Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 14 Jun
Kalenda Ọtọdọks · 1 Jun (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 14 Jun 2027
Mọnde · Izu nke 7 nke Ista · Olu 6
Mmemme na ndị nsọ
Martyr Justin the Philosopher, another Justin, and those with them at Rome: Chariton, his wife Charita, Euelpistus, Hierax, Peonus, and Valerian († 166)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
8Nʼụbọchị nke ọzọ ya, anyị gara nʼihu nʼije anyị rute Sizaria. Nʼebe ahụ, anyị nọnyeere otu nwanna anyị a na-akpọ Filip onye na-agbasa oziọma. Ọ bụ otu nʼime mmadụ asaa ahụ. 9O nwere ụmụ agbọghọ anọ ndị na-alụbeghị di. Ha nwekwara onyinye ibu amụma. 10Mgbe anyị nọrọ ọtụtụ ụbọchị nʼebe ahụ, ka otu onye amụma a na-akpọ Agabọs, si Judịa bata. 11Ọ bịakwutere anyị, chilite belịt Pọl na-eke nʼukwu, kee onwe ya nʼụkwụ na aka sị, “Dịka Mmụọ Nsọ kwuru, ‘otu a ka ndị ndu ndị Juu ga-eke onye nwe ihe a agbụ na Jerusalem. Ha ga-ararakwa ya nye nʼaka ndị mba ọzọ.’ ” 12Mgbe anyị nụrụ nke a, anyị na ndị niile nọ nʼebe ahụ rịọrọ Pọl ka ọ ghara ịga Jerusalem. 13Ma Pọl zaghachiri, “Gịnị ka unu na-eme, ọ bụ akwa ka unu na-ebe, na-eme ka obi gbawaa m? Nʼihi na ọ bụghị naanị na m dị njikere ka e kee m agbụ, kama ejikekwara m iwere ndụ m nye na Jerusalem nʼihi aha Onyenwe anyị Jisọs.” 14Ebe ọ na-ekweghị ege anyị ntị, anyị kwụsịrị ma sị, “Ka e mee uche Onyenwe anyị.”
Oziọma
27Udo ka m na-ahapụrụ unu. Udo m ka m na-enyekwa unu. Ọ bụghị dị ka ụwa si enye ka m na-enye unu. Unu ekwela ka obi lọọ unu mmiri, ka ụjọ hapụkwa ịtụ unu. 28“Unu anụla na m gwara unu, ‘Ana m ala, ma lọghachikwutekwa unu.’ Ọ bụrụ na unu hụrụ m nʼanya, unu gaara aṅụrị ọṅụ na m na-alakwuru Nna, nʼihi na Nna dị ukwuu karịa m. 29Ugbu a, agwala m unu ihe a tupu o mezuo, ka ọ ga-abụ mgbe o mezuru, unu enwee ike kwere. 30Agaghị m agwa unu ọtụtụ okwu ọzọ nʼihi na eze na-achị ụwa a na-abịa. O nwekwaghị ike ọbụla nʼebe m nọ. 31Ana m eme dịka Nna m nyere m nʼiwu, ka ụwa mara na m hụrụ Nna m nʼanya. “Bilienụ ugbu a ka anyị si ebe a pụọ. 15:1“Mụ onwe m bụ ezigbo osisi vaịnị ahụ. Nna m bụkwa onye ọrụ ubi. 2Ọ na-egbuda alaka ọbụla dị nʼime m nke na-adịghị amị mkpụrụ. Ma alaka ọbụla na-amị mkpụrụ ka ọ na-egbucha, ka o nwee ike mịa mkpụrụ dị ọtụtụ. 3Ugbu a, e meela ka unu dịrị ọcha nʼihi okwu m gwara unu. 4Nọgidenụ nʼime m, ka mụ onwe m nọgidekwa nʼime unu. Dịka alaka ọbụla apụghị ịmị mkpụrụ nʼonwe ya ma ọ bụrụ na ọ nọgideghị nʼosisi vaịnị. Otu a, unu apụghịkwa ịmị mkpụrụ ma ọ bụrụ na unu anọgideghị nʼime m. 5“Mụ onwe m bụ osisi vaịnị ahụ; unu bụkwa alaka ya. Onye ọbụla na-anọgide nʼime m, nke mụ onwe m na-anọgidekwa nʼime ya, na-amị ọtụtụ mkpụrụ. Nʼihi na ewezuga m, unu enweghị ike ime ihe ọbụla. 6Onye ọbụla na-adịghị anọgide nʼime m dị ka alaka e gbuturu, tụpụ ya, ọ kpọnwụọ. A ga-achịkọta ya, chịnye ya nʼọkụ, o repịa. 7Ọ bụrụ na unu anọgide nʼime m, okwu m anọgidekwa nʼime unu, rịọọnụ ihe ọbụla unu chọrọ, a ga-emere unu ya.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 1 Jun na kalenda nzukọ bụ 14 Jun na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike