Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 27 Jun
Kalenda Ọtọdọks · 14 Jun (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 27 Jun 2027
Sọnde · Olu 8
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 1 mgbe Pentikọọsụ gasịrị
Sọnde nke Ndị nsọ niile
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
9Mba niile dị iche iche ezukọtala, mmadụ niile agbakọtakwala. Onye nʼime chi ha kwuru na ihe dị otu a ga-eme, onye kwa kwuru ihe ndị a mere nʼoge gara aga? Ka ha kpọbata ndị akaebe ha izipụta na ihe ha kwuru ziri ezi, ka ndị ọzọ nụ ya ma sị na, “Ọ bụ eziokwu.” 10“Unu bụ ndị akaebe m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “bụrụkwa ndị ohu m họpụtara, ka unu mara m, ma kwerekwa na m, ghọtakwa na Mụ onwe m bụ onye ahụ. Ọ dịghị chi a kpụrụ tupu m dịrị, ọ dịkwaghị nke ga-eso m nʼazụ. 11Mụ, ọ bụ na naanị m, bụ Onyenwe anyị, ọ dịkwaghị onye nzọpụta ọzọ dị ma ewezuga m. 12Mụ onwe m egosila, zọpụta ma kwupụtakwa ya, mee ka unu nụrụ ya, mụ onwe m, ọ bụghị chi ndị mba ọzọ nọ nʼetiti unu. Unu bụkwa ndị akaebe m, na mụ onwe bụ Chineke,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 13“E, site nʼebighị ebi ruo nʼebighị ebi, mụ onwe m bụ Chineke. Ọ dịghị onye pụrụ ịnapụta m ihe m ji nʼaka. Mgbe m rụrụ ọrụ, onye pụrụ ịgbanwe ya?” 14Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, Onye mgbapụta unu na Onye nsọ nke Izrel. “Nʼihi unu, aga m eziga ozi na Babilọn budata ndị Kaldịa niile dịka ndị gbapụrụ agbapụ, nʼime ụgbọ mmiri ahụ niile ha ji anya isi.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Oziọma ofufe ụtụtụ nke 1
16Ma ndị ikom iri na otu ahụ bụ ndị na-eso ụzọ ya gara Galili, nʼelu ugwu ebe Jisọs gwara ha gaa. 17Mgbe ha hụrụ ya, ha kpọrọ isiala nye ya. Ma ụfọdụ nʼime ha nwere obi abụọ. 18Jisọs bịara ha nso, gwa ha sị, “E werela ikike niile dị nʼeluigwe na nke dị nʼelu ụwa nye m. 19Ya mere, gaanụ mee ka mba niile bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-emenụ ha baptizim nʼaha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ. 20Ziekwanụ ha ka ha na-eme ihe niile m nyere unu nʼiwu. Ma chetanụ na m na-anọnyere unu mgbe niile, ruo ọgwụgwụ oge.”
Akwụkwọ ozi
33ndị sitere nʼokwukwe merie ọtụtụ alaeze, kpeekwa ikpe nkwụmọtọ, natakwa nkwa e kwere, ndị mechiri ọnụ ọdụm. 34Ha menyụrụ ọkụ dị egwu, gbanarị mma agha, nweta ike site nʼadịghị ike. Ha ghọkwara ndị dị ike nʼagha, chụlaa usuu ndị agha ndị mba ọzọ. 35Ụmụ nwanyị natara ndị ha nwụrụ anwụ, site na mbilite nʼọnwụ. Ndị ọzọ naara ntaramahụhụ, ha jụrụ ịnata mgbapụta ka ha nwee ike nata mbilite nʼọnwụ ka mma. 36E ji ụfọdụ mere ihe ọchị, tiekwa ha ihe otiti, ọ bụladị ike ha agbụ na ịtụ ha mkpọrọ. 37A tụrụ ụfọdụ nkume, kwọbie ụfọdụ abụọ. E ji mma agha gbuo ụfọdụ. Ụfọdụ yi akpụkpọ ewu na akpụkpọ atụrụ jegharịa. Ụfọdụ bụkwa ndị dara ụkpa. A kpagburu ụfọdụ, ma mejọọkwa ndị ọzọ. 38Ha wagharịrị nʼọzara na nʼugwu, nʼọgba nkume na nʼọnụ ala. Nʼanya ụwa, a gụrụ ha nʼihe efu. 39A gbaara ezigbo ama nʼisi ndị a niile nʼihi okwukwe ha, ma ha anataghị ihe ahụ e kwere ha na nkwa. 40Otu ọ dị, Chineke akwadoberela anyị ihe kaara anyị mma, ka a ghara ime ka ha zuo oke ma e wepụ anyị. 12:1Ya mere, anyị nwere oke igwe ndị ama dị otu a gbara anyị gburugburu, nʼihi nke a, ka anyị wepụ ihe ọbụla nke na-adọghachi anyị azụ dịka ibu arọ, ya na mmehie niile nọdebere anyị nsọ karịa. Ka anyị werekwa ntachiobi gbaa ọsọ nke chere anyị nʼihu. 2Ka anyị na-elegide Jisọs anya, onye mbụ na onye na-eme ka okwukwe anyị zuo oke, onye jiri nʼihi ọṅụ e debere nʼihu ya, die ahụhụ na ihe ihere nke obe, ọ nọdụ nʼaka nri nke ocheeze Chineke.
Oziọma
32“Ya mere, onye ọbụla kwupụtara m nʼihu ụmụ mmadụ, ka mụ onwe m ga-ekwupụta nʼihu Nna m bi nʼeluigwe. 33Ma onye ọbụla na-agọnarị m nʼihu ndị mmadụ, mụ onwe m ga-agọnarịkwa ya nʼihu Nna m bi nʼeluigwe. 37“Ọ bụrụ na ị hụrụ nne gị maọbụ nna gị nʼanya karịa m, i kwesighị ịbụ onye nke m. Ọ bụrụ na ị hụrụ nwa gị nwoke, maọbụ nwa gị nwanyị nʼanya karịa m, i kwesighị ịbụ onye nke m. 38Onye ọbụla na-eburughị obe ya soro m, ekwesighị ị bụ onye nke m. 19:27Mgbe ahụ Pita jụrụ ya sị, “Lee, anyị ahapụla ihe niile soro gị, gịnị ga-abụ ụgwọ ọrụ anyị?” 28Jisọs zara sị ya, “Nʼezie agwa m unu, mgbe a ga-agbanwe ihe niile, mgbe Nwa nke Mmadụ ga-anọkwasị nʼelu ocheeze ebube ya, nʼalaeze ahụ, nʼezie, unu bụ ndị na-eso ụzọ m ga-anọkwasị nʼocheeze iri na abụọ ahụ, na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe. 29Onye ọbụla hapụrụ ụlọ ya, na ụmụnne ya nwoke, na ụmụnne ya nwanyị, na nne ya na nna ya, na ụmụntakịrị ya, maọbụ ala o nwere, soro m, ga-anata dị ka ụgwọ ọrụ okpukpu narị ihe ọ hapụrụ, natakwa alaeze. Ọ ga-eketakwa ndụ ebighị ebi. 30Ma ọtụtụ ndị bu ụzọ ga-abụ ndị ikpeazụ, ma ndị ikpeazụ ga-abụkwa ndị bu ụzọ.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 14 Jun na kalenda nzukọ bụ 27 Jun na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike