Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 28 Mee
Kalenda Ọtọdọks · 15 Mee (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 28 Mee 2027
Fraịdee · Izu nke 4 nke Ista · Olu 3
Mmemme na ndị nsọ
Venerable Pachomius the Great, Founder of Cœnobitic Monasticism († c. 348)
Ụbọchị obubu ọnụ
E kwere azụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
44Mgbe Pita nọ na-ekwu okwu, Mmụọ Nsọ bịakwasịrị ndị niile nụrụ okwu a. 45Nke a juru ndị e biri ugwu nʼetiti ndị kwere ekwe soro Pita bịa anya otu e siri mee ka ndị mba ọzọ nata onyinye Mmụọ Nsọ ahụ. 46Nʼihi na ha nụrụ ka ha na-ekwu okwu nʼasụsụ dị iche iche na-etokwa Chineke. Mgbe ahụ Pita jụrụ, 47“Ọ dị onye pụrụ igbochi anyị ime ndị a baptizim. Ndị natara Mmụọ Nsọ dị ka anyị onwe anyị?” 48Nʼihi nke a, o nyere iwu ka e mee ha baptizim nʼaha Jisọs Kraịst. Ha rịọrọ ya ka ọ nọnyere ha ụbọchị ole na ole. 11:1Ndị ozi na ụmụnna ndị bi na Judịa niile nụrụ na ndị mba ọzọ anabatala okwu Chineke. 2Mgbe Pita ruru Jerusalem, ndị kwere ekwe e biri ugwu tara ya ụta, 3na-asị, “Gịnị mere ị ji gakwuru ndị a na-ebighị ugwu soro ha rie ihe?” 4Pita kọwaara ha ihe niile mere na otu o si mee, na-asị. 5“Otu ụbọchị, mgbe m nọ nʼobodo Jopa, ahụrụ m ọhụ nʼoge m na-ekpe ekpere. Nʼime ọhụ a, ahụrụ m ihe yiri akwa ọcha dị obosara nke e sitere nʼakụkụ anọ ya na-ewedata site nʼeluigwe. E budatara ya nʼihu m. 6Nʼime ya, ahụrụ m anụmanụ ndị nwere ụkwụ anọ, na anụ ọhịa, na anụ ndị na-akpụ akpụ nʼala na ụmụ nnụnụ nke eluigwe. 7Mgbe ahụ, anụrụ m olu gwara m sị, ‘Pita, bilie, gbuo ma riekwa.’ 8“Ma asịrị m, ‘Mba, Onyenwe m, ọ dịbeghị mgbe ihe na-adịghị ọcha maọbụ ihe rụrụ arụ bara m nʼọnụ.’ 9“Olu ahụ siri nʼeluigwe zaghachi nke ugboro abụọ, ‘Akpọla ihe ọbụla ihe rụrụ arụ bụ nke Chineke mere ka ọ dị ọcha.’ 10Nke a mere ugboro atọ, ma emesịa dọlie ha niile laa nʼeluigwe.
Oziọma
21Ọzọ ọ gwara ha, “Aga m ahapụ unu, unu ga-achọ m, ma unu ga-anwụ nʼime mmehie unu. Ma unu apụghị ịbịa nʼebe m na-aga.” 22Nke a mere ka ndị Juu na-asị, “Ọ ga-egbu onwe ya? Ọ bụ ya mere o ji sị, ‘Ebe m na-aga unu apụghị ị bịa’?” 23Ma ọ sịrị ha, “Unu si nʼala ma esi m nʼelu bịa. Unu bụkwa ndị ụwa, ma abụkwaghị m nke ụwa a. 24A sịrị m unu na unu ga-anwụ nʼime mmehie unu, naanị na unu kwenyere na mụ onwe m, bụ onye ahụ.” 25Ha jụrụ ya, “Onye ka ị bụ?” Jisọs zara sị ha, “Abụ m onye ahụ m gwara unu na m bụ na mbụ. 26E nwere m ọtụtụ ihe m ga-ekwu nʼikpe unu ikpe. Ma matanụ na onye ahụ zitere m bụ onye eziokwu. Nʼihi nke a, ihe niile m nụrụ site nʼọnụ ya ka m gwara ụwa.” 27Ọ bụ ihe banyere Nna ya ka ọ na-agwa ha, ma ha aghọtaghị ya. 28Ya mere Jisọs sịrị, “Mgbe unu weliri Nwa nke Mmadụ elu, mgbe ahụ ka unu ga-ama na mụ onwe m bụ ya. Unu ga-amatakwa na ọ dịghị ihe m na-eme nʼonwe m, kama, dị ka Nna m ziri m ka m na-ekwu ihe ndị a. 29Onye ahụ nke zitere m na-anọnyekwara m. Ọ hapụghịkwa m mgbe ọbụla, nʼihi na ọ bụ ihe na-amasị ya ka m na-eme mgbe niile.” 30Mgbe ọ na-ekwu ihe ndị a, ọtụtụ kwenyere na ya.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 15 Mee na kalenda nzukọ bụ 28 Mee na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike