Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 9 Julaị

Kalenda Ọtọdọks · 26 Jun (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 9 Julaị 2027

Fraịdee · Izu nke 3 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 1

Mmemme na ndị nsọ

Venerable David of Thessalonica (6th C)

Obubu ọnụ Ndị Ozi

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Rom 9:6–19

6Ọ bụghị dị ka a ga-asị na okwu Chineke na-ala azụ. Nʼihi na ọ bụghị onye ọbụla a mụrụ nʼezinaụlọ ndị Izrel bụ onye Izrel. 7Na ha sitere nʼagbụrụ Ebraham pụta emeghị ka ha bụrụ ụmụ Ebraham nʼezie. Ma nʼakụkụ nke ọzọ, “Ọ bụ site nʼAịzik ka a ga-akpọ mkpụrụ gị aha.” 8Nke a na-egosi na ọ bụghị ndị niile a mụrụ na-anụ ahụ bụ ụmụ Chineke, kama ụmụ ndị ahụ e kwere na nkwa bụ ndị a na-agụnye dị ka ụmụ Ebraham site na nkwa ahụ. 9Lee ka e si kwee nkwa ahụ, “Mgbe oge ahụ a kara aka ruru, aga m alọghachi, Sera ga-amụkwa nwa nwoke.” 10Ọ bụghị naanị nke a. Ụmụ Ribeka si nʼotu nna, ya bụ nna nna anyị Aịzik. 11Ma tupu a mụọ ụmụ ejima ndị a, ma ọ bụkwanụ tupu ha emee ihe ọbụla dị mma maọbụ nke dị njọ, iji mee ka ọchịchọ Chineke banyere nhọpụta ha guzoro, 12ọ bụghị site nʼọrụ kama ọ bụ site nʼonye ahụ nke na-akpọ, nʼihi na a gwara ya sị, “Nke okenye ga-ejere nke nta ozi.” 13Dịka e dere ya, “Jekọb ka m hụrụ nʼanya ma Ịsọ ka m kpọrọ asị.” 14Gịnịkwa ka anyị ga-ekwu? Chineke ọ bụ onye ajọ omume? Mba! 15Nʼihi na ọ gwara Mosis, “Onye m chọrọ imere ebere ka m ga-emere ebere, ọ bụkwa onye m chọrọ imere ọmịiko ka m ga-enwere ọmịiko.” 16Ya mere, ọ dabereghị nʼọchịchọ nke mmadụ maọbụ ịrụsị ọrụ ike ya kama ọ dabere nʼebere Chineke. 17Nʼihi nʼakwụkwọ nsọ gwara Fero, “Emere m ka ị bụrụ ihe ị bụ nʼihi nke a, ka m were gị zipụta ike m, ka e nwe ike kwusaa aha m nʼụwa niile.” 18Ọ pụtara ihe na ọ bụ naanị ndị Chineke chọrọ ka ọ na-emere ebere, ndị ọ chọkwara ka ọ na-eme ka ha bụrụ ndị obi ha kpọchiri akpọchi. 19Ma eleghị anya unu pụrụ ịgwa m, “Gịnị kwanụ mere o ji ata anyị ụta? Onye kwanụ pụrụ iguzogide ihe o zubere ime?”

Oziọma

Mat 10:32–36; 11:1

32“Ya mere, onye ọbụla kwupụtara m nʼihu ụmụ mmadụ, ka mụ onwe m ga-ekwupụta nʼihu Nna m bi nʼeluigwe. 33Ma onye ọbụla na-agọnarị m nʼihu ndị mmadụ, mụ onwe m ga-agọnarịkwa ya nʼihu Nna m bi nʼeluigwe. 34“Unu echekwala na m bịara iweta udo nʼụwa. Abịaghị m iweta udo, kama ọ bụ iwebata mma agha. 35Abịara m ime, “ ‘Ka nwoke megide nna ya, ka nwa nwanyị megide nne ya, ka nwunye nwa megide nne di ya, 36ndị iro mmadụ ga-abụ ndị ezinaụlọ ya.’ 11:1Mgbe Jisọs nyesịrị ndị na-eso ụzọ ya ndụmọdụ ndị a, ọ hapụrụ ebe ahụ pụọ. Bido na-ejegharị nʼobodo dị iche iche na-ezisa oziọma.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 26 Jun na kalenda nzukọ bụ 9 Julaị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike