Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 14 Mee

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 14 Mee 2027

Fraịdee · Izu nke 7 nke Oge Ista

Mmemme na ndị nsọ

Onye nsọ Mataias, Onyeozi

Mmemme · Agba ofufe: uhie

Obubu ọnụ na nchegharị

Ụbọchị nchegharị

Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọrụ 1:15–17, 20–26

15Nʼoge ahụ, Pita bilitere nʼetiti ndị kwere ekwe ọnụọgụgụ ha dị ihe dị ka narị na iri abụọ, sị, 16“Ụmụnna m, ọ dị mkpa ka ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ mezuo banyere Judas onye duuru ndị jidere Jisọs bịa. Mmụọ Nsọ kwuru na nke a ga-eme mgbe o sitere nʼọnụ Devid kwuo okwu nʼoge gara aga. 17Ọ bụ otu nʼime anyị. O nwere oke nʼime ọrụ a.” 20Pita sịrị, “Nʼihi na e dere ya nʼakwụkwọ Abụ Ọma: “ ‘Ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ya,’ na, “ ‘Ka onye ọzọ nọchiekwa ọnọdụ ya ka onyeisi.’ 21Ya mere, otu onye nʼime ndị anyị na ha nọ nʼoge niile Onyenwe anyị Jisọs nọ nʼetiti anyị, 22bido nʼoge Jọn na-eme baptizim ruo nʼụbọchị Jisọs si nʼetiti anyị rigoro nʼeluigwe. Otu onye nʼime ndị a ga-eso anyị bụrụ onye akaebe nke mbilite nʼọnwụ ya.” 23Ya mere, ha họpụtara mmadụ abụọ, Josef onye a na-akpọ Basabas (aha ya ọzọ bụkwa Jọstus) na Mataias. 24Ha kpere ekpere sị, “Onyenwe anyị, ị maara obi mmadụ niile. Gosi anyị onye ị họpụtara nʼime mmadụ abụọ ndị a. 25Ka ọ bụrụ onyeozi na onyendu nke ga-anọchi anya Judas onye nke hapụrụ ma gawa ebe o kwesiri ka ọ gaa.” 26Ha fere ha nza. Nza ahụ makwara Mataias, ha gụnyere ya dị ka otu nʼime ndị ozi iri na otu ahụ.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 113:1–8

1Toonu Onyenwe anyị! Toonu Onyenwe anyị unu ndị ohu ya. Toonu aha Onyenwe anyị. 2Ka aha Onyenwe anyị bụrụ ihe a gọziri agọzi site ugbu a ruo mgbe ebighị ebi. 3Site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda ya, aha Onyenwe anyị ga-abụ ihe a na-eto eto. 4Onyenwe anyị dị elu karịa mba niile, ebube ya dị elu karịa eluigwe. 5Onye dị ka Onyenwe anyị Chineke anyị, onye nọkwasịrị ocheeze nʼebe dị elu, 6onye na-eme onwe ya ka ọ dị ala ilekwasị eluigwe na ụwa anya? 7Ọ na-esi nʼuzuzu bulie ogbenye elu sitekwa nʼebe ikpofu ahịhịa bulie onye nọ na mkpa elu; 8ọ na-eme ka ya na ụmụ eze ndị ikom nọkọọ, ọ na-eme ka o soro ndị a maara aha ha nʼetiti ụmụ mmadụ nọkọọ.

Oziọma

Jọn 15:9–17

9“Dị ka Nna sị hụ m nʼanya, otu a ka m sị hụkwa unu nʼanya. Ya mere, nọgidenụ nʼime ịhụnanya m. 10Unu ga-anọgide nʼịhụnanya m ma ọ bụrụ na unu edebe iwu m. Dị ka m debere iwu Nna m ma nọgidekwa nʼịhụnanya ya. 11Agwala m unu ihe ndị a ka ọṅụ m dịrị nʼime unu ka ọṅụ unu zukwaa oke. 12Nke a bụkwa iwu m, ka unu hụrịta onwe unu nʼanya dị ka m siri hụ unu nʼanya. 13Ọ dịghị onye ọbụla nwere ịhụnanya karịrị nke a na mmadụ tọgbọrọ ndụ ya nʼihi ndị enyi ya. 14Unu onwe unu bụkwa ndị enyi m ma ọ bụrụ na unu edebe ihe m nyere nʼiwu. 15Anaghị m akpọkwa unu ndị ohu ọzọ. Nʼihi na ohu adịghị amatazu ihe niile onyenwe ya na-eme. Ma ana m akpọ unu ndị enyi m nʼihi na agwala m unu ihe niile m nụrụ nʼọnụ Nna m. 16Ọ bụkwaghị unu onwe unu họọrọ m. Ọ bụ m họọrọ unu, wepụtakwa unu iche ka unu gaa mịa ọtụtụ mkpụrụ, mkpụrụ nke ga-adịgidekwa. Ya mere, Nna m ga-enye unu ihe ọbụla unu ga-arịọ nʼaha m. 17Ihe ndị a ka m na-enye unu nʼiwu, hụrịtanụ onwe unu nʼanya.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike