Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 19 Mee
Kalenda Ọtọdọks · 6 Mee (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 19 Mee 2027
Wenezdee · Izu nke 3 nke Ista · Olu 2
Mmemme na ndị nsọ
Righteous Job the Long-Suffering (c.2000-1500 BC)
Ụbọchị obubu ọnụ
E kwere azụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
18Mgbe Saimọn hụrụ na a na-enye Mmụọ Nsọ naanị site nʼaka ndị ozi bikwasịrị ha nʼisi, o chere ha ego nʼihu, 19sị, “nyekwanụ m ike a. Ka onye ọbụla m bikwasịrị aka nʼisi nata Mmụọ Nsọ.” 20Ma Pita sịrị, “Gị na ego gị laakwa nʼiyi. Nʼihi na i chere na ị ga-eji ego zụta onyinye Chineke. 21I nweghị oke maọbụ ihe nketa nʼọrụ a, nʼihi na obi gị ezighị ezi nʼihu Chineke. 22Si nʼajọ omume gị chegharịa, rịọ Onyenwe anyị arịrịọ ma eleghị anya ọ ga-agbaghara gị echiche ọjọọ niile nke obi gị. 23Nʼihi na ahụrụ m na ị jupụtara nʼobi ilu na ị nọkwa nʼagbụ nke ajọ omume.” 24Saimọn zara Pita sị, “Biko, kpee ekpere rịọrọ m Chineke, ka ihe ndị a niile i kwuru, hapụ ịbịakwasị m.” 25Mgbe ha gbachara akaebe, ma kwusaakwa okwu nke Onyenwe anyị, ha lọghachiri Jerusalem. Ma mgbe ha na-ala ha zisara oziọma nʼọtụtụ obodo ndị Sameria.
Oziọma
35Jisọs sịrị ha, “Abụ m achịcha ahụ na-enye ndụ. Onye ọbụla na-abịakwute m, agụụ agaghị agụ ya. Onye ọbụla kwa kweere na m, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ. 36Ma agwa m unu, unu ahụla m ma unu ekweghịkwa. 37Onye ọbụla Nna ahụ nyere m ga-abịakwute m, onye ọbụla na-abịakwute m, agaghị m achụpụ ya. 38Nʼihi na esi m nʼeluigwe rịdata nʼụwa ime uche onye ahụ zitere m, ọ bụghị ime uche nke m. 39Nke a bụkwa uche onye ahụ zitere m, na o nweghị onye ọbụla o nyere m ga-efunarị m, kama m ga-eme ka ha site nʼọnwụ bilie nʼụbọchị ikpeazụ.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 6 Mee na kalenda nzukọ bụ 19 Mee na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike