Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 18 Jun

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 18 Jun 2027

Fraịdee · Izu nke 11 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Fraịdee nke izu nke 11 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Obubu ọnụ na nchegharị

Ụbọchị nchegharị

Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

2Kọ 11:18, 21–30

18Ebe ọtụtụ mmadụ na-anya isi banyere ihe ha bụ nʼụzọ ụwa si eme. Mụ onwe m ga-anyakwa isi. 21Nʼezie, ọ bụ ihere m, ịnabata na anyị bụ ndị na-adịghị ike nʼezie nye nke a. Ọ bụrụ na onye ọbụla anwaa anwaa nyaa isi nʼihe ọbụla (ana m ekwu dịka onye nʼenweghị uche), mụ onwe m ga-anyakwa isi. 22Ha bụ ndị Hibru? Mụ onwe m bụkwa ya. Ha bụ ndị Izrel? Mụ onwe m bụkwa ya. Ha bụ ndị agbụrụ Ebraham? Mụ onwe m bụkwa. 23Ha bụ ndị na-ejere Kraịst ozi? (Ana m ekwu dịka onye anya na-adịghị mma.) Ma mụ onwe m ejela ozi karịa. Adọgbuola m onwe m nʼọrụ karịa ha niile. Etinyela m nʼụlọ mkpọrọ ọtụtụ mgbe, tinyere ọtụtụ ihe otiti, mgbe mgbe anọọla m nʼọnụ ọnwụ. 24Ugboro ise ka ndị Juu pịara m ọnụ ụtarị iri anọ e wepụrụ otu. 25E jirila okporo igwe tie m ugboro atọ. Atụrụ m nkume otu ugboro. Ugboro atọ ka ụgbọ mmiri m nọ nʼime ya kpuru nʼoke osimiri. Anọọla m otu abalị na ụbọchị so ya nʼelu oke osimiri ebe mmiri na-ebugharị m. 26Ejeela m ọtụtụ ogologo ije nke ọtụtụ ihe ize ndụ dị nʼime ya. Nʼize ndụ site nʼosimiri, ize ndụ site na ndị na-apụnarị mmadụ ihe nʼike, ize ndụ site nʼaka ndị obodo nke aka m. Ọtụtụ mgbe ka m zere ndụ site nʼaka ndị mba ọzọ, nʼime obodo ukwu, nʼọzara ma nʼoke osimiri; na nʼaka ndị kpọrọ onwe ha ụmụnna m, ma ha bụ ndị ụgha. 27Adọgbuola m onwe m nʼọrụ, anọọla m nʼọnọdụ ịhụju anya na ịmụ anya ọtụtụ abalị. Ọtụtụ mgbe ana m anọ agụụ na-erighị ihe ọbụla, maọbụ ịṅụ ihe ọbụla. Anọọla m ọtụtụ mgbe nʼoge oyi na-ama jijiji nʼihi enweghị uwe dị mma m ji achụ oyi. 28Ma e wezuga ihe ndị a niile, ana m anọ nʼechiche mgbe niile banyere otu ihe niile si aga nʼime nzukọ. 29Onye bụ onye ahụ na-adịghị ike nke m na-adịghị eso ya kere oke na-adịghị ike ya? Onye ka e dubara na mmehie nke ọnọdụ ya na-adịghị emetụ m nʼobi? 30Kama ọ bụrụ na o kwesiri ka m nyaa isi aga m anya isi banyere ihe ndị ahụ na-egosi adịghị ike m.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 34:1–6

1Abụ Ọma Devid. Mgbe ọ gbanwere omume ya mee ka onye na-ayị ara nʼihu Abimelek, onye nke chụpụrụ ya, ya a pụọ. Aga m eto Onyenwe anyị mgbe niile. Mgbe niile ka otuto ya ga-adị nʼọnụ m. 2Mkpụrụobi m ga-anya isi na Onyenwe anyị; ka ndị niile a na-akpagbu gee ntị ṅụrịa ọṅụ. 3Soro m too Onyenwe anyị; ka anyị bulie aha ya elu. 4Nʼihi na etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ zakwara m, napụta m site nʼaka ịtụ ụjọ m niile. 5Ihu ndị na-elekwasị ya anya na-enwu dịka ihe; ihere adịghị eme ha. 6Onye ogbenye a kpọkuru Onyenwe anyị, ọ zakwara ya; ọ zọpụtara ya site na nsogbu ya niile.

Oziọma

Mat 6:19–23

19“Unu akpadola akụ nʼụwa nye onwe unu, ebe ọ ga-agba nchara, akịka atakwa ya, ebe ndị ohi ga-etiwa ma zukwaa ha. 20Kama kwadoonụ akụ nʼeluigwe nye onwe unu, ebe ha na-agaghị agba nchara, ebe akịka na-agaghị eri ha, ebe ndị ohi na-adịghị etiwa maọbụ zuo ihe. 21Nʼihi na ebe ọbụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa. 22“Anya bụ oriọna nke anụ ahụ. Ọ bụrụkwa na anya gị adịrị ọcha, ahụ gị niile ga-ejupụta nʼìhè. 23Ọ bụrụ na anya gị ajọọ njọ, akụkụ ahụ gị niile ga-ejupụta nʼọchịchịrị. Ọ bụrụkwa na ìhè ahụ dị nʼime gị aghọọ ọchịchịrị, ọchịchịrị ahụ ga-adị ukwuu.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike