Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 17 Jun
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 17 Jun 2027
Tọọzdee · Izu nke 11 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Tọọzdee nke izu nke 11 nke Oge Nkịtị
Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Ọ ga-adị m mma ma ọ bụrụ na unu ga-anagide m ka m kwuo okwu ndị a dị ka onye nzuzu. Biko nagidenụ m. 2Ekworo m nwere nʼebe unu nọ bụ ekworo nke Chineke. Ekwere m nkwa iwere unu nye otu di, ya bụ Kraịst, ka m nwe ike chee unu nʼihu ya dịka nwaagbọghọ dị ọcha nke na-amaghị nwoke. 3Ma ana m atụ egwu, na dịka agwọ jiri aghụghọ ghọgbuo Iiv, ndị nrafu ga-eji aghụghọ duhie unu, mee ka unu kwụsị iji obi dị ọcha na uche ziri ezi jeere Kraịst ozi. 4Nʼihi na unu gaara anara onye ọzọ bịakwutere unu na-ekwusa Jisọs ọzọ nke na-abụghị nke anyị kwusara, unu gaara anarakwa ike nke mmụọ ọzọ dị iche na-abụghị ike nke Mmụọ Nsọ ahụ unu natara, unu gaara ekwenyekwa na nkuzi ọzọ dị iche, na-abụghị oziọma ahụ nke unu natara. 5Ma echeghị m na ọ dị ụzọ ọbụla ndị ozi a maara aha ha si kara m mma. 6Ọ bụrụ na m abụghị onye ọka okwu, abụ m onye ọka mmụta. Anyị akọwarala unu nke a ọtụtụ mgbe nʼụzọ dị iche iche nʼihe niile. 7Ọ ga-abụ na-emere m ihe ọjọọ mgbe m wedara onwe m ala ka e welie unu elu, nʼihi nʼanaghị m unu ihe ọbụla mgbe m na-ekwusara unu oziọma Chineke? 8Ọ bụ nzukọ nọ nʼebe ọzọ nyeere m aka mgbe m na-arụ ọrụ nʼetiti unu. Ọ bụ site nʼaka ha ka m ji nata nkwado, dịka ụgwọ ọrụ m, ka m nwee ike inyere unu aka. 9Ma mgbe m nọ nʼetiti unu abụghị m ibu arọ nye onye ọbụla nʼoge mkpa m. Nʼihi na ụmụnna si Masidonia wetaara m ihe niile na-akpa m mkpa. Ebe ọ bụ na m gbalịrị debe onwe m, ka m ghara ịbụ ibu arọ nye unu nʼụzọ ọbụla nʼoge gara aga, agaghị m abụkwa ibu arọ nye unu nʼoge dị nʼihu. 10Ebe eziokwu nke Kraịst dị nʼime m, ịnya isi m nke a agaghị akwụsị na mpaghara Akaịa niile. 11Nʼihi gịnị? Ọ bụ nʼihi na m ahụghị unu nʼanya? Chineke maara na m hụrụ unu nʼanya.
Abụ Ọma nzaghachi
1Toonu Onyenwe anyị! Aga m eji obi m niile jaa Onyenwe anyị mma nʼime nzukọ ndị ụzọ ha ziri ezi na nʼime ọgbakọ ukwuu. 2Ọrụ niile Onyenwe anyị na-arụ dị ukwuu; ndị niile na-enwe mmasị na ha na-atụgharị uche nʼime ha. 3Ọrụ ya jupụtara nʼebube na ịma mma, ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. 4O meela ka e cheta ọrụ ebube ya niile; Onyenwe anyị bụ onye amara na onye ọmịiko. 7Ọrụ aka ya niile bụ ihe kwesiri ekwesi na ikpe ziri ezi; ụkpụrụ ya niile bụ ihe kwesiri ntụkwasị obi. 8E hiwere ha ịdị ruo mgbe niile ebighị ebi, ha bụ ihe e mere nʼikwesị ntụkwasị obi na izi ezi.
Oziọma
7Mgbe unu na-ekpe ekpere, unu ekwula okwu nkwukwasị efu dị ka ndị na-amaghị Chineke na-eme. Ha chere na a ga-anụ ekpere ha nʼihi ọtụtụ okwu ha na-ekwu. 8Unu adịla ka ha. Chetanụ na tupu unu arịọ arịrịọ ọbụla, Nna unu bi nʼeluigwe maara ihe na-akpa unu. 9“Sinụ otu a na-ekpe ekpere: “ ‘Nna anyị nke bi nʼeluigwe, ka e doo aha gị nsọ. 10Ka alaeze gị bịa, ka e mee uche gị nʼụwa, dịka e si eme ya nʼeluigwe. 11Nye anyị nri nke ụbọchị taa. 12Gbaghara anyị mmehie anyị, dịka anyị si agbaghara ndị na-emehie megide anyị. 13Ekwela ka anyị daba nʼime ọnwụnwa, kama, zọpụta anyị nʼaka ajọ onye ahụ.’ 14Ọ bụrụ na unu agbaghara ndị mmadụ mgbe ha mehiere megide unu, Nna unu nke bi nʼeluigwe ga-agbagharakwa unu mmehie unu. 15Ọ bụrụkwanụ na unu agbagharaghị ndị ọzọ mmehie niile ha, Nna unu nke bi nʼeluigwe agaghị agbaghara unu mmehie unu.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike