Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 16 Jun

Kalenda Ọtọdọks · 3 Jun (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 16 Jun 2027

Wenezdee · Izu nke 7 nke Ista · Olu 6

Mmemme na ndị nsọ

Holy Martyrs Lucillian, the Youths Claudius, Hypatius, and Dionysius, and Paula the Virgin († 270-275)

Ụbọchị obubu ọnụ

E kwere azụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Ọrụ 23:1–11

1Mgbe Pọl legidere ndị nzukọ a anya, ọ sịrị, “Ụmụnna m, mụ onwe m ejirila ezi akọnuche bie ndụ m niile nʼihu Chineke ruokwa ụbọchị taa.” 2Nke a mere, Ananayas onyeisi nchụaja nyere iwu ka ndị nọ ya nso tie ya aka nʼọnụ. 3Ma Pọl, sịrị ya, “Otu a ka Chineke ga-esi tie gị, gị mgbidi e tere nzu. Ụdị onye ikpe dị aṅaa ka ị bụ i ji na-emebi iwu nʼonwe gị site nʼinye iwu ka e si otu a tie m ihe?” 4Ndị guzo ya nso sịrị, “Ị na-ekwutọ onyeisi nchụaja Chineke?” 5Ma Pọl sịrị, “Aghọtaghị m, ụmụnna m na ọ bụ onyeisi nchụaja. Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘Ekwula okwu ọjọọ ọbụla megide onye na-achị ndị nke gị.’” 6Mgbe Pọl chọpụtara na otu ụzọ nʼime nzukọ ahụ bụ ndị otu Sadusii, ebe ndị ọzọ bụkwa ndị Farisii, o tiri mkpu nʼime nnọkọ ahụ sị, “Ụmụnna m, abụ m onye Farisii na nwa ndị Farisii. A na-ekpe m ikpe taa nʼihi olileanya m nwere na mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ.” 7Mgbe o kwusiri nke a esemokwu dapụtara nʼetiti ndị Farisii na ndị Sadusii. Ọgbakọ ahụ kewara. 8Nʼihi na ndị Sadusii na-asị na mbilite nʼọnwụ maọbụ mmụọ ozi maọbụ mmụọ ọbụla adịghị. Ma ndị Farisii kweere nʼihe ndị a niile. 9Mkpọtụ malitere na-ada ike ike. Ụfọdụ ndị ozizi iwu so nʼotu ndị Farisii biliri ọtọ malite ịrụ ụka nʼoke olu sị, “Anyị ahụghị ihe ọjọọ nʼebe nwoke a nọ, ma gịnịkwa ma ọ bụrụ na ọ bụ mmụọ, maọbụ mmụọ ozi gwara ya okwu?” 10Esemokwu a bịara karịa, nke mere na onyeisi ọchịagha tụrụ egwu na ha ga-adọkasị Pọl. Ọ gwara ndị agha ya ka ha banye were ike kpọpụta ya, ziga ya nʼogige ndị agha. 11Nʼabalị ya, Onyenwe anyị bịakwutere ya sị, “Nwee obi ike, dịka i si gbaa ama banyere m na Jerusalem, ị ghaghị ịgbakwara m ama na Rom.”

Oziọma

Jọn 16:15–23

15Ihe niile Nna nwere bụ nke m. Ọ bụ ya mere m ji sị, na ọ ga-ewere site nʼihe bụ nkem, kọwara ya unu. 16“Ọ fọdụrụ nwantakịrị oge unu agaghị ahụkwa m. Ma mgbe nwantịntị oge gasịkwara, unu ga-ahụkwa m anya ọzọ.” 17Ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya sịrịtara onwe ha, “Gịnị ka o bu nʼuche mgbe ọ na-asị, ‘Nwa oge nta unu agaghị ahụkwa m ọzọ, ma mgbe nwa oge gasịkwara unu ga-ahụkwa m,’ na ‘Nʼihi na ana m alakwuru Nna’?” 18Ha na-asị, “Gịnị ka okwu a pụtara bụ ‘nwa oge nta’? Anyị aghọtaghị ihe ọ na-ekwu.” 19Jisọs matara na ha chọrọ ịjụ ya ihe banyere nke a, nʼihi ya ọ sịrị ha, “Unu na-ajụrịta onwe unu ihe okwu m pụtara mgbe m sịrị, ‘Na nwa oge nta unu agaghị ahụkwa m ọzọ, ma nwa mgbe nta unu ga-ahụkwa m’? 20Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, unu ga-akwa akwa ma nwekwa obi mwute, ma ụwa ga-aṅụrị ọṅụ. Ma iru ụjụ unu ga-aghọrọ unu ọṅụ. 21Mgbe ime na-eme nwanyị, ọ na-anọ nʼọnọdụ ihe mgbu. Mgbe ọ mụsịrị nwa ya, ọ dịghị echetakwa ihe mgbu ya ọzọ. Nʼihi ọṅụ na a mụpụtala nwa nʼelu ụwa. 22Unu nọ nʼọnọdụ iru ụjụ ugbu a, ma aga m ahụ unu anya ọzọ, obi unu ga-ejupụta nʼọṅụ. Mmadụ ọbụla apụghịkwa ịnapụ unu ọṅụ unu. 23Ma nʼụbọchị ahụ, unu agakwaghị arịọ m ihe ọbụla. Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ihe ọbụla unu ga-arịọ Nna m nʼaha m, ọ ga-enye unu.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 3 Jun na kalenda nzukọ bụ 16 Jun na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike