghị ihe ị natara anata? Ọ bụ gịnị ka i nwere nke ị na-anataghị anata? Ma ọ bụrụ na i natara ya, gịnị mere i ji anya isi dịka a ga-asị na ị nataghị ya anata? 8Ma ugbu a, ihe niile zuru unu oke. Ugbu a, unu abụrụkwala ndị ọgaranya. Unu abụrụla eze ma anyị esoghị unu. Nʼezie, ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na unu anọrọla nʼocheeze unu, ka anyị nwe ike soro unu bụrụ eze.
Oziọma
44“Alaeze eluigwe dị ka akụ e zoro nʼubi, nke otu nwoke chọpụtara zookwa ya ọzọ. Nwoke a jiri ọṅụ ree ihe niile o nwere, ma gaa zụta ubi ahụ. 45“Ọzọ, alaeze eluigwe yiri nkume dị oke ọnụahịa nke onye na-azụ ahịa chọtara. 46Mgbe ọ hụrụ nkume a, o ree ihe niile o nwere, were ego ya gaa zụrụ nkume a dị oke ọnụahịa. 47“Ọzọkwa, alaeze eluigwe dị ka ụgbụ e ji egbu azụ, nke a wụnyere nʼime osimiri, jiri ya jide azụ dị iche iche. 48Mgbe ụgbụ a juru, ndị ọkụ azụ ahụ na-adọpụta ya. Nọdụ ala họpụtasịa ndị dị mma tinye ha nʼime nkata, ma tufuo ndị na-adịghị mma. 49Otu a ka ọ ga-adị nʼọgwụgwụ oge. Ndị mmụọ ozi ga-abịa kewapụ ndị ọjọọ site nʼetiti ndị ezi omume, 50ma tụbakwa ha nʼime oke ọkụ ahụ. Ebe ha ga-anọ na-akwa akwa na-atakwa ikikere eze.” 51Ọ jụrụ ha sị, “Unu ghọtara ihe ndị a m na-ekwu?” Ha zara sị ya, “E.” 52Ọ sịrị ha, “Nʼihi nke a, onye nkuzi nke iwu ọbụla nke e mere ka ọ bụrụ onye na-eso ụzọ alaeze eluigwe, dị ka onyenwe ụlọ nke na-esite nʼụlọakụ ya na-ewepụta ihe ọhụrụ na ihe ochie.” 53Mgbe Jisọs tụsịrị ilu ndị a, o si ebe ahụ pụọ. 54O rutere nʼobodo ya, malite izi ha ihe nʼụlọ ekpere ha, nke a jukwara ha anya. Ha jụrịtara onwe ha ajụjụ na-asị, “Ebee ka o si nweta amamihe a? Ebee ka o si nweta ike ịrụ ọrụ ebube ndị a niile?
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 17 Julaị na kalenda nzukọ bụ 30 Julaị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike