Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 3 Julaị

Kalenda Ọtọdọks · 20 Jun (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 3 Julaị 2027

Satọdee · Izu nke 2 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 8

Mmemme na ndị nsọ

Saint John, Archbishop of Shanghai and San Francisco, the Wonderworker († 1966)

Obubu ọnụ Ndị Ozi

E kwere azụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Rom 3:19–26

19Ugbu a, anyị maara na ihe ọbụla iwu kwuru, ọ bụ ndị nọ nʼokpuru iwu ka ọ dịịrị, ka esite otu a kpuchite ọnụ niile nʼotu nʼotu. Ma meekwa ka ụwa niile mata na ha bụ ndị ikpe mara nʼebe Chineke nọ. 20Nʼihi na o nweghị onye ọbụla a pụrụ ịgụ nʼonye ezi omume nʼihu Chineke maka na ọ na-edebe iwu. Kama, ọ bụ site nʼiwu ka anyị ji mata ihe banyere mmehie. 21Ma ugbu a, emeela ka ezi omume Chineke pụta ìhè, site nʼiguzo iche nʼebe iwu dị, bụ nke iwu na ndị amụma gbakwara ama ya. 22Ezi omume a na-esite nʼebe Chineke nọ abịa, site nʼokwukwe nʼime Jisọs Kraịst nye ndị niile kweere. O nweghị ihe ịdị iche ọbụla dị na ya. 23Nʼihi na mmadụ niile emehiela ha ekwesikwaghị otuto Chineke. 24Ma ugbu a, agụọla ha na ndị ezi omume site nʼamara ya, site na mgbapụta nke si nʼaka Kraịst Jisọs. 25Onye Chineke họpụtara ka o were ndụ ya chụọ aja ikpuchi mmehie, site nʼiwufu ọbara ya maka mgbaghara mmehie, nke a ga-anata site nʼokwukwe. Nʼụzọ dị otu a, ọ na-egosipụta ezi omume ya, maka oge gara aga, nʼihi nnagide ya, o jiri ndidi leghara mmehie ụmụ mmadụ anya. 26Ma nʼoge taa, site nʼigosi na ya onwe ya bụ onye ezi omume, na onye a na-agụnye dịka onye ezi omume bụ onye nke kweere na Jisọs.

Oziọma

Mat 7:1–8

1“Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpekwa unu ikpe. 2Nʼihi na a ga-ekpe unu ikpe dịka unu si kpee ndị ọzọ. Ọ bụkwa ihe unu ji tụọrọ ndị ọzọ ka a ga-eji tụọrọ unu. 3“Gịnị mere i ji elee ntakịrị ahịhịa dị nwanna gị nʼanya ma ị dịghị ahụta obodobo osisi dị gị onwe gị nʼanya? 4Olee otu ị ga-esi gwa ya si, ‘Nwanna m, kwere ka m tụpụ gị ntakịrị ahịhịa danyere gị nʼanya,’ mgbe obodobo osisi dị gị nʼanya, nke na-adịghị ekwe gị hụzie ụzọ. 5Onye ihu abụọ! Buru ụzọ wepụ obodobo osisi dị gị nʼanya ka i nwee ike ịhụzi ụzọ tụpụ ntakịrị ahịhịa nke dị nwanna gị nʼanya. 6“Enyela nkịta ihe dị nsọ. Enyekwala ezi ihe dị oke ọnụahịa. Ha ga-azọtọ ha ma tụgharịakwa dọrie gị. 7“Na-arịọnụ, unu ga-arịọta, na-achọnụ, unu ga-achọta, kụọkwanụ aka nʼụzọ, a ga-emeghekwara unu ụzọ. 8Nʼihi na onye na-arịọ, na-arịọta. Onye na-achọ, na-achọta. Onye na-akụ aka nʼụzọ ka a ga-emeghekwara ụzọ.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 20 Jun na kalenda nzukọ bụ 3 Julaị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike