Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 12 Jun
Kalenda Ọtọdọks · 30 Mee (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 12 Jun 2027
Satọdee · Izu nke 6 nke Ista · Olu 5
Mmemme na ndị nsọ
Venerable Isaac the Founder of the Dalmatian Monastery at Constantinople († 383)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
7Nʼụbọchị mbụ nʼizu ụka, mgbe anyị zukọrọ ịnyawa achịcha, Pọl gwara ha okwu, ebe ọ na-akwado ịla ma chi bọọ, o kwugidere okwu ruo nʼetiti abalị. 8Ọtụtụ oriọna dịkwa nʼime ọnụụlọ ahụ dị nʼụlọ elu ebe anyị zukọrọ. 9Otu nwokorobịa a na-akpọ Yutikọs nọdụrụ ala nʼoghereikuku, ọ bụ onye oke ụra bidoro ịtụ dịka Pọl na-ekwu okwu ruo oge dị anya. Mgbe ọ dara nʼoke ụra a, o sitere na nʼụlọ elu nke atọ dapụ, daa nʼala. Mgbe e buliri ya, ọ bụ onye nwụrụ anwụ. 10Pọl rituru nʼala selite ya elu jikụọ ya. Ọ sịrị ndị gbakọrọ nʼebe ahụ sị, “Ka obi hapụ ịlọ unu mmiri ọ dị ndụ.” 11Ọ laghachikwara nʼụlọ elu ahụ, mgbe ọ nyawachara achịcha ma riekwa, o kwugidere okwu tutu chi abọọ, ọ hapụrụ ha bilie ije ya. 12Ha kulitere nwokorobịa ahụ na ndụ nke mere ka ọṅụ jupụta ha nʼobi. Ọ gbakwara ha ume nke ukwuu.
Oziọma
10Ọ bụ na i kweghị na m nọ nʼime Nna, na Nna nọkwa nʼime m? Okwu niile m na-agwa unu esitekwaghị nʼebe m nọ pụta, kama ọ bụ Nna bi nʼime m na-arụ ọrụ ya. 11Kwere ihe m kwuru na anọ m nʼime Nna, na Nna nọkwa nʼime m. Ma ọ bụghị otu a, kwerenụ nʼihi ọrụ ebube ndị a. 12Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla kwere na m ga-arụ ọrụ ndị m rụrụ, rụọkwa ọrụ karịrị ndị a, nʼihi na m na-alakwuru Nna m. 13Ihe ọbụla unu ga-arịọ site nʼaha m, aga m enye unu ya, ka e nwe ike nye Nna ahụ otuto site nʼỌkpara ya. 14Ihe ọbụla unu rịọrọ nʼaha m, aga m eme ya. 15“Ọ bụrụ na unu hụrụ m nʼanya unu ga-edebe iwu m niile. 16Aga m arịọ Nna m, ọ ga-enye unu Onye Nkasiobi ọzọ, onye ga-enyere unu aka ma nọnyekwara unu ruo mgbe niile ebighị ebi. 17Onye bụ Mmụọ nke eziokwu. Ndị bi nʼụwa agaghị anabata ya, nʼihi na ha adịghị ahụ ya anya, ha amakwaghị ya. Ma unu maara ya nʼihi na unu na ya nọ, o bikwa nʼime unu. 18Agaghị m ahapụ unu dị ka ndị na-enweghị nne na nna. Aga m abịakwute unu. 19Mgbe na-adịghị anya, ụwa agaghị ahụkwa m anya. Ma unu ga-ahụ m anya. Nʼihi na m dị ndụ, unu ga-adịkwa ndụ. 20Nʼụbọchị ahụ, unu ga-amata na m nọ nʼime Nna m na unu nọ nʼime m, na mụ onwe m nọkwa nʼime unu. 21Onye ọbụla nabatara iwu m ma na-edebekwa ha bụ onye hụrụ m nʼanya. Onye hụrụ m nʼanya ka Nna m ga-ahụ nʼanya. Aga m ahụkwa ya nʼanya gosikwa ya onwe m.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 30 Mee na kalenda nzukọ bụ 12 Jun na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike