Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 30 Jun
Kalenda Ọtọdọks · 17 Jun (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 30 Jun 2027
Wenezdee · Izu nke 2 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 8
Mmemme na ndị nsọ
Holy Martyrs Manuel, Sabel and Ismael of Persia († 362)
Obubu ọnụ Ndị Ozi
Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
13Nkwa o kwere Ebraham na agbụrụ ya na ha ga-eketa ụwa abụghị site nʼidebe iwu, kama ọ bụ site nʼezi omume nke okwukwe. 14Nʼihi na, ọ bụrụ na ndị a ga-enye ihe e kwere na nkwa bụ ndị na-edebe iwu, inwe okwukwe abakwaghị uru, nkwa ahụ enwekwaghị isi ọbụla. 15Nʼihi na iwu nʼonwe ya na-eme ka ọnụma bịa. Ma ebe iwu na-adịghị, mmehie adịghịkwa. 16Ya mere, nkwa ahụ na-abịa site nʼokwukwe, ka ọ bụrụ naanị site nʼamara ka e ji mee ka ụmụ ya niile nweta ya, ọ bụghị naanị nye ndị nọ nʼokpuru iwu, kama ọ bụkwa nye ndị nwere ụdị okwukwe Ebraham. Nʼihi na ọ bụ nna anyị niile. 17Dịka e dere ya, “Emeela m gị nna nke ọtụtụ mba.” Ya mere, nʼihu Chineke ahụ bụ onye o kweenyere nʼime ya, bụ onye ahụ na-eme ka ndị nwụrụ anwụ dịkwa ndụ ọzọ, onye na-akpọkwa ihe ndị na-adịbụghị, mee ka ha dịrị. 18Ọ bụladị mgbe olileanya gasịrị, o kwenyere na ya ga-abụ nna nke ọtụtụ mba, dịka ihe a gwara ya si dị, “Otu a ka mkpụrụ gị ga-adị.” 19Ọ daghị mba nʼokwukwe ọ bụladị mgbe ọ matara na ya akala nka nʼahụ, nʼihi na ọ gbaruola otu narị afọ, tinyekwara na akpanwa Sera bụ ihe nwụrụ anwụ. 20Ọ dịghị mgbe ọbụla o nwere obi abụọ na Chineke agaghị emezu ihe niile o kwere ya na nkwa. Kama, okwukwe ya mere ka ọ gbasie ike, ka ọ na-enye Chineke otuto. 21O nwere otu obi na Chineke pụrụ imezu ihe niile ọbụla o kwere na nkwa. 22Ọ bụ nʼihi ya ka e ji gụọ nke a nye ya dị ka ezi omume. 23Okwu ndị a, “A gụrụ ya nye ya dịka onye ezi omume,” edeghị ya naanị maka ya. 24Kama e dere ya nʼihi anyị bụ ndị kwere nʼonye ahụ mere ka Onyenwe anyị Jisọs si nʼọnwụ bilie. 25Onye a rara nye ka ọ nwụọ nʼihi mmehie anyị niile, ma e mere ka o si nʼọnwụ bilie ka anyị bụrụ ndị a gụrụ dịka ndị ezi omume.
Oziọma
21“Ọ bụghị ndị niile na-asị m ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ga-abanye nʼalaeze eluigwe, kama ọ bụ naanị ndị ahụ na-eme ihe Nna m nọ nʼeluigwe na-achọ ka ha mee. 22Nʼụbọchị ahụ, ọtụtụ ndị mmadụ ga-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ọ bụ na anyị ejighị aha gị buo amụma, jiri aha gị chụpụ mmụọ ọjọọ, ma jirikwa aha gị ruo ọtụtụ ọrụ ebube?’ 23Mgbe ahụ aga m agwa ha hoohaa sị ha, ‘Amaghị m unu, sitenụ nʼihu m pụọ, unu ndị ajọ omume!’
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 17 Jun na kalenda nzukọ bụ 30 Jun na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike