Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 11 Mee
Kalenda Ọtọdọks · 28 Eprel (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 11 Mee 2027
Tiuzdee · Izu nke 2 nke Ista · Olu 1
Mmemme na ndị nsọ
Ụbọchị Ọṅụ (Radonitsa): ncheta ndị nwụrụ anwụ
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
1Mgbe ha nọ na-agwa ndị mmadụ ahụ okwu, ndị nchụaja na onyeisi ndị agha na-eche ụlọnsọ ukwu ahụ na ndị Sadusii bịakwutere ha. 2Ha were oke iwe nʼihi na ha na-ezi ndị mmadụ ihe, na-ekwusakwa na nʼime Jisọs ka mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ dị. 3Ha jidere ha tinye ha nʼụlọ mkpọrọ, ruo nʼechi ya. Nʼihi na oge e jidere ha bụ nʼoge uhuruchi. 4Ma ọtụtụ ndị nụrụ okwu ahụ kwenyere. Ọnụọgụgụ ha ruru ihe dị ka puku mmadụ ise. 5Nʼechi ya, ndị na-achị achị, na ndị okenye na ndị ozizi iwu zukọrọ na Jerusalem. 6Onyeisi nchụaja bụ Anas nọ nʼebe ahụ, na Kaịfas na Jọn na Alegzanda, na ndị ọzọ bụ ndị ikwu onyeisi nchụaja. 7Mgbe ha kpọpụtara ha nʼetiti ha, ha jụrụ ha, “Ọ bụ site nʼike onye, na site nʼaha onye, ka unu ji mee ihe a?” 8Nʼoge ahụ, Pita jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ọ gwara ha, “Unu ndị na-achị ala anyị, na ndị okenye. 9Ọ bụrụ na unu kpọpụtara anyị ịchọpụta otu nwoke ngwụrọ a si bụrụ onye ahụ dị mma maọbụ otu e si gwọọ ya, 10ya mere maranụ nke a, unu na ndị Izrel niile, a gwọrọ nwoke a guzo nʼetiti unu site nʼaha Jisọs Kraịst onye Nazaret, onye unu kpọgidere nʼobe, ma Chineke kpọlitere ya site nʼọnwụ.
Oziọma
16Nʼihi na Chineke hụrụ ụwa nʼanya, nke a mere o jiri nye Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka onye ọbụla kweere na ya ghara ịla nʼiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi. 17Nʼihi na Chineke eziteghị Ọkpara ya nʼụwa ka o maa ụwa ikpe, kama ka e site nʼaka ya zọpụta ụwa. 18Ikpe amaghị onye ọbụla kwere na ya, ma onye ọbụla na-ekweghị aghọọlarị onye ikpe mara, nʼihi na o kweghị nʼaha Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya. 19Nke a bụ mkpebi ikpe ahụ; na Ìhè abịala nʼụwa, ma ụmụ mmadụ hụrụ ọchịchịrị nʼanya kama ìhè ahụ, nʼihi na ọrụ ha jọrọ njọ. 20Nʼihi na onye ọbụla na-eme ihe ọjọọ kpọrọ ìhè ahụ asị, ọ dịghị abịakwute ìhè ahụ, ka a ghara ime ka ọrụ ya pụta ìhè. 21Ma ndị na-ebi ndụ nʼeziokwu na-abịakwute ìhè ahụ, ka e nwee ike hụta ya nke ọma, na ihe niile ha na-eme sitere na ike Chineke.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 28 Epreel na kalenda nzukọ bụ 11 Mee na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike