Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 8 Julaị

Kalenda Ọtọdọks · 25 Jun (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 8 Julaị 2027

Tọọzdee · Izu nke 3 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 1

Mmemme na ndị nsọ

Virginmartyr Febronia of Nisibis († c. 304)

Obubu ọnụ Ndị Ozi

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Rom 8:22–27

22Anyị maara na ruo ugbu a, ihe niile e kere eke na-asụ ude nʼihi ihe mgbu ha nọ nʼime ya, dịka ihe mgbu nke ọmụmụ nwa. 23Ọ bụghị naanị nke a, ma anyị onwe anyị, ndị nwere mkpụrụ mbụ nke Mmụọ Nsọ, na-asụkwa ude nʼime onwe anyị, na-echesi ike mgbe a ga-akpọbata anyị dịka ụmụ, mgbe a ga-agbapụta anụ ahụ anyị. 24Nʼihi na a zọpụtara anyị site nʼolileanya dị otu a. Ma olileanya a na-ahụ anya abụghị olileanya. Onye na-enwe olileanya mgbe ihe ọ na-ele anya ya dị ya nʼaka? 25Ma ọ bụrụ na olileanya anyị dabeere nʼihe ahụ anyị na-enwetabeghị, anyị ga-eji ndidi chere tutu ihe ahụ erute anyị aka. 26Otu aka ahụ, Mmụọ Nsọ na-enyere anyị aka nʼime adịghị ike anyị. Nʼihi na anyị amaghị ka esi ekpe ekpere dịka o kwesiri. Ma Mmụọ Nsọ nʼonwe ya ji ịsụ ude nke ọnụ apụghị ịkọ na-arịọrọ anyị arịrịọ. 27Chineke, onye na-enyocha obi mmadụ, amarala ihe Mmụọ Nsọ bụ nʼuche. Nʼihi na Mmụọ Nsọ na-arịọrọ ndị nsọ niile arịrịọ dịka Chineke si chọọ.

Oziọma

Mat 10:23–31

23Mgbe ọbụla ndị mmadụ sogburu unu nʼotu obodo gbalaganụ nʼobodo ọzọ. Nʼezie, asị m unu, unu agaghị agazucha obodo niile nke Izrel tupu Nwa nke Mmadụ alọghachi. 24“Nwata akwụkwọ adịghị akarị onye nkuzi ya. Ohu adịghị akarịkwa nna ya ukwu. 25O zuorela onye na-eso ụzọ onye nkuzi ka ọ dị ka onye nkuzi ya, na ohu ahụ ka ọ dị ka onyenwe ya. Ọ bụrụ na a kpọrọ nna nwe ụlọ Belzebub, a ga-esi aṅaa ghara ịkpọ ndị ezinaụlọ ya ihe karịrị nke a? 26“Ya mere unu atụla ha egwu. O nweghị ihe ọbụla e kpuchiri ekpuchi nke a na-agaghị ekpughe, maọbụ ihe e zoro ezo nke a na-agaghị eme ka ọ pụta ìhè. 27Ihe m na-agwa unu ugbu a na nzuzo, kọsaanụ ya mgbe chi bọrọ. Ihe m ji nwayọọ mee ka ọ baa unu na ntị, nọdụnụ nʼelu ụlọ kwusaa ya. 28Unu atụla egwu ndị pụrụ igbu naanị anụ ahụ unu, ma ha enweghị ike ịmetụ mkpụrụobi unu aka. Kama onye unu ga-atụ egwu bụ Onye ahụ nwere ike imebi anụ ahụ unu na mkpụrụobi, tụbakwa ha nʼọkụ ala mmụọ. 29Ọ bụghị otu kobo ka a na-ere ụmụ nza abụọ? Ma otu nʼime ha agaghị ada nʼala ma ọ bụrụ na Nna unu bi nʼeluigwe amaghị. 30Ọ bụladị agịrị isi dị nʼisi unu ka a maara ọnụọgụgụ ha. 31Ya mere, unu atụla egwu. Unu dị oke ọnụ karịa ọtụtụ ụmụ nza.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 25 Jun na kalenda nzukọ bụ 8 Julaị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike